Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/05 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite July 11
  • Izu Na-amalite July 18
  • Izu Na-amalite July 25
  • Izu Na-amalite August 1
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 7/05 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite July 11

Abụ nke 49

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa July. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke July 15 na Teta! nke August 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke August 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche e si azaghachi okwu na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Eji m ọrụ n’aka.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11-12.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Iji Ozi Ọma ahụ Gakwuru Ọtụtụ Mmadụ Dị Ka O Kwere Mee.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, tụleghachi aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2005, peeji nke 8, bụ́ ndị metụtara ókèala ọgbakọ unu.

Abụ nke 88 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 18

Abụ nke 173

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’ụzọ dị nkenke, tụlee Ụlọ Nche nke August 15, 2000, peeji nke 32. Mee ka uru ndị dị n’ịgụchi Bible anya kwa ụbọchị pụta ìhè, ọbụna n’oge anyị gara ezumike nakwa n’oge ndị ọzọ anyị kwụsịrị ime ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị.

15 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 11.”b Gụnye ihe ngosi nke ebe onye na-amụrụ mmadụ ihe na onye nkwusa ọhụrụ ọ na-amụrụ ihe na-akwadebe maka nletaghachi. Ha atụlee ihe ha jetara n’oge mbụ ha ziri mmadụ ozi ọma ma họrọ isi ihe kwesịrị ekwesị ha ga-ekwu maka ya ma ha gaa nletaghachi na nke ya. Ha akwadebekwa okwu mmeghe dị mfe na ajụjụ ha ga-ajụ mgbe nletaghachi ahụ bịawara ná njedebe. Ihe ngosi ahụ abịa ná njedebe ka ha na-achọ ịmụgharị ihe ndị ahụ ha kwadebere.

20 min: Nyere Ndị Ọzọ Aka Iji Bible Kpọrọ Ihe. Ntụle ajụjụ na azịza bụ́ nke ga-adabere n’akwụkwọ Fee Chineke Ofufe, peeji nke 23-25, paragraf nke 3-6. Jiri ajụjụ ndị e depụtara n’akwụkwọ ahụ mee ihe. Gụnye ihe ụfọdụ sitere na broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, peeji nke 32.

Abụ nke 10 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 25

Abụ nke 138

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 1 na Teta! nke August 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke August 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe a na-enyefe magazin n’oge a na-anọghị n’ozi n’ọmà ahịa ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ kwesịrị ekwesị ọhaneze na-anọkarị.

10 min: Kụnye Eziokwu ahụ n’Obi Nwa Gị. (Deut. 6:7) Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke August 15, 2002, peeji nke 30-31. Kọwaa ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-enye nduzi banyere ụzọ nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst nke di ya ma ọ bụ nwunye ya na-abụghị Onyeàmà pụrụ isi zụlite ụmụ ya.

20 min: “Ụgwọ Anyị Ji Ndị Ọzọ.”c Gụnye ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke July 1, 2000, peeji nke 11, paragraf nke 13.

Abụ nke 82 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 1

Abụ nke 187

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa July. Gwa ndị na-ege ntị ka ha sapeta peeji nke 70 nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. N’ụzọ mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, tụleenụ paragraf nke 1-2 na igbe bụ́ “Ụzọ Isi Na-aza Ajụjụ ná Nzukọ.”

15 min: “Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Ọganihu n’Ozi Ahụ.” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gụnye ihe ngosi nke ebe nne ma ọ bụ nna na nwa ya ji ụzọ dị mfe na-ezi ozi ọma. Mee ka nne ma ọ bụ nna ahụ mechie site n’ịkọwa ndokwa maka onyinye afọ ofufo n’ụzọ dị nkenke.

15 min: Ị̀ Nwalewo Ụzọ Dị Mfe E Si Ezi Ozi Ọma? Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, bụ́ nke ga-adabere n’Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, peeji nke 5. Tụleghachi aro ndị a tụrụ na ya, ma gosi otú a pụrụ isi jiri ụzọ ndị a dị mfe mee ihe mgbe a na-enyefe akwụkwọ e ji aga ozi n’ọnwa August. Mee ka e jiri otu ma ọbụ abụọ n’ime ụzọ ndị ahụ a tụrụ aro ha mee ihe ngosi.

Abụ nke 218 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya