Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka September

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka September
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 1
  • Izu Na-amalite September 8
  • Izu Na-amalite September 15
  • Izu Na-amalite September 22
  • Izu Na-amalite September 29
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 9/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka September

RỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-edokwa Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ nile pụrụ idozigharị ihe otú ha chọrọ iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” na maka ntụleghachi minit 30 nke isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ahụ ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ. E kwesịrị ibu ụzọ kenye ụmụnna abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru ntụleghachi nke ụbọchị dị iche iche nke usoro ihe omume mgbakọ distrikti ahụ, bụ́ ndị ga-enwe ike ilekwasị anya n’isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ntụleghachi nke a a kwadebere nke ọma ga-enyere ọgbakọ aka icheta isi ihe ndị e kwuru maka iji ha mee ihe n’onwe ha nakwa iji ha mee ihe n’ubi. Azịza ndị na-ege ntị ga-aza na ahụmahụ ndị a ga-akọ kwesịrị ịdị mkpirikpi ma gaakwa n’isi ihe kpọmkwem.

Izu Na-amalite September 1

Abụ 26

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Na-ebute Ihe Ndị Ka Mkpa Ụzọ.” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, kwuo okwu na “Ibute Ihe Ndị Kwesịrị Ekwesị Ụzọ” dị na Teta! nke July 8, 1988, peji nke 8-9.

20 min: “Isoro Ndị Ọzọ Kerịta Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.” Okwu na-atụlezu paragraf nke 1 na nke 6-8. Mee ihe ngosi nke paragraf nke 2-5. Mesie ike iburu n’uche ime ndị na-eso ụzọ na iru ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe.

Abụ 107 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 8

Abụ 27

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

10 min: “Ọmụmụ Bible Ndị Na-emepụta Ndị Na-eso Ụzọ.” Okwu.

15 min: Okenye atụlee “Kpalie Ndị Mmụta Ime Nraranye na Baptism” (ihe ntinye km-IB 6/96, para. nke 20-22).

Abụ 109 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 15

Abụ 30

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Jiri Vidio Mee Ihe nke Ọma. Tụleghachi aro dị iche iche banyere iji vidio Society eme ihe, kọọkwa ahụmahụ e nwere n’ógbè unu nke ga-egosi ụzọ isi jiri vidio ndị ahụ mee ihe n’ụzọ ka ukwuu, ma n’ezinụlọ anyị ma n’ozi anyị.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Okwukwe n’Okwu Chineke’ nke 1997.” (Paragraf nke 1-13) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 8, 10, na 13. Mesie ike mkpa ọ dị n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ iji nlezianya jigide ọdịdị na àgwà ndị Kraịst anyị ruru n’ókè na ilekọta ụmụ anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Abụ 162 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 22

Abụ 165

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Okwukwe n’Okwu Chineke’ nke 1997.” (Paragraf nke 14-20) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 14 na 18 na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha. Mesie ike mkpa maka ime ihe n’usoro na ichebara ndị ọzọ echiche, karịsịa n’ihe banyere ịnọdụ oche. Mechie site n’okwu dị mkpirikpi na-atụleghachi “Ihe Ncheta Maka Mgbakọ Distrikti.”

17 min: Tụleghachi Akụkọ Afọ Ije Ozi 1997 nke Ọgbakọ. Onye nlekọta ije ozi ajaa ọgbakọ mma maka mgbalị dị mma, karịsịa na March, April, na May. Tụọ aro ndị sitere n’aka òtù ndị okenye na akụkọ ikpeazụ nke onye nlekọta sekit iji mụbaa ọrụ ozi ubi na ọmụmụ Bible. Kwupụta ihe mgbaru ọsọ ndị dị irè maka afọ ije ozi ọhụrụ, gụnyere ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible na ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ndị nwere ngwụsị izu ise—November, May, August.

Abụ 113 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 29

Abụ 32

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi. Kpọtụ uche na anyị ga-amalite ịmụ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ n’izu na-abịanụ n’ọmụmụ akwụkwọ. N’ịkwadebe maka ọrụ magazin n’October, kwurịta mkpa nke ‘Ịtụle Ókèala Gị,’ ‘Ịmara Magazin Ndị ahụ nke Ọma,’ ‘Ịkwadebe Okwu Mmeghe Gị,’ ‘Ime Mgbanwe Iji Kwekọọ n’Onye Nwe Ụlọ,’ na ‘Inyere Ibe Unu Aka’ site n’Ozi Alaeze Anyị nke October 1996, peji nke 8.

15 min: Ụzọ Isi Malite Mkparịta Ụka. Ihe ka ukwuu n’ihe ịga nke ọma n’ozi anyị na-adabere na anyị inwe ike ime ka ndị ọzọ sonye ná mkparịta ụka bara uru. Mgbe anyị nwere ike ikwu ihe ga-eme ka ndị ọzọ gee ntị, anyị emeriwo otu n’ime ihe mgbochi kasị ukwuu anyị na-ezute n’ịgba àmà. Soro ndị na-ege ntị kwurịta aro ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, ihe ọmụmụ nke 16, paragraf nke 11-14. Mee ka ndị nkwusa nwere nkà ma dị irè n’ịmalite mkparịta ụka kọọ okwu mmeghe ndị ha na-eji eme ihe mgbe ha na-ekwunyere ndị mmadụ okwu dị ka (1) onye na-agafe n’okporo ámá, (2) onye njem nọ na bọs, (3) akawo nọ n’azụ counter, (4) onye na-azụ ihe nọ n’ebe a na-adọba ụgbọala.

15 min: Nye Ozi Gị Otuto. Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee nke akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 81-83. Jụọ ajụjụ ndị a iji mee ka isi ihe ndị ahụ pụta ìhè: (1) Olee otú anyị si rite uru site n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs? (2) Ruo ókè hà aṅaa ka ibu ọrụ anyị ime nkwusa dịruru mkpa? (3) Ebumnobi ndị dị aṅaa kpaliri anyị ịrara ndụ anyị nye Jehova? (4) Ụdị àgwà dị aṅaa ka a chọrọ ma ọ bụrụ na mmadụ ga-efe Chineke? (5) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jisọs si mee nkwusa?

Abụ 121 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya