Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/08 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na March 10
  • Izu Na-amalite na March 17
  • Izu Na-amalite na March 24
  • Izu Na-amalite na March 31
  • Izu Na-amalite n’April 7
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 3/08 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na March 10

Abụ nke 131

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke March 1 na Teta! nke January-March, nakwa akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.

Nkeji 20: N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Ezukọta Ọnụ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke May 15, 2007, peeji nke 11-13. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ịbịa ọmụmụ ihe sirila nyere ha aka na otú ha sirila merie nsogbu dị iche iche iji na-abịachi ọmụmụ ihe anya.

Nkeji 15: “Anyị Nwere Ike Inye Jehova Ihe.”a Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 8

Izu Na-amalite na March 17

Abụ nke 144

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa March. Chetara ndị na-ege ntị ka ha jiri Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke January-March bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịa abịa ma dị njikere ikwu otú e nwere ike isi nyefee ha n’ókèala unu. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Nkeji 15: Igbe Ajụjụ. Ọ bụ okenye ga-eme ya. Gụọ ma tụlee isiokwu ahụ dum.

Nkeji 20: “Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs Aka?”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke otú e nwere ike isi malite iduziri onye ọbịa bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ọmụmụ Baịbụl.

Abụ nke 214

Izu Na-amalite na March 24

Abụ nke 111

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị na-ege ntị ka ha jiri broshuọ bụ́ Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? bịa Nzukọ Ije Ozi n’izu ọzọ, nakwa ka ha mụọ ihe ọmụmụ ya nke 5 amụọ tupu ha abịa. Gụọ akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo.

Nkeji 15: Jikere Inyefe Magazin Ndị Ọhụrụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Mgbe ị kọwatụchara isi ihe ndị dị n’Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke January-March, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo isiokwu ndị nke nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu, na ihe mere ha ji chee otú ahụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo kpọmkwem isi ihe ụfọdụ dị n’isiokwu ndị ahụ ha chọrọ iji enyefe magazin ndị ahụ. Olee ajụjụ e nwere ike iji malite nkwurịta okwu? Olee amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ bụ́ nke e nweziri ike ịgụ? Jiri aro ndị ahụ mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke January-March.

Nkeji 20: Anyị Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe. Mgbe okenye ga-eme ihe omume a kwusịrị okwu mmalite nke na-agaghị eru otu nkeji, ọ ga-ekwuzi okwu ga-adabere n’Ụlọ Nche nke July 1, 2005, peeji nke 18-19, paragraf nke 10-14. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ozi Alaeze ahụ si kasie ha obi ma mee ka ha nwee olileanya mgbe mbụ ha nụrụ ya.

Abụ nke 29

Izu Na-amalite na March 31

Abụ nke 37

Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa March.

Nkeji 25: Eziokwu Banyere Ime Anwansi, Ịgba Afa, na Ịta Amoosu. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. Kwuo okwu mmeghe ga-ewe nkeji abụọ ma ọ bụ atọ nke ga-adabere na paragraf nke 1-5 n’ihe ọmụmụ nke 5 na broshuọ bụ́ Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Gị na ndị na-ege ntị tụlezie paragraf nke 6-17 n’ụdị ajụjụ na azịza. Gụọ paragraf nke 10, 11, 12, na igbe dị na peeji nke 18, meekwa ka ụmụnna ghọta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na-akwado eziokwu Baịbụl nke na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ụgha Setan na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.—Jọn 8:32, 44.

Nkeji 15: “Ka Anyị Na-ewulirịta Ibe Anyị Elu Mgbe Anyị Nọ n’Ozi.”c

Abụ nke 155

Izu Na-amalite n’April 7

Abụ nke 186

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Nkeji 20: Gịnị Mere I Ji Na-ala Azụ Ime Baptizim? Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke July 1, 2006, peeji nke 29-30, paragraf nke 14-17. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ dị mkpirikpi, bụ́ ndị e mere baptizim mgbe ha dị afọ iri na ụma. Gịnị kpaliri ha iwere nzọụkwụ a dị mkpa mgbe ha ka dị obere? Olee otú baptizim ha si nyere ha aka itozu okè dị ka Ndị Kraịst, bụ́kwanụ nke chebere ha?

Nkeji 15: Ị̀ Nwaala Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl Site n’Ịkpọ Okwu Aha? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002, peeji nke 6. Tụlee aro ndị a tụrụ nke otú e nwere ike isi zie ozi ọma na otú e nwere ike isi hazigharịtụ ha ma jiri ha malite ọmụmụ Baịbụl n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Mezie otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ. Gbaa ndị na-ege ntị ume ka ha gbalịa iji akwụkwọ Bible Na-akụzi malite otu ọmụmụ Baịbụl n’izu ọzọ, site n’ịkpọ okwu aha.

Abụ nke 225

[Ihe odide ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya