Akụkụ nke 10: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Inye Ndị A Na-amụrụ Ihe Ọzụzụ n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ
1 Mgbe ndị okenye kpebiri na onye a na-eduziri ọmụmụ Bible eruwo ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ pụrụ ịmalite iso ọgbakọ jewe ozi ọma. (Lee Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, p. 79-81.) Olee otú anyị pụrụ isi nyere onye a na-amụrụ ihe aka imeri ihe ịma aka nke ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?
2 Ịkwadokọ Ya Ọnụ: Ọ dịghị ihe a pụrụ iji dochie anya ime ezi nkwadebe. Gosi onye ị na-amụrụ ihe ebe ọ ga-ahụ aro ndị a tụrụ banyere ụzọ e si ezi ozi ọma n’Ozi Alaeze Anyị, n’akwụkwọ Reasoning, nakwa n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, ma nyere ya aka ịhọrọ aro nke dị mfe ma daba adaba n’ókèala unu. Si ná mmalite gbawa ya ume ịdị na-eji Bible eme ihe n’ozi.—2 Tim. 4:2.
3 Ọ na-abara onye nkwusa ọhụrụ uru nke ukwuu ịmụgharị ụzọ ọ ga-esi ezi ozi ọma ugboro ugboro. Ka ọ na-amụgharị ya, gosi ya otú ọ ga-esi jiri nkà zaa ajụjụ ma ọ bụ okwu mgbochi ndị a na-anụkarị n’ókèala unu. (Kọl. 4:6) Mesie ya obi ike na ọ bụghị iwu na Onye Kraịst na-ezisa ozi ọma ga-amarịrị azịza nke ajụjụ nile onye nwe ụlọ pụrụ ịjụ ya. Mgbe mgbe, ọ na-aka mma ịgwa onye jụrụ ajụjụ ka ị gaa mee nnyocha banyere ajụjụ ya ma bịaghachi n’oge ọzọ iji zaa ya.—Ilu 15:28.
4 Ịrụkọ Ọrụ Nkwusa Ọnụ: Na nke mbụ onye ị na-amụrụ ihe so gaa ozi ụlọ n’ụlọ, kwe ka ọ hụ otú i si jiri ụzọ ahụ unu abụọ mụgharịworo zie ozi ọma. Mgbe ahụ, nye ya ohere ka o tinye ọnụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịkasị mma ikwe ka ihe onye nkwusa ọhụrụ ahụ ga-eme bụrụ nanị ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ya. Buru n’uche ụdị mmadụ onye ahụ ị na-amụrụ ihe bụ na ebe ike ya ruru. (Fil. 4:5) Na-aja ya nnọọ mma ka i ji nwayọọ nwayọọ na-enye ya ọzụzụ n’ụzọ dịgasị iche iche e si arụ ọrụ nkwusa.
5 Ọ dị mkpa inyere onye nkwusa ọhụrụ aka inwe usoro ọ ga na-agbaso iji na-agachi ozi anya, nke ga-eme ka ọ na-aga ya kwa izu, ma o kwe mee. (Fil. 3:16) Mee ndokwa doro anya ka gị na ya na-arụkọ ọrụ nkwusa ọnụ, gbaakwa ya ume iso ndị ọzọ na-anụ ọkụ n’obi na-arụkọ ya ọnụ. Ihe nlereanya ha na mkparịta ụka ọ ga-eso ha nwee ga-enyere ya aka ịzụlite nkà ma na-enwe ọṅụ n’ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.