Ọmụmụ Bible Ndị Na-emepụta Ndị Na-eso Ụzọ
1 “Gịnị na-anapụ ime m baptism?” ka onozi Etiopia ahụ jụrụ mgbe Filip ‘zisịrị ya ozi ọma Jisọs.’ (Ọrụ 8:27-39) N’ihe banyere onozi ahụ, o nweworị ịhụnanya maka ihe ndị e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee, ma mgbe ọ natasịrị enyemaka ime mmụọ site n’ọnụ Filip, ọ dị njikere ịghọ onye na-eso ụzọ. Ma ọ bụghị mmadụ nile kwetara na ọ dị ha mkpa inyocha Akwụkwọ Nsọ n’onwe ha.
2 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, nzukọ Jehova ewepụtawo broshuọ ọhụrụ ahụ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, iji gbaa ndị mmadụ ume inyocha ozi Bible maka ụbọchị anyị. Ihe ọmụma dị na broshuọ ahụ kwesịrị ịdọrọ mmasị ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị ikike ịgụ ihe ha pụrụ ịbụ nke a kpaara ókè, n’ihi ya kwa mara ihe dị nta banyere Bible. A kwadebere ngwá ọrụ ọma a dị ka usoro ọmụmụ Bible.
3 Mgbe a na-amalite ọmụmụ Bible, ọ ga-enye aka ịtụleghachi aro ndị ahụ magburu onwe ha e bipụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996 banyere otú a pụrụ isi duzie ọmụmụ ihe na-arụpụta ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. N’oge a na-amụ ihe ahụ, tụlee ọganihu onye ahụ a na-amụrụ ihe nke ga-eme ka i nwee ike ịmata ebe ndị chọkwuru nlebara anya. Gbaa onye ahụ a na-amụrụ ihe ume ịkwadebe ihe ọmụmụ ya tupu oge eruo, na-achọta akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche. Azịza ndị ọ zara n’okwu nke aka ya pụrụ igosipụta nghọta sitere n’obi o nwere n’eziokwu ahụ. Ndị na-agụ mbipụta ndị ọzọ nke Society ma na-abịachi nzukọ ọgbakọ anya na-enwekarị ọganihu dị ngwa. Gbaa ya ume ịgwa ndị ọzọ n’ụzọ a na-emebughị ndokwa ya banyere ihe ọ na-amụta. Jiri obiọma gosi ya ihe ndị dị mkpa ka o mee iji nwee ọganihu ime mmụọ. Anyị ekwesịghị iduziri ndị na-achọghị ime mkpebi ọmụmụ ihe ruo mgbe ebighị ebi. Ndị a na-amụrụ ihe kwesịrị igosi ọchịchọ obi n’ịmụta ihe, iwere nguzo siri ike maka eziokwu ahụ, na ịga n’ihu ná nraranye na baptism.
4 N’ezinụlọ ụfọdụ, a na-eduzi ihe karịrị otu ọmụmụ ihe, ebe ndị òtù dị iche iche nke ezinụlọ ahụ na-enwe ọmụmụ ihe nke ha. Otú ọ dị, a pụrụ ịhọrọ inwekọ ọmụmụ ihe ezinụlọ ọnụ n’ọnọdụ kasịnụ, ebe ọ bụ na ọ ga-enye aka ijikọ ezinụlọ ahụ ọnụ n’ụzọ ime mmụọ.
5 Iwu Jisọs bụ ka anyị gaa mee ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19) Iji mee nke ahụ, anyị aghaghị iduzi ọmụmụ Bible nke ga-enyere ndị a na-amụrụ ihe aka inwe ọganihu ruo n’ókè nke na ha pụrụ ịjụ sị, “Gịnị na-anapụ ime m baptism?”