Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 31
IZU NA-AMALITE NA MEE 31
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:2 Samuel 16-18
Nke 1: 2 Samuel 17:1-13
Nke 2: Ihe Mere E Ji Kpọọ Jizọs “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike” (Mat. 12:8)
Nke 3: Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndị Mmụọ Ozi Nupụrụ Isi (td 10CH)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: “Ò Nweela Onye I Duziiri Ọmụmụ Baịbụl n’Oge Mbụ Ị Gara na nke Ya?” Okwu. Ị kọwachaa aro a tụrụ n’isiokwu a, gwa otu onye nkwusa ka o jiri aro ahụ a tụrụ mee ihe ngosi.
Nkeji 20: “Otú E Si Akụziri Ndị Ọhụrụ Izi Ozi Ọma.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 5, mee ihe ngosi ebe onye nkwusa ọhụrụ na okenye so na-aga ozi ọma. Onye nkwusa ọhụrụ ezie onye nwe ụlọ ozi ọma ma ọ gụrụghị ya Baịbụl. Mgbe ha pụtara, okenye ahụ ejiri akọ na obiọma tụọrọ onye nkwusa ọhụrụ ahụ aro, gbaa ya ume ka ọ gbalịa na-agụrụ ndị nwe ụlọ Baịbụl ma o ziwe ozi ọma.