Kwadebe nke Ọma Tupu Ị Gawa Ịmụrụ Mmadụ Ihe
1. Gịnị mere anyị ga-eji enyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka inwe mmasị n’ihe ọ na-amụ?
1 Ọ bụrụ na anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, anyị kwesịrị ịkwadebe nke ọma iji mee ka o nwee mmasị ife Jehova. Mgbalị anyị na-eme ịmụrụ ya Baịbụl ga-arụpụta ihe dị mma ma anyị nyere ya aka inwe mmasị n’eziokwu ahụ ọ na-amụ. Ọ ga-eme ka ife Jehova gụwa ya agụụ. (Diut. 6:5; Ilu. 4:23; 1 Kọr. 9:26) Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya?
2. Olee otú ekpere ga-esi enyere anyị aka ịkwadebe ihe anyị ga-amụrụ mmadụ?
2 Ikpe Ekpere Tupu Na-akwadebe Ihe Unu Ga-amụ: Ebe ọ bụ Jehova na-eme ka eziokwu a kụrụ n’obi onye anyị na-amụrụ ihe na-eto, anyị kwesịrị ikpe ekpere tupu na-akwadebe ihe anyị na ya ga-amụ. N’ekpere ahụ, anyị ga-akpọ ya aha, kwuokwa mkpa ya. (1 Kọr. 3:6; Jems 1:5) Ekpere ahụ nwekwara ike ime ka anyị chọpụta ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi eme ka obi ya jupụta “n’ezi ihe ọmụma” nke uche Jehova.—Kọl. 1:9, 10.
3. Olee otú anyị ga-esi echebara onye anyị na-amụrụ ihe echiche ma anyị kwadebewe ihe anyị na ya ga-amụ?
3 Chebara Onye Ahụ Echiche: Jizọs ma na ihe ga-eso eme ka mmadụ kụzie ihe nke ọma bụ ichebara ndị ọ ga-akụziri ihe echiche. O nwere mgbe a jụrụ Jizọs otu ajụjụ ugboro abụọ. A jụrụ ya, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Otú o si zaa nke mbụ dị iche n’otú o si zaa nke abụọ. (Luk 10:25-28; 18:18-20) Anyị kwesịrị ichebara onye anyị na-amụrụ ihe echiche ma anyị kwadebewe ihe anyị na ya ga-amụ. Olee amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị anyị na ya ga-agụ? Paragraf ole ka anyị na ya ga-amụ? N’isiokwu ahụ, olee ihe ga-esiri ya ike ịghọta ma ọ bụ ikweta? Ọ bụrụ na anyị echebara ajụjụ ụfọdụ o nwere ike ịjụ echiche, ọ ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-aza ya.
4. Olee ihe ịkwadebe nke ọma pụtara?
4 Tụleghachi Ihe Unu Ga-amụ: N’agbanyeghị ugboro ole anyị mụụrụla ndị ọzọ isiokwu ahụ, ọ bụ nke mbụ anyị na onye a ga-amụ ya. Ka ihe anyị ga-amụrụ ya nwee ike iru ya n’obi, ọ dị mkpa ịkwadebe ihe ọ bụla anyị na ya ga-amụ nke ọma. Ime otú ahụ pụtara na anyị ga na-eme ihe anyị na-agba ya ume ka ọ na-eme. Buru onye ahụ n’obi tụleghachi ihe ahụ unu ga-amụ na amaokwu Baịbụl ndị e dere na ya. I nwekwara ike kaa ihe n’okpuru isi ihe ndị dị na paragraf nke ọ bụla.—Rom 2:21, 22.
5. Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jehova?
5 Jehova chọsiri ike ka onye ọ bụla anyị na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma. (2 Pita 3:9) Anyị ga-egosikwa na anyị chọrọ ka ha na-eme nke ọma ma anyị wepụta oge na-akwadebe ihe anyị na ha ga-amụ.