Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 9
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 9
Abụ nke 48 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 2 ¶1-12 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 21-25 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ihe E Mere 23:1-11 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ichebara Ihe E Kwuru ná Ndị Rom 8:32 Echiche Si Emesi Anyị Obi Ike na Chineke Ga-emezu Nkwa Ya Niile? (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Ga-eme Mgbe A Ga-akpọlite Ndị Mmadụ n’Ọnwụ?—wp13 10/1 p. 16 para. 3-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.”—1 Kọr. 3:6.
Nkeji 10: “Akụrụ M Mkpụrụ, Apọlọs Gbara Ya Mmiri, ma Ọ Bụ Chineke Na-eme Ka O Too.” Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. (1 Kọr. 3:6) Ọ bụrụ na oge ka dị, kwuo ihe ụfọdụ dị n’Ụlọ Nche Mach 1, 1993, peeji nke 20-23. Ná nkenke, gosi otú ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inye Ndị Mmadụ Akwụkwọ Bible Na-akụzi.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi abụọ n’ihe omume a. Nke mbụ ga-abụ otú a ga-esi jiri aro a tụrụ n’isiokwu a nye mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Onye ga-eme nke abụọ ga-egosi otú ọzọ dị mma ọ na-esi enye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi.
Abụ nke 111 na Ekpere