ISI NKE 12
Otú E Si Akwado Ọrụ Gbasara Alaeze Chineke ná Mba Anyị na n’Ụwa Niile
NDỊÀMÀ JEHOVA ekwusaala ozi ọma ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa,’ otú ahụ Jizọs kwuru na a ga-eme n’oge ikpeazụ. (Ọrụ 1:8; Mat. 24:14) Otú ha si eme ya bụ na ha na-ewepụta oge ha, jirikwa ike ha na-akụziri ndị mmadụ banyere Jehova n’anaghị ha ego. Ha bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha, ebe ọ bụ na ha na ya na-arụkọ ọrụ. (Mat. 6:25-34; 1 Kọr. 3:5-9) Otú ozi ha si na-aga nke ọma gosiri na Jehova na-akwado ya, na-agọzikwa mbọ ha na-agba.
OTÚ E SI ENWETA EGO E JI ARỤ ỌRỤ GBASARA ALAEZE CHINEKE N’ỤWA NIILE
2 Ọ na-abụ ụfọdụ chọpụta na anyị anaghị ana ndị anyị ziri ozi ọma ego ma ọ bụ sị ha kwụọ ụgwọ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị nyere ha, ha ana-ajụ, sị: “Olee otú unu si enweta ego unu ji arụ ọrụ unu?” Nke bụ́ eziokwu bụ na ibipụta Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na-efu anyị ego. Ọ na-efukwa anyị ego ịrụ Betel na ịna-elekọta ya maka ndị nọ na ya na-eje ozi, ya bụ, ndị na-ebi akwụkwọ anyị, ndị na-elekọta ozi ọma anyị na-ekwusa, na ndị na-arụ ọrụ ndị ọzọ na-eme ka ikwusa ozi ọma na-aga aga. Ihe ọzọkwa bụ na a na-enye ndị nlekọta sekit, ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, na ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile pụrụ iche ego mmachi akpa iji nyere ha aka ịna-arụ ọrụ ha. O doro anya na ikwusa ozi ọma n’oge a ma ná mba anyị ma n’ụwa niile na-efu anyị nnukwu ego. Olee otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ a niile?
3 Ọtụtụ ndị obi dị ụtọ maka ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ezi n’ụwa niile na-enye onyinye iji kwado ya. Ma, ọ bụ Ndịàmà Jehova kacha enye onyinye ha ji na-arụ ọrụ ha. Ụfọdụ n’ime ha na-ezigara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ha onyinye si ha n’obi. Ihe a ha na-eme yiri ihe ndị ohu Chineke mere n’oge ochie. Ha ji obi ha nye onyinye e ji rụọ ebe a na-anọ efe Jehova. (Ọpụ. 35:20-29; 1 Ihe 29:9) Onyinye ụfọdụ anyị na-enweta bụ ala na ụlọ ndị nwe ha dere n’akwụkwọ ha ji kee ékpé ka e nye anyị ma ha nwụọ. Onyinye ndị ọzọ na-esi n’aka ụmụnna, ọgbakọ, na sekit abịa. Ha anaghịkwa ebucha ibu. Ọ na-abụ e wekọtachaa onyinye ndị a, e nweta ego e ji eme ka ozi anyị na-aga aga.
Ndịàmà Jehova weere ya na ọ bụụrụ ha ihe ùgwù iji ego ha na ihe ndị ha nwere na-ekwusa ozi ọma
4 Ndịàmà Jehova weere ya na ọ bụụrụ ha ihe ùgwù iji ego ha na ihe ndị ha nwere na-ekwusa ozi ọma. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere igbe ego ha na-esi na ya ewere ego ha na-emefu. (Jọn 13:29) Baịbụl kwukwara gbasara ụmụ nwaanyị ndị jeere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ozi. (Mak 15:40, 41; Luk 8:3) Pọl onyeozi naara ndị chọrọ ka ozi ọma na-aga n’ihu onyinye ha nyere ya. Ndị a chọkwara iso ya na-eje ozi ya. O kelekwara ha maka ihe ha nyere ya. (Fil. 4:14-16; 1 Tesa. 2:9) Ndịàmà Jehova na-eme ụdị ihe a ndị oge ochie mere. Ha na-eji obi ha niile ekwusasi ozi ọma ike, na-enyekwa onyinye e ji akwado ozi ọma ha na-ekwusa. Ọ bụ ya mere e ji nwee ike ịna-enye ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke “mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpu. 22:17.
