Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/05 p. 3-6
  • Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Mbụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Abụọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Kwadebe nke Ọma Tupu Ị Gawa Ịmụrụ Mmadụ Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 11/05 p. 3-6

Chekwaa Ya

Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu

N’ihe ntinye a, a chịkọtara isi ihe ndị sitere n’usoro isiokwu bụ́ Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu, bụ́ ndị e bipụtarala n’Ozi Alaeze Anyị. A na-agba mmadụ nile ume ichekwa ihe ntinye a na ịtụle ya mgbe ọ bụla a chọrọ iduzi ọmụmụ Bible. Ọzọkwa, a pụrụ ime ka isi ihe ụfọdụ dị n’ihe ntinye a pụta ìhè mgbe a na-eduzi nzukọ maka ozi ubi. Ndị nlekọta ije ozi pụkwara isi na ya nweta ihe ha ga-ekwu mgbe ha na-eleta ìgwè ọmụmụ akwụkwọ dị iche iche.

Akụkụ nke 1: Gịnị Bụ Ọmụmụ Bible?

Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-eji Bible ma ọ bụkwanụ Bible na otu n’ime akwụkwọ ndị a tụrụ aro ha na-amụchi Bible anya n’ụzọ dị n’usoro, a sịgodị na ọ bụ ná mkpirikpi oge, ọ bụ ọmụmụ Bible ka ị na-eduzi. A pụrụ ịgụrụ ọmụmụ ihe ahụ mgbe e duziworo ya ugboro abụọ malite na nke mbụ e ji gosi otú e si amụ ihe, nakwa ma ọ bụrụ na o yie ka ọmụmụ ihe ahụ ọ̀ ga-aga n’ihu.—km-IB 7/04 p. 1.

Akwụkwọ Ndị A Tụrụ Aro Iji Na-eduzi Ọmụmụ Bible

◼ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?

◼ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi

◼ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe

◼ A pụrụ iji Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! duziere ndị na-agụchaghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-amachaghị ka e si agụ ihe, ọmụmụ Bible.

Akụkụ nke 2: Ịkwadebe Maka  Iduzi Ọmụmụ Ihe

Ọ dị mkpa ka anyị duziere onye anyị na-amụrụ ihe ọmụmụ Bible n’ụzọ ga-eru ya n’obi. Nke a na-apụta na anyị ga-eburu onye ahụ n’uche mee nkwadebe.—km-IB 8/04 p. 1.

Ụzọ Isi Kwadebe

◼ Tụlee isiokwu nke ihe ọmụmụ ahụ, isiokwu nta ndị dị na ya, na ihe osise ọ bụla e nwere na ya.

◼ Chọpụta azịza nke ajụjụ ndị e depụtara, na-aka ihe nanị n’okpuru okwu na nkebi ahịrịokwu ndị bụ́ isi.

◼ Kpebie ndị nke a ga-agụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’ihe ọmụmụ ahụ. Na-edetu ihe n’ụzọ dị nkenke n’ohere dị n’akụkụ peeji akwụkwọ ahụ.

◼ Kwadebe isi ihe ndị dị n’ihe ọmụmụ ahụ bụ́ ndị unu ga-atụleghachi n’ụzọ dị nkenke.

Mee Ka Ihe Ọmụmụ ahụ Kwekọọ ná Mkpa Onye A Na-amụrụ Ihe

◼ Kpee ekpere banyere onye ahụ na mkpa ndị o nwere.

◼ Chọpụta isi ihe ndị pụrụ isiri ya ike nghọta ma ọ bụ nkweta.

◼ Jụọ onwe gị, sị: Gịnị ka ọ dị mkpa ka ọ ghọta ma ọ bụ ka ọ rụọ ọrụ na ya iji nwee ọganihu ime mmụọ? Olee otú m pụrụ isi ruo n’obi ya?

◼ Dị ka mkpa si dị, kwadebe ihe atụ, nkọwa, ma ọ bụ ajụjụ ụfọdụ iji nyere ya aka ịghọta ihe isi ihe ma ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ pụtara.

