Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inye Ndị Mmadụ Akwụkwọ Bible Na-akụzi
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Akwụkwọ Bible Na-akụzi bụ akwụkwọ anyị kacha eji akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ma, tupu anyị ejiri ya mụwara mmadụ ihe, anyị kwesịrị inye ya onye ahụ. N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ịgba mbọ mụta otú anyị ga-esi na-enye ya ndị mmadụ n’ozi ọma. (Ilu 22:29) E nwere ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi na-enye ya ndị mmadụ. Onye ọ bụla ga-ahọrọkwa nke ga-adịrị ya mfe.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Unu nwewe ofufe ezinụlọ, meenụ ihe ngosi otú unu nwere ike isi nye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi n’ozi ọma.
Ị nọrọ ozi ọma, gwa onye gị na ya so otú ị chọrọ isi nye ya ndị mmadụ. (Ilu 27:17) Ọ bụrụ na otú ị chọrọ isi nye ya mmadụ adịchaghị mma, gbaa mbọ gbanwee ya.