Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke 1997
1 Pọl onyeozi chetaara Timoti na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Tim. 3:16) Ebe Okwu Chineke si n’obi Chineke pụta, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee okwukwe na ya. Isiokwu nke mgbakọ distrikti nke afọ a bụ “Okwukwe n’Okwu Chineke.” Usoro ihe omume ahụ ga-ewusi okwukwe anyị n’ebe Bible dị ike, mà anyị amatawo eziokwu ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụ na anyị ka sonyeere nzukọ Jehova n’isi nso a. Anyị nile kwesịrị ime ndokwa ịnọ ya maka usoro ihe omume ahụ dum. Lee ihe na-ewuli elu ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na ndị ọhụrụ nwere mmasị, karịsịa ndị anyị na-amụrụ Bible, esoro anyị bịa!
2 Mgbakọ Ụbọchị Atọ: N’afọ a e dokwawo usoro ihe omume mgbakọ distrikti ụbọchị atọ maka abamuru anyị. Ugbu a a ga-enwe ngụkọta nke mgbakọ 110 na Nigeria. Ka ọ dị ugbu a a gwawo gị banyere mgbakọ nke e kenyere ọgbakọ gị, i kwesịkwara imeworị atụmatụ doro anya iji gaa ụbọchị atọ nile nke usoro ihe omume ahụ. Ì jekwuruwo onye were gị n’ọrụ iji nweta ohere ịhapụ ọrụ dị mkpa? Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka na-aga akwụkwọ, mgbakọ gị adabakwa n’oge àgbá akwụkwọ, ì jiriwo obiọma gwa ndị nkụzi ha na ụmụaka gị agaghị anọ ya na Friday n’ihi akụkụ a dị mkpa nke ọzụzụ okpukpe ha?—Deut. 31:12.
3 Tụkwasị n’asụsụ Bekee, a ga-enwe mgbakọ n’Abua, Asụsụ Maka Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri, Edo, Efịk, Gokana, Gun, Hausa, Igbo, Ijaw, Ishan, Isoko, Khana, Tiv, Urhobo, na Yoruba.
4 Usoro ihe omume ahụ ga-amalite na Friday n’elekere 9:20 nke ụtụtụ, nakwa na Saturday na Sunday n’elekere 9:00 nke ụtụtụ.
5 Mee nke Ọma Site n’Ịṅa Ntị: Pita onyeozi chetaara ndị Kraịst narị afọ mbụ na ha ga-eme nke ọma ịṅa ntị n’okwu amụma ahụ dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị. (2 Pita 1:19) Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere anyị. Ibi n’ụwa ochie a nke dị n’okpuru nchịkwa Setan yiri ịnọ n’ebe gbara ọchịchịrị. Anyị nwere obi ekele ịbụ ndị a kpọpụtaworo n’ọchịchịrị ime mmụọ. (Kọl. 1:13; 1 Pita 2:9; 1 Jọn 5:19) Iji nọgide n’ìhè ahụ, ọ dị anyị mkpa ime ka okwukwe anyị sie ike site n’ịdị na-aṅa ntị n’Okwu Jehova si n’ike mmụọ nsọ. Mgbakọ distrikti anyị n’afọ a ga-agba anyị ume ime nnọọ otú ahụ.
6 A pụrụ ịchọ mgbalị n’aka anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-atụkwasị uche n’usoro ihe omume ahụ, ma a ga-agọzi anyị n’ezie maka ime otú ahụ. Anyị kwesịrị ịgba mbọ zuo ike nke ọma tupu bịawa ebe mgbakọ ahụ ka anyị wee mụrụ anya n’oge nnọkọ ndị ahụ. Nye oge buru ibu iji rute n’ala mgbakọ ahụ kwa ụbọchị ka i wee nọdụ n’oche gị tupu ihe omume amalite. Mgbe ahụ sonye n’abụ na ekpere mmeghe ná mmalite nke usoro ihe omume ụbọchị ọ bụla. Ndị toruworo ogo mmadụ kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya, ndị mụrụ ụmụ kwesịkwara ịzụ ụmụaka ha.—Efe. 6:4.
7 Ọ bụrụ na anyị eleba isiokwu nke ihe omume dị iche iche anya tupu usoro ihe omume nke ụbọchị amalite, anyị pụrụ ịnwa ịtụ anya isi ihe ndị a pụrụ iwepụta n’oge nnọkọ ahụ. Nke a ga-eme ka mmasị anyị mie emie n’ihe omume ahụ mgbe a na-eme ya. Anyị pụrụ ile anya maka isi ihe ndị ga-enyere anyị aka ikwupụtara ndị ọzọ ihe mere anyị ji kwere na Chineke na ná nkwa ya e ji n’aka inyeghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ. (Hib. 11:1, 6) A tụwo aro ka anyị mee ndetu ndị dị nkenke iji nyere anyị aka icheta isi ihe nke usoro ihe omume ahụ. Ọ bụrụ na anyị edetuo ọtụtụ ihe, ụfọdụ isi ihe gbara ọkpụrụkpụ pụrụ ifunahụ anyị n’ihi na anyị ka nọ na-edetu ihe. A ga-enyekwara anyị aka ịtụkwasị uche n’ihe n’ụzọ ka mma mgbe anyị ji Bible anyị na-eso ka a na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche.
8 N’afọ gara aga a hụrụ ndị toruworo ogo mmadụ na ndị ntorobịa ole na ole ọzọ ná mgbakọ dị iche iche ka ha na-agagharị n’ala mgbakọ n’ụzọ na-enweghị isi, na-eletakwa ndị ọzọ ka usoro ihe omume na-aga n’ihu, kama ịdị na-ege ntị n’ihe “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” wepụtara maka abamuru anyị. Jisọs kwere nkwa inye anyị nri ime mmụọ n’oge ya. (Mat. 24:45-47) Ya mere, anyị kwesịrị ịnọ ya iji rite uru site ná nri ahụ, ọ bụghịkwa igosi enweghị ekele. (2 Kọr. 6:1) O yikwara ka mgbe ụfọdụ ụmụaka mewere aghara, ha na-arịọkarị ka ha gaa ebe ịnyụ mamịrị ma ọ bụ ụlọ mposi dị ka ihe ngọpụ iji bilie ma gagharịa. Ọzụzụ kwesịrị ekwesị n’ụlọ ga-emekarị ka ịga n’ebe ịnyụ mamịrị ma ọ bụ n’ụlọ mposi ugboro ugboro ghara ịdị mkpa. Mgbe ụfọdụ, ndị ntorobịa mere okenye karị na-anọkọ ọnụ, na-ekwu okwu, na-atakwụnye ihe ná ntị, ma na-ekesa ihe odide nye onwe ha. Ọ dị ndị na-eto eto anyị, ndị na-eche ọtụtụ nrụgide ihu taa, mkpa ịtụkwasị uche n’ihe omume a na-eme, ọ bụghị imewe ihe ndị ọzọ mgbe usoro ihe omume na-aga n’ihu. E kwesịrị izere ọchịchọ ndị ntorobịa ndị na-ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible. (Tụlee 2 Timoti 2:22.) Ịṅa ntị nke mmadụ nile, ndị toruworo ogo mmadụ na ndị ntorobịa, ga-asọpụrụ Jehova ma mee ka ọ ṅụrịa.
9 Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka otu n’ime ndị atendantị nye onye ọ bụla ndụmọdụ n’okwu ndị a, e kwesịrị ịnakwere ya dị ka ndokwa ịhụnanya sitere n’aka Jehova. (Gal. 6:1) Ọ dị mmadụ nile mkpa icheta na ihe mere anyị ji etinye mgbalị ịga mgbakọ ahụ bụ ka anyị wee ‘nụ ma mụta.’ (Deut. 31:12) Ọzọkwa, “ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.” (Ilu 1:5) N’oge fọdụrụnụ tupu ị gaa mgbakọ ahụ, tụlee dị ka ezinụlọ mkpa ọ dị ịnọkọta ọnụ n’ebe ndị na-ege ntị nọ, nọgide n’oche gị mgbe ihe omume na-aga n’ihu, ma ṅaa ntị n’ụzọ dị nkọ, iji nweta abamuru zuru ezu nke usoro ihe omume ahụ.
10 Ihe Ịchọ Mma nke Na-atọ Jehova Ụtọ: Ndị Jehova bụ ihe nkiri nye ụwa nile ịhụ. (1 Kọr. 4:9) A rịbara anyị ama n’ozuzu ya n’ihi ụkpụrụ anyị dị mma nke uwe na ejiji. Itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ a na-achọta na 1 Timoti 2:9, 10 na na 1 Pita 3:3, 4 n’ọrụ arụpụtawo ná mgbanwe dị ukwuu n’ọdịdị onwe onye nke ọtụtụ ndị ma e were ya tụnyere otú ha dị mgbe ha malitere isonyere ọgbakọ ndị Kraịst. Nke a bụ n’ụzọ megidere nnọọ ụkpụrụ nke uwe na ejiji nọgidere na-ada ada nke anyị na-ahụ n’ụwa. Anyị chọrọ ịnọ ná nche ka anyị ghara ịdị ka ụwa n’ọdịdị onwe onye anyị—na-eyi ákwà ndị na-ekwekọghị ekwekọ, na-akwalite ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa n’ụdị idozi isi, ma ọ bụ na-eyi uwe n’ụzọ na-adịghị mma n’anya. Uwe na ejiji anyị bụ́ ihe nlereanya kwesịrị inyere ndị ọhụrụ bịara mgbakọ aka ịhụ otú ndị Kraịst kwesịrị isi chọọ onwe ha mma.
11 Ọ bụ ezie na mmetụta a hapụrụ n’ozuzu ya n’ihi mgbakọ nke afọ gara aga dị nnọọ mma, uwe na ejiji ndị ụwa nọgidere na-abụ nsogbu n’ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ụfọdụ nọ, karịsịa n’oge ntụrụndụ. Ka anyị na-eme atụmatụ ịga mgbakọ ahụ, anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma n’ihe banyere uwe na ejiji anyị. Ndị mụrụ ụmụ, jirinụ amamihe leba anya n’ihe ụmụ unu na-eto eto na ndị nọ n’afọ iri na ụma na-aga iyi. Jide n’aka na anyị adịghị ekwe ka ụdị ejiji na ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa nwee mmetụta ọjọọ n’ọdịdị ndị Kraịst anyị.
12 Nọgide Na-enwe Àgwà Ọma: Àgwà ọma bụ akara nke ezi ndị Kraịst. (1 Pita 2:12) Akparamàgwà anyị n’ebe ọ bụla anyị pụrụ ịnọ—ná mgbakọ, n’ebe ọha na eze na-anọ, na n’ebe e nyere anyị ụlọ, tinyekwara mgbe anyị na-eme njem—pụrụ ịgba ezigbo àmà ma nyere ndị ọzọ aka ịhụ ihe okwukwe n’ebe Chineke nọ na n’Okwu ya pụrụ imere ụmụ mmadụ. Nke a pụrụ ịkpali ụfọdụ ịbịa mara Jehova. (Tụlee 1 Pita 3:1, 2.) Anyị nwere ihe ùgwù nke inye Chineke otuto site n’àgwà anyị. Otu Kọmitii Ala Mgbakọ dere, sị: “Ọnọdụ udo dị [ná] mgbakọ ahụ mgbe nnọkọ nke ọ bụla na-aga n’ihu na mgbe ọ gasịrị na-eme ka anyị ṅụrịa.” N’ịga n’ihu akụkọ ha sịrị: “Ndị mụrụ ụmụ nyere nnọọ nkwado, ha ekweghịkwa ka ụmụaka ha na-akpagharị.” Akụkọ si ebe ọzọ e nwere mgbakọ sịrị na “ụmụnna gosipụtara ụkpụrụ dị elu nke ịdị n’usoro n’oge nile nke mgbakọ ahụ.” Otu chiifu bịara otu n’ime mgbakọ ahụ nwere mmasị n’àgwà ndị bịaranụ. Ọ sịrị: “Agawo m òtù okpukpe dị iche iche . . . Ma achọpụtawo m na e nwere ọdịiche ụfọdụ n’etiti unu na ha. Dị ka ihe atụ, ahụrụ m ndị uwe ojii na ndị ọrụ nche ndị ọzọ ná nnọkọ nke okpukpe ndị ọzọ a, ma ahụbeghị m ihe dị otú ahụ n’ebe a. . . . Unu na-eme ihe unu na-akụzi n’ezie.” Akụkọ ndị dị ka ndị a na-atọ ụtọ ịgụ, ọ́ bụghị ya? Otú ọ dị, e nwere mkpa ịnọgide na-amụrụ anya, ka anyị wee nwee ike ichekwa aha ọma nke ndị Jehova.
13 E nyewo ọtụtụ ihe ncheta banyere ịchịkwa ụmụaka anyị, ghara ịdị na-ekwe ka ha na-agbagharị n’enweghị onye na-elekọta ha, na-enye ndị ọzọ nsogbu. Kwa afọ, Society na-anata akụkọ na a dịghị elekọta ụmụaka anyị ụfọdụ n’ime na gburugburu ụlọ mgbakọ ma ọ bụ a na-ahụ ha ka ha na-agbagharị gburugburu ala mgbakọ. Ọ wụkwara akpata oyi n’ahụ ịnata akụkọ site n’otu mgbakọ na “e jidere otu nwata nwoke dị ihe dị ka afọ 12 ka ọ na-ezuru ego n’otu n’ime igbe onyinye.” Ọ bụ ezie na mgbakọ ndị ahụ na-enye anyị ohere ileta na isoro òtù ụmụnna anyị kpakọrịta, ndị mụrụ ụmụ ka ga-eburu n’uche ibu ọrụ ha nke inye ụmụaka ha nlekọta n’oge nile. Nke a bụ ibu ọrụ nke Jehova tụkwasịrị n’isi nne ma ọ bụ nna ọ bụla. (Ilu 1:8; Efe. 6:4) Omume ụmụaka a na-elekọtaghị elekọta pụrụ imebi aha ọma nke Ndịàmà Jehova ndị ọzọ rụsiri ọrụ ike iwulite. (Ilu 29:15) E nwere ebe ole na ole ndị ọzọ a pụrụ ime ka ihe ka mma. N’ebe ụfọdụ ọtụtụ ndị họọrọ ịnọ n’okpuru osisi ma ọ bụ n’ebe e nyere ha ụlọ, ma ṅaa obere ntị n’usoro ihe omume ahụ. Ọzọkwa, n’ọnọdụ ole na ole, ụfọdụ dabara n’ọnwụnwa iji mgbakọ ahụ mere azụmahịa. Mgbe ụfọdụ ha ruru n’ókè nke iji isiokwu mgbakọ ahụ mepụta ihe dị iche iche maka orire n’ala mgbakọ ahụ. Society adịghị akwado nke a.
14 Inweta Ego Maka Mmefu Mgbakọ: Anyị nile ga-enwe mmefu n’ihe banyere ịga mgbakọ ahụ. E nwere mmefu ọzọ anyị ga-eme nke ọma ịtụle. Ihe owuwu ndị a na-eji eme ihe maka mgbakọ dị oké ọnụ ilekọta. E nwekwara mmefu ndị ọzọ a na-aghaghị ilebara anya. Biko cheta na mgbakọ ugbu a fọdụrụ nke nta ka ọ dabere kpam kpam n’onyinye afọ ofufo dị n’igbe onyinye dị iche iche ebe ọ bụ na e nweghị kafiteria, kama nanị ihe oriri ntụrụndụ dị mfe iji nweta ego maka mmefu dị iche iche. Dị ka ọ dị n’Israel oge ochie, ‘a gaghị ahụkwa anyị n’ihu Jehova n’aka efu.’ (Deut. 16:16) E nwere nnukwu ekele maka onyinye afọ ofufo anyị ji mmesapụ aka nye ná mgbakọ.—Ọrụ 20:35; 2 Kọr. 9:7, 11, 13.
15 Ịnọdụ Ala: Ntụzi ndị ahụ e nyeworo ruo ọtụtụ afọ ga-anọgide na-arụ ọrụ, ya bụ, A PỤRỤ INWETARA NANỊ NDỊ EZINỤLỌ GỊ OCHE, TINYERE ONYE Ọ BỤLA NKE PỤRỤ ISO GỊ JEE N’ỤGBỌALA GỊ. Ọ dịwo mma ịhụ na e nwekwuru ndị na-ekwekọ ná ntụzi ndị a n’afọ ndị na-adịbeghị anya, nke a amụbawokwa ọnọdụ ịhụnanya e gosipụtaworo ná mgbakọ ndị ahụ. N’ebe ka n’ọnụ ọgụgụ a pụrụ iru oche ụfọdụ n’ụzọ dị mfe karịa ndị ọzọ. Biko gosi ichebara ndị ọzọ echiche, ma hapụ oche ndị na-eme ka ahụ ruo mmadụ ala karị maka ndị ọnọdụ ha chọrọ ha.
16 Kamera, Camcorder, na Kaseti Na-enweta Ihe na Tepụ: A pụrụ iji kamera na ngwá ọrụ ndị ọzọ na-enweta ihe na tepụ mee ihe. Otú ọ dị, anyị iji ha eme ihe ekwesịghị ịdọpụ uche ndị ọzọ bịaranụ. Anyị ekwesịghị ịgagharịwa mgbe nnọkọ na-aga n’ihu na-ese foto, ebe nke ahụ ga-enye ndị ọzọ nsogbu bụ́ ndị na-agbalị itinye uche n’usoro ihe omume. A gaghị akwụnye ụdị ihe ọ bụla na-enweta ihe na tepụ n’usoro eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu, ngwá ọrụ ndị ahụ ekwesịghịkwa ịnọchi ụzọ nkebi, ụzọ ndị mmadụ si aga, ma ọ bụ ịnọchi ndị ọzọ ihu.
17 Ebe Ịnara Ọgwụ: Ngalaba Ebe Ịnara Ọgwụ bụ maka ọnọdụ mberede nanị. O nweghị ike ilekọta ndị nrịanrịa ha na-adịghị ala ala. Nke ahụ mere ị ga-eji tụlee mkpa ahụ ike gị na nke ezinụlọ gị tupu oge eruo. Biko weta ọgwụ ịba, aspirin, ihe enyemaka mgbari nri, bandeej, pin, na ihe ndị yiri ha nke gị, ebe ihe ndị dị otú ahụ na-agaghị adị ná mgbakọ ahụ. Onye ọ bụla a maara nọ n’ihe ize ndụ nke ihe osise, oké ụkọ shuga n’ọbara, nsogbu obi, na ihe ndị ọzọ, kwesịrị ịtụ anya ihe ndị dị ha mkpa ruo n’ókè o kwere mee. Ha kwesịrị inwe ọgwụ dị mkpa, otu onye òtù ezinụlọ ha ma ọ bụ ọgbakọ ha nke ghọtara ọnọdụ ha kwesịrị isoro ha nọrọ mgbe nile iji nye enyemaka ọ bụla dị mkpa. Ọ bụrụ na ụfọdụ bụ́ ndị nwere mkpa ahụ ike pụrụ iche enweghị ndị òtù ezinụlọ ndị pụrụ inyere ha aka, ọ dị mkpa ịgwa ndị okenye ọgbakọ ha banyere ọnọdụ ahụ ma mee ndokwa ndị dị mkpa iji nye aka.
18 Ihe Oriri ná Mgbakọ Ahụ: Na nke mbụ ya, a gaghị akwadebe ma wepụta nri ná mgbakọ n’afọ a. Nke a ga-eme ka ọtụtụ ndị ọzọ nwee ohere n’oge nnọkọ nile ahụ iji tinye uche ná nri ime mmụọ ahụ. A natawo ọtụtụ okwu ekele maka ime ka ihe dị mfe yiri ya eri mgbe e hiwere ndokwa ahụ ná mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Mmadụ nile kwesịrị ịkwadebe ma weta ihe oriri ha dị mfe, nke na-edozi ahụ maka nkwụsịtụ ehihie, dị ka ndị a tụrụ aro ha n’akwụkwọ ozi nke May 15, 1997, e degaara ọgbakọ nile. Anyị na-agba gị ume iri nri ehihie gị n’ime ụlọ mgbakọ ahụ. Ọ bụ ohere mara mma ịtụrụ ndụ na isoro ndị nọdụ ala gburugburu gị kpakọrịta. Anyị na-agba gị nnọọ ume ịdị ọcha ma ghara imetọsị akụkụ ebe ị na-anọdụ ala. Biko hichasịa nri ọ bụla dasara n’ala ma tụnye ha n’ime ihe e ji etinye ihe mkpofu tinyere akwụkwọ ịfụchi ihe ọ bụla, akwụkwọ, na ihe ntụfu ndị ọzọ. Ngalaba na-ahụ maka ịdị ọcha kwesịrị ịmụrụ anya ịhụ na e nwere ihe ndị e ji etinye ihe mkpofu maka nke a n’ụlọ mgbakọ ahụ. A gaghị eweta ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-aba n’anya, gụnyere mmanya ọcha na kaị kaị, n’ebe a na-enwe mgbakọ. Ọ bụghị ihe amamihe ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’agbata nnọkọ dị iche iche. Igbe nchekwa nri e bubatara n’ụlọ mgbakọ ahụ kwesịrị ịdaba ná ndokwa ịnọdụ n’oche, o kwesịghịkwa ịnọchi ụzọ nkebi. A hụwo ụfọdụ ndị na-ege ntị ka ha na-eri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ mgbe usoro ihe omume na-aga n’ihu. Ime nke a bụ egosighị nkwanye ùgwù. Ọzọkwa, a hụwo ụfọdụ ka ha na-agba ndị na-ere ihe oriri aka ahịa mgbe usoro ihe omume na-aga n’ihu. Omume dị otú ahụ ekwesịghị ekwesị.
19 N’eziokwu anyị na-enwe ekele maka oriri ime mmụọ na ọnọdụ udo, dị jụụ nke mkpakọrịta n’oge nkwụsịtụ ehihie anyị dị mkpirikpi. N’ikwekọ ná nzube nke ndokwa a, kama ịhapụ ala mgbakọ n’oge nkwụsịtụ ehihie ịga zụrụ ihe oriri, biko weta ihe ma ị bịawa. Ihe oriri ntụrụndụ dị mfe nke anyị ga-eme ka e nwee ugbu a bụ nanị maka mkpa mberede, ha abụghịkwa iji gboo mkpa ihe oriri nile anyị. N’ụzọ dị otú a, ị ga-enwekwu oge ịnụrụ ụtọ mkpakọrịta ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị. Anyị na-agba gị ume ịgbaso otu ndokwa a nke ụmụnna anyị na-agbaso gbaa ụwa nile gburugburu. N’ime ndokwa maka nri ehihie gị, buru ndị ogbenye na ndị nọ ná mkpa n’uche.
20 Lee otú obi si dị anyị ụtọ na Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” ga-amalite n’oge na-adịghị anya! Anyị nile chọrọ ijide n’aka na anyị emewo ndokwa anyị iji gaa usoro ihe omume ahụ dum, ka anyị wee rite uru zuru ezu n’oriri ime mmụọ dị mma nke Jehova kwadebeere anyị site ná nzukọ ya. N’ụzọ dị otú ahụ anyị ga-aghọ ‘ndị e meworo ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla’ n’ụbọchị ndị dị n’ihu.—2 Tim. 3:17.
Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ncheta Maka Mgbakọ Distrikti
Baptism: Ndị chọrọ ka e mee ha baptism kwesịrị ịnọ n’oche ha n’akụkụ ahụ e wepụtara iche tupu usoro ihe omume amalite n’ụtụtụ Saturday. Onye ọ bụla na-eme atụmatụ ka e mee ya baptism kwesịrị iweta ákwà ịsa ahụ dị mma n’anya na ákwà nhicha ahụ. N’oge gara aga ụfọdụ eyiriwo uwe na-ekwesịghị ekwesị na nke wepụrụ ihe n’ihe omume ahụ. Ndị okenye na-eso ndị ahụ chọrọ ka e mee ha baptism atụleghachi ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ Ozi Anyị kwesịrị ijide n’aka na onye nke ọ bụla ghọtara isi ihe ndị a. Nanị ndị mụchaworo akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ọmụmụ Bible ebe obibi ma bụrụ ndị òtù ndị okenye nwapụtara kwesịrị ka e nye ha Baptism Statement. Mgbe okwu baptism na ekpere nke onye ọkà okwu ahụ gasịrị, onye isi oche nnọkọ ahụ ga-akpọ abụ. Mgbe ahịrị nke ikpeazụ gasịrị, ndị atendantị ga-eduzi ndị ahụ chọrọ ka e mee ha baptism gaa n’ebe a ga-emikpu ha ná mmiri. Biko ahapụla oche gị tupu onye isi oche nnọkọ ahụ amaa ọkwà na nnọkọ ahụ emechiwo. Ọzọkwa agbala ọsọ ma ọ bụ jiri ọkụ ọkụ gaa n’ebe imikpu ná mmiri. Baptism dị ka ihe àmà nke nrara mmadụ raara onwe ya nye bụ ihe onwe onye dị n’etiti onye ahụ na Jehova. N’ihi ya, o kwesịghị ekwesị ka ndị a ga-eme baptism makụọ onwe ha ma ọ bụ jikọọ aka mgbe a na-eme ha baptism.
Kaadị Baaji: Biko yiri kaadị baaji 1997 n’oge nile mgbe ị nọ n’obodo mgbakọ ahụ na mgbe ị na-eje ma ọ bụ na-ala site na ya. Nke a na-emepụtakarịrị anyị ohere ịgba ezi àmà. E kwesịrị inweta kaadị baajị ahụ na ọbọ ha site n’ọgbakọ gị, ebe ọ bụ na a gaghị enwe ha ná mgbakọ. Echerela ruo ụbọchị ole na ole tupu mgbakọ ahụ iji jụọ ase maka kaadị gị na ezinụlọ gị. Cheta iji kaadị Advance Medical Directive/Release gị nke i ji eme ihe ugbu a.
Ụlọ Obibi: Anyị na-arịọ ọzọ maka nkwado nke onye ọ bụla n’ihe banyere ụlọ obibi nke mgbakọ ahụ nyere. Ọ bụrụ na anyị agaa Society n’azụ ma nweta ụlọ obibi mgbakọ nwetawororị, anyị na-emebi ihe dị ukwuu n’ọrụ siri ike nke ụmụnna anyị rụworo, bụ́ ndị na-enweta ha n’ọnụ ego ka mma. Ọ BỤRỤ NA I NWEE NSOGBU N’IHE BANYERE EBE E NYERE GỊ ỤLỌ, biko alala azụ n’ime ka onye nlekọta Ngalaba Ụlọ Obibi ná mgbakọ ahụ mara ka o wee nwee ike inyere gị aka idozi okwu ahụ ozugbo. Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e zigara fọm Room Request Maka Mkpa Pụrụ Iche n’oge n’adres mgbakọ kwesịrị ekwesị n’egbughị oge. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịkagbu ụlọ e kenyere gị site ná ndokwa nke mkpa pụrụ iche, i kwesịrị ime ka ma onye nwe ụlọ ma Ngalaba Ụlọ Obibi mgbakọ mara ozugbo ka e wee nwee ike inye onye ọzọ ụlọ ahụ. EZITERELA Society fọm Room Request e dejupụtaworo. Ziga ha kpọmkwem ná Ngalaba Ụlọ Obibi mgbakọ ahụ na-eji adres kwesịrị ekwesị dị n’azụ fọm ahụ mee ihe.
Ozi Afọ Ofufo: Ị̀ pụrụ isetịpụ oge ụfọdụ ná mgbakọ ahụ iji nye aka n’otu n’ime ngalaba ọrụ dị iche iche? Ijere ụmụnna anyị ozi, ọ bụrụgodị nanị ruo hour ole na ole, pụrụ inye aka nke ukwuu ma weta nnukwu afọ ojuju onwe onye. Ọ bụrụ na ị pụrụ inye aka, biko jee ná Ngalaba Ozi Afọ Ofufo ná mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 16 pụkwara inye aka dị mma site n’ịrụ ọrụ n’okpuru nduzi nke nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye ọzọ toworo ogo mmadụ.
Okwu Ịdọ Aka ná Ntị: Mụrụ anya banyere ihe ndị pụrụ ịbụ nsogbu iji zere ihe isi ike ndị na-enweghị isi. Ọtụtụ mgbe ndị ohi na ajọ mmadụ ndị ọzọ na-aghọgbu ndị si esi bịa. Jide n’aka na a gbachiri ụgbọala gị agbachi mgbe nile, ahapụkwala ihe ọ bụla n’ebe a ga-ahụ ya anya ịnwa mmadụ ịwaba n’ike. Ọ bụ ebe e nwere nnọkọ buru ibu ka ndị ohi na ndị aka n’akpa na-elekwasị anya. Ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ịhapụ ihe ọ bụla bara uru n’elu oche gị. Ị pụghị ijide n’aka na onye ọ bụla nọ gị gburugburu bụ onye Kraịst. N’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ihe na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa? A natawo akụkọ dị iche iche banyere ụfọdụ ndị si n’èzí ịnwa ịrara ụmụaka pụọ. DEBE ỤMỤAKA GỊ N’EBE Ị GA NA-AHỤ HA MGBE NILE.