Na-ebute Ihe Ndị Ka Mkpa Ụzọ
1 Olee ihe ụfọdụ dị mkpa a chọrọ maka ọdịmma ime mmụọ anyị? Ndị a aghaghị ịgụnye ọmụmụ ihe onwe onye, ịga nzukọ, ịnọgidesi ike n’ekpere, mkpakọrịta dị mma, na ozi ndị Kraịst. Anyị apụghị ịnọgide na-enwe ahụ ike ime mmụọ dị mma n’ebuteghị ihe ndị dị mkpa ụzọ ná ndụ anyị.
2 Otú ọ dị, anyị nile na-alụ ọgụ megide ọchịchọ anụ ahụ, nweekwa mkpa maka ịdọ aka ná ntị. (Gal. 5:17) Ka anyị ghara iche mgbe ọ bụla na e nwekwuru ihe a ga-erite site n’ịchụso ọdịmma onwe onye nanị. (Jer. 17:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ga-echebe obi anyị ma zere ịbụ ndị e duhiere, inyocha onwe onye mgbe nile dị mkpa.—Ilu 4:23; 2 Kọr. 13:5.
3 Nyochaa Obi nke Gị: Ị pụrụ ime nke a site n’ịjụ onwe gị ajụjụ ụfọdụ sitere n’obi: Ọ̀ na-agụsi m agụụ ike ịgụ Okwu Chineke? (1 Pita 2:2) M̀ matara ịdị mkpa nke ịga nzukọ ọgbakọ nile? (Hib. 10:24, 25) M̀ na-anọgidesi ike n’ekpere? (Rom 12:12) M̀ na-achọ mkpakọrịta nke ndị na-eche banyere ihe ime mmụọ? (Rom 1:11, 12) M̀ nwere echiche nke ibu ọrụ onwe onye ikwusa ozi ọma ahụ? (1 Kọr. 9:16) Ịza ee ga-egosi na ọ bụ ọchịchọ gị ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ.
4 Nyochaa Ihe Ị Na-eme Kwa Ụbọchị: Ọ dị gị mkpa ịgbasochi nnyocha nke ọchịchọ obi gị anya site n’iguzobe ihe ndị kasị mkpa maka iji oge eme ihe. Nke a na-agụnye ịhazi oge maka ịgụ Bible na mbipụta Ụlọ Nche na Teta! mgbe nile, tinyekwara ịkwadebe maka nzukọ dị iche iche. A ghaghịkwa iwepụtara ezinụlọ oge maka ma iji na-amụ ihe ma iji na-ekpekọ ekpere ọnụ. Kpaara oge a na-etinye n’ihu TV, kọmputa, ma ọ bụ nanị ime nleta na ịkparịta ụka, ókè. Kpebie ịga nzukọ ọgbakọ nile, na-emekwa ndokwa ka ọ na-ebute ihe ọ bụla ọzọ ụzọ. Mee atụmatụ ka ezinụlọ nile na-ekere òkè n’ozi ubi kwa izu.
5 N’enweghị obi abụọ, ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ ná ndụ anyị ga-abụ ihe na-eweta ọṅụ.