OTÚ E SI EGBO MKPA NDỊ E NWERE N’ỌGBAKỌ
5 Ọ bụ ego ụmụnna nọ n’ọgbakọ nyere n’onyinye ka a na-eji egbo mkpa ndị e nwere n’ọgbakọ. A naghị ana ụtụ n’ọgbakọ ma ọ bụ gwa mmadụ ego ole o kwesịrị inye. A naghịkwa arịọ ndị bịara ọmụmụ ihe arịrịọ ego. Kama, a na-edebe igbe onyinye n’ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe ka onye ọ bụla nwee ike inye “dị ka o kpebiri n’obi ya.”—2 Kọr. 9:7.
6 Ihe mbụ ọgbakọ na-eji ego ha nwetara n’onyinye eme bụ ịkwụ ụgwọ ihe ndị a na-emefu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị okenye ọgbakọ nwekwara ike chọọ isi na ya zigara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ha onyinye ka e were ya na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Ma, ọ bụ ọgbakọ ga-akwado ka e mee otú ahụ. Ọtụtụ ọgbakọ na-esi otú a enye onyinye mgbe niile maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụ na ụmụnna ana-enye onyinye maka mkpa ndị e nwere n’ọgbakọ, ọ gaghị adị mkpa ka a na-ama ọkwa ka e nye onyinye.
OTÚ E SI AHỤ MAKA EGO NDỊ E NYERE N’ONYINYE
7 A gbasaa ọmụmụ ihe, ụmụnna abụọ ga-ewepụta ego dị n’igbe onyinye ọ bụla ma detuo ya. (2 Eze 12:9, 10; 2 Kọr. 8:20) Ndị okenye ga-ahụ na e jiziri ego ahụ ejizi ruo mgbe e zigaara ya alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ jiri ya gboo mkpa ọgbakọ. N’ọnwa ọ bụla, nwanna na-ahụ maka ihe ndekọ ego ọgbakọ ga-edejupụta akwụkwọ e ji edekọ ego. O dejupụtachaa ya, a gụọrọ ya ọgbakọ. Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ na-eme ndokwa ka e nyochaa ihe ndekọ ego ọgbakọ kwa ọnwa atọ.
EGO SEKIT NA-EMEFU
8 Ọ bụ Ndịàmà Jehova nọ na sekit nke ọ bụla na-enye onyinye a na-eji akwụ ụgwọ ihe ndị e mefuru ná mgbakọ sekit ha nakwa ụgwọ maka ihe ndị ọzọ sekit mefuru. A na-edowe igbe onyinye ná mgbakọ ndị ahụ ka ndị mmadụ nwee ike ịga ebe ahụ tinye ego ole si ha n’obi ha chọrọ inye sekit ahụ. Ihe ọzọ bụ na ka e nwee ike ịkwụ ụgwọ ihe ndị sekit na-emefu mgbe niile, ọgbakọ ndị dị na sekit nwere ike inye onyinye n’oge ndị ọzọ.
9 Sekit ọ bụla kwesịrị inwe ego ga-ezuru ya ịkwụ ụgwọ ihe ndị o mefuru ma jiri nke fọrọ afọ nye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụ na ego sekit nwere agaghị ezu ịkwụ ụgwọ ihe ndị ha mefuru ná mgbakọ ma ọ bụ kwụnye ụgwọ maka ebe ha chọtara ha ga-anọ nwee mgbakọ ọzọ, onye nlekọta sekit nwere ike ịgwa ọgbakọ niile nọ na sekit ahụ ka ha nye onyinye. Ndị okenye ọgbakọ ọ bụla ga-ekpebi ego ole ọgbakọ ha ga-enyeli iji nweta ego ahụ. Ha kpebichaa, ha agwa ya ọgbakọ ka ha kwado ya.
10 E nwee okwu ego a chọrọ ka ndị okenye nọ na sekit leba anya, ndị okenye niile nọ na sekit ahụ ga-enwe nzukọ n’ụbọchị ha bịara mgbakọ sekit. E wezụga ego ụfọdụ sekit na-emefukarị, ọ bụ ndị okenye nọ na sekit ga-ekpebi ego ọ bụla ọzọ a ga-esi n’akpa sekit mefuo. Mgbe ọ bụla a chọrọ imefu ego sekit, a ga-edepụta ihe ndị a chọrọ iji ego ahụ eme na ego ole ha ga-efu. A ga-agwa ndị okenye nọ na sekit ka ha kwado ka e mefuo ya.
11 A na-ahazi ka e nyochaa ihe ndekọ ego sekit si n’oge ruo n’oge.
OTÚ A GA-ESI NA-ELEKỌTA NDỊ OGBENYE
12 Otu n’ime ihe ndị mere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ji nwee igbe ego bụ ka ha na-esi na ya enyere ndị ogbenye aka. (Mak 14:3-5; Jọn 13:29) Ndị Kraịst ka na-enyere ndị ogbenye aka n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “Unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile.” (Mak 14:7) Oleekwanụ otú Ndịàmà Jehova si enyere ndị ogbenye aka taa?
13 Mgbe ụfọdụ, ụmụnna anyị nwere ike ịnọ ná mkpa n’ihi nká, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu ọzọ. Ihe ndị a nwere ike ime ka ha chọọ enyemaka. Ndị ezinụlọ ha, ndị ikwu ha, na ndị maara gbasara ya nwere ike chọọ inyere ha aka. Nke a dabara n’ihe Jọn onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ, olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya? Ụmụntakịrị, ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.” (1 Jọn 3:17, 18; 2 Tesa. 3:6-12) Otu ụzọ anyị si efe Chineke otú ọ chọrọ bụ inyere ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa aka.—Jems 1:27; 2:14-17.
14 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara Timoti, o kwuru otú e nwere ike isi nyere ụmụnna ndị e kwesịrị inyere aka aka. I nwere ike ịgụ ihe o kwuru na 1 Timoti 5:3-21. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị ya. N’ihi ya, ndị kwesịrị ịna-elekọta ụmụnna anyị ndị merela agadi bụ ụmụ ha, ụmụ ụmụ ha, ma ọ bụkwanụ ndị ikwu ha. Mgbe ụfọdụ, gọọmenti ma ọ bụ ndị na-arụ ọrụ maka ọdịmma ọhaneze na-enye ndị nọ ná mkpa ihe ụfọdụ iji nyere ha aka. N’ihi ya, ndị ikwu ụmụnna ndị nọ ná mkpa ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike inyere ha aka tinye akwụkwọ ka a na-enye ha ihe ndị ahụ. Ma, e nwere mgbe ọgbakọ kwesịrị inyere ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa aka, bụ́ ndị jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ na ha enweghị ndị ezinụlọ ma ọ bụ ndị ikwu ga-enyere ha aka, ya abụrụkwa na e nweghị ezigbo aka gọọmenti na-enyere ha, ndị okenye ọgbakọ nwere ike ịhazi otú e nwere ike isi nyere ha aka. Ndị Kraịst weere ya na ọ bụụrụ ha ihe ùgwù iji ihe ndị ha nwere nyere ụmụnna ha nọ ná mkpa aka.
15 E nwere ihe ndị nwere ike ime ka ọtụtụ ụmụnna anyị nọrọ ná mkpa n’oge ikpeazụ a dị oké egwu. Ihe ndị ahụ bụ mkpagbu, agha, ala ọma jijiji, idei mmiri, ụnwụ, ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ a na-enwekarị n’oge a. (Mat. 24:7-9) O nwere ike ọgbakọ ndị dị ná mba e nwere nsogbu ndị a agaghị enyeliri ibe ha aka. N’ihi ya, Òtù Na-achị Isi na-agwa ụmụnna ndị nọ ná mba ndị ọzọ ka ha tụkọta ihe bugara ụmụnna ndị ahụ nọ ná mkpa. Ụdị ihe a ka Ndị Kraịst nọ n’Eshia Maịnọ mere. Ha tụkọtara nri bugara ụmụnna ha ndị nọ na Judia n’oge e nwere ụkọ nri. (1 Kọr. 16:1-4; 2 Kọr. 9:1-5) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe a ụmụnna ndị ahụ mere, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, gosikwa na anyị bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.—Jọn 13:35.
INYEFE NDỊ MMADỤ AKWỤKWỌ ANYỊ
16 Baịbụl na akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl na-enyere anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ na-abụkarị otu ohu na-eje ozi ka ndị okenye na-ekenye ka ọ na-elekọta akwụkwọ anyị dị iche iche. Ụmụnna e kenyere ọrụ ndị a anaghị eji ọrụ ha egwu egwu. Ha na-edekọ otú akwụkwọ si abata na otú o si apụ ka ọgbakọ nwee ike inwe akwụkwọ ga-ezuru ha.
17 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst nyeferela Jehova onwe anyị, anyị ma na oge anyị, amamihe anyị, ike anyị, ihe onwunwe anyị, nakwa ndụ anyị bụcha onyinye Chineke nyere anyị. Ọ chọkwara ka anyị jiri ha na-ejere ya ozi. (Luk 17:10; 1 Kọr. 4:7) Ọ bụrụ na anyị na-eji ihe niile anyị nwere ejere Jehova ozi, anyị na-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Anyị chọrọ iji ihe ndị anyị nwere sọpụrụ Jehova maka na anyị ma na onyinye ọ bụla anyị nyere ya iji gosi na anyị ji obi anyị niile na-efe ya, na-atọ ya ụtọ. (Ilu 3:9; Mak 14:3-9; Luk 21:1-4; Kọl. 3:23, 24) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Mat. 10:8) Ọ bụrụ na anyị ana-ewepụta onwe anyị na ihe ndị anyị nwere na-ejere Jehova ozi, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.