Akụkụ nke 11: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Inyere Ndị A Na-amụrụ Ihe Aka Ime Nletaghachi
1 Mgbe onye a na-eduziri ọmụmụ Bible malitere iso na-ekwusa ozi ọma, ọ ga-ahụ ndị nwere mmasị n’ozi ọma ahụ. Olee otú anyị pụrụ isi nyere onye nkwusa ọhụrụ a aka ime nletaghachi n’ụzọ dị mma na iwulite mmasị ahụ e gosiri?
2 Nkwadebe maka nletaghachi na-amalite n’oge mbụ e ziri mmadụ ozi ọma. Gbaa onye ahụ ị na-amụrụ ihe ume inwe ezi mmasị n’ebe ndị ọ na-ezi ozi ọma nọ. (Fil. 2:4) Jiri nke nta nke nta nye ya ọzụzụ banyere otú ọ ga-esi na-ajụpụta ha ihe dị ha n’obi, na-ege ha ntị mgbe ha na-aza ajụjụ, ma na-arịba ihe ndị na-enye ha nsogbu n’obi ama. Mgbe mmadụ gosiri mmasị, gwa onye nkwusa ọhụrụ a ka o detuo ihe ndị dị mkpa ọ chọpụtara banyere mkparịta ụka ahụ. Gbakwasị ụkwụ na ya nyere ya aka ime ndokwa ịgaghachi iji kparịtakwuo.
3 Ime Nkwadebe Ịgaghachi: Tụleghachi ihe ndị mere n’oge mbụ unu gara na nke onye nwe ụlọ, ma gosi onye ahụ ị na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi ahọrọ akụkụ ụfọdụ nke ozi Alaeze ahụ bụ́ nke ga-amasị onye nwe ụlọ. (1 Kọr. 9:19-23) Unu abụọ gbakọọ aka kwadebe okwu dị nkenke nke ga-agụnye otu akụkụ Bible a ga-agụ nakwa otu paragraf nke ga-esi n’otu akwụkwọ e ji amụ ihe. Tụkwasị na nke ahụ, kwadebenụ ajụjụ unu pụrụ ịjụ ma unu na onye nwe ụlọ kparịtasịa, bụ́ nke unu ga-ehiwe isi na ya wee mee ndokwa ịgaghachi na nke ya. Nye onye nkwusa ọhụrụ ahụ ọzụzụ otú ọ ga-esi na- enyere onye nwee ụlọ aka ịmụtakwu ihe n’Okwu Chinekee, n’oge ọ bụla ọ gaghachiri.
4 Ọ dịkwa mma ịkụziri onye ahụ a na-amụrụ ihe okwu mmeghe dị mfe. Mgbe o kelesịrị onye nwe ụlọ, ọ pụrụ ikwu, sị: “Mkparịta ụka mbụ anyị tọrọ m ụtọ, abịaghachikwala m ka m kọọrọ gị ihe ndị ọzọ sitere na Bible bụ́ nke ga-adabere [kwuo isiokwu gị].” Ọ pụkwara ịdị mkpa ka i gosi ya otú ọ ga-esi azaghachi ma ọ bụrụ na onye ọ hụrụ mgbe ọ gaghachiri abụghị onye ahụ o kwusaara ozi ọma.
5 Na-agaghachi Ozugbo: Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ịgaghachi ozugbo na nke ndị nile gosiri mmasị. Iji chọta ndị mmadụ n’ụlọ, ọ pụrụ ịdị mkpa na ọ ghaghị ịgaghachi na nke ha ugboro ugboro. Kụziere onye ahụ ị na-amụrụ ihe otú e si eyi àgbà maka nletaghachi, nyekwara ya aka ịghọta mkpa ọ dị ịgaghachi dị ka o kwere ná nkwa. (Mat. 5:37) Kụziere onye nkwusa ọhụrụ ahụ ịdị obiọma, ichebara ndị ọzọ echiche, na ịkwanyere ha ùgwù ka ọ na-achọ ndị yiri atụrụ ma na-ewulite mmasị ha.—Taịtọs 3:2.