Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inyere Ndị Malitere Ikwusa Ozi Ọma Ọhụrụ Aka
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Ndị malitere iso ụzọ Jizọs ọhụrụ kwesịrị idebe “ihe niile” o nyere n’iwu. Otu n’ime ụzọ ha ga-esi eme ya bụ izi ndị ọzọ ozi ọma. (Mat. 28:19, 20) Ọtụtụ n’ime ndị ọhụrụ a edenyela aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, o nwekwara ike ịbụ na ha na-akọrọ ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị enyi ha ihe ha na-amụta na Baịbụl. Ma, ka ihe ha na-amụta na Baịbụl na-emekwu ha obi ụtọ, ha aghọtakwa na Jehova chọrọ ka mmadụ niile nụ ozi ọma, ha nwere ike ikwu na ha ga-achọ ịmalite iso ọgbakọ na-aga ozi ọma. (Rom 10:13, 14) Ọ bụrụ na ha aghọọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, e kwesịrị inye ha ọzụzụ ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma.—Luk 6:40.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Ị gawa ozi ụlọ n’ụlọ, gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl soro gaa. Gị na ya sorokwa ma ị gawa nletaghachi ma ọ bụ ịmụrụ mmadụ ihe. I nwekwara ike ịgwa onye nkwusa ọhụrụ ọzọ na-abụghị onye ị na-amụrụ ihe ka gị na ya rụọ n’ozi ọma.