Akụkụ nke 3: Iji Akwụkwọ Nsọ Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè

Nzube anyị ji eduzi ọmụmụ Bible bụ iji mee ka ndị mmadụ bụrụ “ndị na-eso ụzọ” Jizọs site n’inyere ha aka ịghọta na ịnakwere ozizi nke Okwu Chineke ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. (Mat. 28:19, 20; 1 Tesa. 2:13) N’ihi ya, ọmụmụ ihe ahụ kwesịrị ihiwe isi n’Akwụkwọ Nsọ.—km-IB 11/04 p. 4.

Mee Ka Ozizi Gị Na-ehiwe Isi n’Okwu Chineke

◼ Gosi onye ị na-amụrụ ihe otú e si achọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ na Bible nke ya.

◼ Gụọnụ ma kọwaa amaokwu Bible ndị gosiri ebe nkwenkwe anyị gbakwasịrị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ.

◼ Jiri ajụjụ na-eme ihe. Kama ịdị na-akọwara onye ị na-amụrụ ihe amaokwu Bible ndị unu gụrụ, gwa ya ka ọ kọwaara gị ha.

◼ Mee ka ọ dị mfe. Anwala ịkọwa ihe nile metụtara akụkụ Akwụkwọ Nsọ unu gụrụ. Kọwaa nanị ihe ndị dị na ya bụ́ ndị mere ka isi ihe unu na-atụle doo anya.

◼ Gosi otú a pụrụ isi tinye ihe a na-amụ n’ọrụ. Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịhụ otú amaokwu Bible ndị unu gụrụ si metụta ya onwe ya.

Akụkụ nke 4: Ịkụziri Ndị A Na-amụrụ Ihe Ime Nkwadebe

Onye a na-amụrụ ihe nke na-agụ ebe a ga-amụrụ ya tupu oge eruo, nke na-akanye ihe n’okpuru azịza ma na-eche echiche otú ọ ga-esi zaa ha n’okwu nke aka ya, na-enwe ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa. N’ihi ya, ozugbo unu malitere ịmụchi ihe anya, soro ya kwadebe otu ihe ọmụmụ iji gosi ya otú e si eme ya. Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-amụrụ ihe, ọ ga-abụ ihe enyemaka isoro ha kwadebechaa otu isiakwụkwọ ma ọ bụ otu ihe ọmụmụ.—km-IB 12/04 p. 1.

Ịkanye Ihe n’Okpuru Azịza na Idetu ihe n’Akụkụ Peeji

◼ Kọwaa otú e si achọta azịza nke ajụjụ ndị e depụtara.

◼ Gosi onye ahụ ị na-amụrụ ihe akwụkwọ nke gị bụ́ ebe ị kanyere ihe nanị n’okpuru okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị bụ́ isi.

◼ Nyere ya aka ịhụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla e zoro aka na ya na-akwado otu isi ihe dị na paragraf ọ dị na ya. Gosi ya otú e si edetu ihe n’akụkụ peeji nke akwụkwọ ahụ ọ na-amụ.

Ntụle Dị Mkpirikpi ná Mmalite na Ntụleghachi

◼ Gosi onye ị na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi na-atụle isiokwu nke ihe ọmụmụ ahụ, isiokwu nta ndị dị na ya, na ihe osise ndị dị na ya, tupu ya amalite ịmụ ya.

◼ Gbaa ya ume ịdị na-atụleghachi isi ihe ndị dị n’isiokwu ma ọ bụ n’ihe ọmụmụ ọ na-amụ ma ọ mụchaa ya.

Akụkụ nke 5: Ikpebi Ókè Ihe A Ga-amụ Ga-aharu

Ókè ihe a ga-amụ ga-aharu ga-adabere n’ikike na ọnọdụ nke onye na-eduzi ọmụmụ ihe nakwa nke onye a na-eduziri ya.—km-IB 1/05 p. 1.

Wusie Okwukwe Ike

◼ Ọ ka mma ịhụ na onye a na-amụrụ ihe ghọtara Okwu Chineke nke ọma karịa ịhụ na ọ mụchara akwụkwọ ya ngwa ngwa.

◼ Na-ewepụta oge kwesịrị ekwesị iji nyere onye a na-amụrụ ihe aka ịghọta na ịnakwere ihe ọ na-amụ.

◼ Na-ewepụta oge zuru ezu iji na-atụle akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ihe ọmụmụ ahụ gbakwasịrị ụkwụ na ha.

Mee Ka Ọmụmụ Ihe ahụ Na-aga Aga

◼ Ọ bụrụ na onye ị na-eduziri ọmụmụ ihe na-ekwukarị okwu banyere mkpa ya, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i mee ndokwa ikwurịta ya mgbe unu mụchara ihe.

◼ Ekwula ọtụtụ okwu mgbe ị na-eduzi ọmụmụ ihe. Na-egbu ahụmahụ na ihe ndị na-adịghị n’akwụkwọ a na-amụ nkenke iji ghara igbochi onye ị na-amụrụ ihe ịghọta ozizi ndị bụ́ isi nke Bible nke ọma.

Akụkụ nke 6: Mgbe Onye A Na-amụrụ Ihe Jụrụ Ajụjụ

Ozugbo onye a na-amụrụ Bible matawara ihe a na-akọ, ọ kasị mma ịdị na-amụrụ ya Bible n’ụzọ dị n’usoro kama ịdị na-eme a mụọ nke a taa, echi a mafere n’ọzọ. Nke a ga-enyere ya aka ịmalite inwe ezi ihe ọmụma, meekwa ka o nwee ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.—km-IB 2/05 p. 6.

Jiri Ezi Uche Mee Ihe

◼ Ọtụtụ mgbe, a pụrụ ịza ajụjụ ndị metụtara ihe a na-amụ ozugbo ahụ a jụrụ ya.

◼ Ọ bụrụ na ajụjụ onye a na-amụrụ ihe jụrụ emetụtaghị ihe a na-amụ ma ọ bụkwanụ na ọ bụ ajụjụ ga-achọ ka e mee nnyocha iji nwee ike ịza ya, a pụrụ ịza ya n’oge ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka idetu ajụjụ ndị dị otú ahụ edetu.

◼ Ọ bụrụ na ọ na-esiri onye a na-amụrụ ihe ike ikwenye n’ozizi ụfọdụ nke Bible, jiri akwụkwọ ọzọ kọwaara ya ihe Bible kwuru banyere isiokwu ahụ n’ụzọ zuru ezu.

◼ Ọ bụrụ na nke ahụ emeghị ka o kwenye, hapụ ya ruo oge ọzọ ma gaa n’ihu n’ihe ị na-amụrụ ya.

Mara Ebe Ike Gị Ruru

◼ Ọ bụrụ na azịza nke ajụjụ a jụrụ gị edoghị gị anya, azala ihe i chere.

◼ Jiri nke nta nke nta gosi onye ị na-amụrụ ihe otú e si eme nnyocha.

Akụkụ nke 7: Ikpe Ekpere Mgbe A Na-eduzi Ọmụmụ Ihe

Ka ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible wee nwee ọganihu ime mmụọ, ngọzi Jehova dị ha oké mkpa. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị iji ekpere na-amalite ma na-emechi ọmụmụ Bible ndị anyị maliterela.—km-IB 3/05 p. 4.

Ụzọ Isi Webata Ekpere

◼ Ọ bụrụ na ndị anyị na-eduziri ọmụmụ ihe bụ ndị ma Bible, anyị pụrụ iwebata ekpere n’ọmụmụ ihe mbụ anyị duziiri ha.

◼ N’ebe ndị ọzọ nọ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịchọpụta mgbe kwesịrị ekwesị iwebata ekpere n’ọmụmụ ihe ahụ.

◼ A pụrụ iji Abụ Ọma 25:4, 5 na 1 Jọn 5:14 kọwaa ihe mere e ji na-ekpe ekpere ahụ.

◼ A pụrụ iji Jọn 15:16 gosi na anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere site n’aha Jizọs Kraịst.

Ihe Ndị A Ga-etinye n’Ekpere

◼ O kwesịrị ekwesị inye Jehova otuto dị ka Onye ihe ahụ a na-amụ si n’aka ya.

◼ Kwuo okwu ndị na-egosi na i nwere ezigbo mmasị n’ebe onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ ihe nọ.

◼ Kwuo okwu ndị na-egosi na i nwere ekele maka nzukọ Jehova ji na-eme ihe.

◼ Rịọ Jehova ka ọ gọzie mgbalị onye ahụ ị na-amụrụ ihe na-eme itinye ihe ndị ọ na-amụta n’ọrụ.

Akụkụ nke 8: Iduru Ndị A Na-amụrụ Ihe Bịa ná Nzukọ Jehova

Nzube anyị ji eduzi ọmụmụ Bible abụghị nanị iji kụziere ndị ọzọ ozizi Bible kamakwa ọ bụ iji nyere ha aka ịbata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Na-ewepụta minit ole na ole kwa izu n’oge unu na-amụ ihe iji kọọrọ ha otu ihe banyere nzukọ Jehova.—km-IB 4/05 p. 8.

Nzukọ Ọgbakọ

◼ Kọwaara ndị ị na-amụrụ ihe nke ọ bụla n’ime nzukọ ọgbakọ ndị anyị na-enwe. Malite n’oge mbụ ị malitere ịmụrụ ha ihe gbawa ha ume ịbịa nzukọ ọgbakọ.

◼ Kọọrọ ha isi ihe ndị e kwuru ná nzukọ ọgbakọ.

◼ Mee ka ha tụsiwe anya mgbakọ dị iche iche, ọbịbịa onye nlekọta sekit, na ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs, ike.

◼ Jiri foto ndị dị n’akwụkwọ anyị nyere ha aka ịhụ ihe a na-eme ná nzukọ anyị.

◼ Gbaa ha ume ịgụ broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?

Jiri Vidio Na-eme Ka Ha Nwewekwuo Ekele Maka Nzukọ Jehova

◼ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name

◼ Our Whole Association of Brothers

◼ United by Divine Teaching

◼ To the Ends of the Earth

Akụkụ nke 9: Ịkwadebe Ndị A Na-amụrụ Ihe Ịgba Àmà Mgbe Ha Na-erubeghị Iso Ọgbakọ Na-eje Ozi

Ka ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible malitere igosipụta okwukwe n’ihe ha na-amụta, ha na-abụ ndị a kpaliri ịkọrọ ya ndị ọzọ.—km-IB 5/05 p. 1.

Na-agba Ha Ume Ịgba Àmà

◼ È nwere ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị ha pụrụ ịkpọ ka ha nọrọ ya mgbe ị na-amụrụ ha ihe?

◼ Ọ̀ dị onye ọrụ ibe ha, nwa akwụkwọ ibe ha, ma ọ bụ ndị ọzọ ha maara, bụ́ ndị gosiworo mmasị?

Kụziere Ha Ịkọrọ Ndị Ọzọ Ihe Ndị Ha Kweere

◼ N’oge ụfọdụ mgbe unu na-amụ ihe, jụọ onye ahụ ị na-amụrụ ihe, sị, “Olee otú ị ga-esi jiri Bible kọwaara ndị ezinụlọ gị eziokwu a?”

◼ Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta mkpa ọ dị iji nghọta, nkwanye ùgwù, na obiọma na-eme ihe mgbe ọ na-agwa ndị ọzọ banyere Chineke na nzube ya.

◼ Ndị a na-amụrụ ihe pụrụ iji broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? nyere ndị enyi na ndị ezinụlọ ha aka ịghọta nkwenkwe na ihe omume anyị ndị dabeere na Bible.

Akụkụ nke 10: Inye Ndị A Na-amụrụ Ihe Ọzụzụ n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ

Mgbe ndị okenye kpebiri na onye a na-eduziri ọmụmụ Bible eruwo ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ pụrụ ịmalite iso ọgbakọ jewe ozi ọma.—km-IB 6/05 p. 1.

Ịkwadokọ Ya Ọnụ

◼ Gosi onye nkwusa ọhụrụ ahụ ebe ọ ga-ahụ aro ndị a tụrụ banyere ụzọ e si ezi ozi ọma.

◼ Nyere ya aka ịhọrọ aro nke dị mfe ma daba adaba n’ókèala unu.

◼ Gbaa ya ume ịdị na-eji Bible eme ihe mgbe ọ na-ezi ozi ọma.

◼ Soro ya mgbe ọ na-amụgharị ya. Gosi ya otú ọ ga-esi jiri nkà zaa ajụjụ ma ọ bụ okwu mgbochi ndị a na-anụkarị n’ókèala unu.

Ịrụkọ Ọrụ Nkwusa Ọnụ

◼ Kwe ka onye ị na-amụrụ ihe hụ otú i si jiri ụzọ ahụ unu abụọ mụgharịworo zie ozi ọma.

◼ Buru n’uche ụdị mmadụ onye ahụ ị na-amụrụ ihe bụ na ebe ike ya ruru. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịkasị mma ikwe ka ihe ọ ga-eme bụrụ nanị ihe dị ka ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ya.

◼ Nyere onye nkwusa ọhụrụ ahụ aka inwe usoro ọ ga na-agbaso iji na-agachi ozi anya.

Akụkụ nke 11: Inyere Ndị A Na-amụrụ Ihe Aka Ime Nletaghachi

Ọ bụ n’oge mbụ e ziri mmadụ ozi ọma ka a na-amalite eme nkwadebe maka iletaghachi ya. Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume inwe ezi mmasị n’ebe ndị ọ na-ezi ozi ọma nọ. Jiri nke nta nke nta nye ya ọzụzụ banyere otú ọ ga-esi na-ajụpụta ha ihe dị ha n’obi, na-ege ha ntị mgbe ha na-aza ajụjụ, ma na-arịba ihe ndị na-enye ha nsogbu n’obi ama.—km-IB 7/05 p. 1.

Ime Nkwadebe Ịgaghachi

◼ Tụleghachi ihe ndị unu kwurịtara n’oge mbụ unu gara na nke onye nwe ụlọ, ma gosi onye ị na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi ahọrọ isiokwu ga-amasị onye nwe ụlọ.

◼ Unu abụọ gbakọọ aka kwadebe okwu dị nkenke nke ga-agụnye otu akụkụ Bible a ga-agụ nakwa otu paragraf nke ga-esi n’akwụkwọ e ji amụ ihe.

◼ Kwadebenụ ajụjụ unu pụrụ ịjụ ma unu na onye nwe ụlọ kparịtasịa.

Na-agaghachi Ozugbo

◼ Gbaa onye ahụ ị na-amụrụ ihe ume ịdị na-agaghachi ozugbo na nke ndị nile gosiri mmasị.

◼ Nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịhụ mkpa ọ dị ịnọgide na-aga na nke ndị ọ na-esi ike ịchọta n’ụlọ.

◼ Kụziere onye nkwusa ọhụrụ ahụ otú e si eyi àgbà maka nletaghachi, nyekwara ya aka ịghọta mkpa ọ dị ịgaghachi dị ka o kwere ná nkwa.

Akụkụ nke 12: Inyere Ndị Ị Na-eduziri Ọmụmụ Bible Aka Ịmalite na Iduzi Ọmụmụ Bible

Ọ dị oké mkpa ka i ṅomie Jizọs site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ozi gị. Ka onye ị na-amụrụ ihe na-ahụ ihe nlereanya ị na-esetịpụ n’ozi ahụ, ọ ga-aghọta na nzube e ji eme nletaghachi bụ iji malite ọmụmụ Bible.—km-IB 8/05 p. 1.

Ịgwa Mmadụ Ka I Duziwere Ya Ọmụmụ Bible

◼ Kọwaara onye ị na-amụrụ ihe na mgbe anyị na-agwa onye nwe ụlọ ka anyị duziwere ya ọmụmụ Bible, ọ dịchaghị mkpa ịkọwara ya ihe nile banyere ụzọ a ga-esi na-amụ ihe ahụ.

◼ Ọtụtụ mgbe, ọ na-akasị mma nanị igosi ya otú a ga-esi na-amụ ihe ahụ site n’ịmụrụ ya otu ma ọ bụkwanụ paragraf abụọ n’akwụkwọ a chọrọ iji eduziri ya ọmụmụ ihe ahụ.

◼ Tụleghachinụ ma mụgharịa otu n’ime aro ndị a tụrụ banyere ụzọ e si amalite ọmụmụ Bible.—km-IB 8/05 p. 4; km-IB 1/02 p. 6.

Inye Ndị A Na-amụrụ Ihe Ọzụzụ Ịghọ Ndị Ozizi

◼ Gbaa ndị ị na-amụrụ ihe ume ideba aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

◼ Mee ndokwa ka ndị nkwusa ọhụrụ na-eso gị aga eduziri ndị ọzọ ọmụmụ Bible bụ́ ndị ha pụrụ itinyetụ ọnụ na ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya