Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/05 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite June 13
  • Izu Na-amalite June 20
  • Izu Na-amalite June 27
  • Izu Na-amalite July 4
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 6/05 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite June 13

Abụ nke 198

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa June. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke June 15 na Teta! nke July 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke July 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe a na-enyefe magazin n’oge a na-anọghị n’ozi.

15 min: Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọ Ndị Nkwusa A Na-emebeghị Baptizim. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, bụ́ nke onye okenye ga-ekwu, nke ga-adabere ná Ndị A Haziri Ime Uche Jehova (Bekee), peeji nke 79-81. Tụlee ndokwa e mere iji chọpụta ma onye a na-eduziri ọmụmụ Bible ò ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ ya n’aka iji soro ọgbakọ na-eje ozi ubi. N’izu ọzọ, anyị ga-atụle otú anyị pụrụ isi nye ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible, bụ́ ndị rurula eru ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọzụzụ ịmalite iso na-eje ozi ụlọ n’ụlọ.

20 min: “Ime Nkwusa Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi.”a Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 149 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 20

Abụ nke 206

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị sitere n’Ozi Alaeze Anyị nke July 2003, peeji nke 8. Kọwaa otú ndị nkwusa pụrụ isi nweta akwụkwọ n’asụsụ na-abụghị nke ọgbakọ ha ji eme ihe. Kwuo otú ihe ọmụma a si metụta ókèala ọgbakọ unu. E kwesịrị isi n’aka ohu na-ahụ maka akwụkwọ tụọ ọda akwụkwọ ọ bụla e dere n’asụsụ na-abụghị nke ọgbakọ unu ji eme ihe, ọ sọ ya ya bụrụ nanị otu akwụkwọ, ka e wee nwee ike inweta ha n’egbughị oge.

15 min: Okwu Chineke Na-akpa Ike. (Hib. 4:12) Okwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke November 15, 2003, peeji nke 11, paragraf nke 13-17. Kọọ ahụmahụ ndị na-egosi otú ozizi Bible pụrụ isi kpalie ndị mmadụ ịgbanwe ụzọ ndụ ha. (w00-IB 1/1 p. 3-5) Gbaa mmadụ nile ume ịdị na-eji Bible eme ihe nke ọma n’akụkụ nile nke ozi anyị.

20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 10.”b Gụnye ihe ngosi nke ebe a na-amụgharị ụzọ e si ezi ozi ọma. Ka onye a na-amụrụ ihe na-amụgharị otú ọ ga-esi zie ozi ọma, onye na-amụrụ ya ihe, bụ́ onye ga-eme ka à ga-asị na ọ bụ onye nwe ụlọ, ekwuo otu okwu mgbochi a na-ekwukarị n’ókèala unu. Mgbe onye ahụ a na-amụrụ ihe na-amaghị otú ọ ga-esi azaghachi, onye ahụ na-amụrụ ya ihe akọwaara ya otú ọ pụrụ isi zaghachi. Tụkwasị na nke ahụ, mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kọọ banyere ọzụzụ ha nwetara mgbe ha malitere ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.

Abụ nke 208 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 27

Abụ nke 113

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa June. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke July 1 na Teta! nke July 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke July 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi ahụ, kwughachi okwu mmeghe e kwuru iji kpalie mmasị onye nwe ụlọ.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

25 min: Inyefe Broshuọ n’Ọnwa July na August. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’ihe ntinye. Kọwaa, n’ụzọ dị nkenke, otú a ga-esi jiri ihe ntinye ahụ mee ihe, na-eme ka ihe ndị e dere n’igbe dị na peeji nke 3 na isi ihe ndị sitere n’Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, peeji nke 8, pụta ìhè. Kwurịtanụ aro ndị dabara adaba n’ókèala unu nke ụzọ isi na-enyefe broshuọ n’oge mbụ e zutere mmadụ. (Ị ga-ahụ ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi nyefee broshuọ bụ́ Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’Ozi Alaeze Anyị nke October 2003, peeji nke 8.) Mee ka e jiri aro abụọ ma ọ bụ atọ a tụrụ banyere ụzọ isi na-enyefe ya mee ihe ngosi. Jiri onye nkwusa na-eto eto mee, ọ dịkarịa ala, otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ.

Abụ nke 196 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 4

Abụ nke 70

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Ì Nwere Usoro Ihe Omume Ezinụlọ? Tụlee aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 2005, ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo mgbalị ha meworo iji tinye aro ndị ahụ n’ọrụ nakwa uru ndị ha riteworo site n’ime nke ahụ.

20 min: “Ịgba Àmà nke Ọma n’Ebe Ọhaneze Na-anọkarị.”c Mee ka o kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala unu. Chetara ndị nkwusa ka ha na-eji fọm bụ́ Please Follow Up (S-43) na-eme ihe n’ebe o kwesịrị ekwesị.

Abụ nke 120 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya