Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke 1995
1 Ihe ndị mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ hà dị ole? Ma eleghị anya ole na ole n’ime anyị nwaworo idepụta ha nile. N’agbanyeghị ibi n’ime ụwa nke ọgba aghara na mgbagwoju anya, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Dị ka a mara n’ọkwa n’Ozi Alaeze Anyị nke May 1995, “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” bụ isiokwu na-agba ume maka mgbakọ distrikti nke 1995.
2 Anyị na-eto Jehova n’ihi na ọ kụziiri anyị eziokwu. (Aịsa. 54:13; Jọn 8:32) N’otu aka ahụ, anyị ji ọṅụ na-esoro ndị nile na-achọ ịnọ ná ntụkwasị obi na obi ụtọ na-ekerịta eziokwu ahụ. (Ezik. 9:4; Ọrụ 20:35) Òtù ụmụnna anyị nke ndị Kraịst na-ewetakwara anyị ọṅụ. Ezinụlọ ime mmụọ nke na-ahụ n’anya na-eweta afọ ojuju na obi ụtọ. Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ihe ndị na-akpata ọṅụ anyị bụ́ nke na-akwali anyị ito Jehova. Okwu na ihe ngosi dị iche iche nke mgbakọ ahụ ga-adọrọ uche anyị gaa n’ihe ndị ọzọ sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere a ga-eji enwe ọṅụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a nke nsogbu.
3 Mgbakọ Ụbọchị Atọ: Ì sorowo onye were gị n’ọrụ mee ndokwa maka inye gị ohere ịhapụ ọrụ ka i wee nwee ike ịnọ ya n’ụbọchị atọ dum nke mgbakọ ahụ? Nne na nna ndị nwere ụmụaka nọ n’afọ ije akwụkwọ bụ́ ndị ga-eje otu n’ime mgbakọ ndị ahụ mgbe a na-emechibeghị akwụkwọ kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa ndị nkụzi na ụmụ ha agaghị anọ n’ụlọ akwụkwọ na Friday n’ihi akụkụ a dị mkpa nke ofufe okpukpe ha. Olee ebe e nwere mgbakọ nke dịkarịsịrị gị nso? Ka ọ dị ugbu a odeakwụkwọ ọgbakọ unu agwawo unu ihe nile metụtara ọgbakọ unu. Ná Mgbakọ Distrikti nke Ota 6, a ga-asụgharị usoro ihe omume ahụ gaa n’Asụsụ Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri.
4 Usoro ihe omume ahụ ga-amalite na Friday n’elekere 9:20 nke ụtụtụ, ọ ga-emechikwa na Sunday n’ihe dị ka elekere 3:30 nke ehihie. Na Saturday na Sunday, usoro ihe omume ahụ ga-amalite n’elekere 9:00 nke ụtụtụ.
5 Ị̀ Ga-eso ná Ndị Bịaranụ?: A na-agba anyị ume ije ụbọchị atọ nke mgbakọ ahụ dum. N’ihi gịnị? Jehova chọrọ ka anyị nọrọ n’ebe ahụ. Taa okwukwe na ahụ ike ime mmụọ anyị nọ n’okpuru mwakpo siri ike. Pọl dụrụ ọdụ banyere ‘anyị ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe anyị’ n’oge mgbe ndị Kraịst nọ na Judia na-enwe oké nrụgide. (Hib. 3:12, 13; 10:25) Ndị Filipaị biri “n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwe anya uhie.” Ma, ha ‘nwukwara enwu dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.’ (Fil. 2:15) Gịnị mere ndị Kraịst a nke narị afọ mbụ jiri dị iche? N’ihi na ha ji nrubeisi gbasoo idu ndú nke mmụọ nsọ bụ́ nke nyere ntụziaka ka ha na-ezukọta “ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.”—Hib. 10:24.
6 Ụwa ga-akpali anyị ime ihe dị iche, na-ebelata ọchịchọ anyị isoro ụmụnna anyị zukọọ ma too Jehova. N’afọ a a na-akpọ anyị òkù ido onwe anyị n’okpuru mmụọ Jehova ma nụ ụtọ ụbọchị atọ ahụ dum nke mgbakọ ahụ. Ànyị ekpebisiwo ike na anyị na ezinụlọ anyị dum ga-eso ná ndị bịaranụ? Ọ dị anyị mkpa iwusi ịhụnanya na okwukwe anyị ike mgbe mgbe. Jehova ewepụtawo mgbakọ kwa afọ iji nyere anyị aka n’akụkụ a.
7 Welaa Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ụlọ: Olee otú ị pụrụ isi rite uru kasị ukwuu site ná mgbakọ ahụ? N’ikwu ya n’otu okwu, azịza ya bụ “ịtụkwasị uche n’ihe.” Nke a abụghị ọrụ dị mfe n’ọha mmadụ taa nke nwere ahụ erughị ala gabigara ókè, nke na-eme ihe oké ngwa ngwa. Ọ pụrụ ịbụrụ ndị na-eto eto jupụtara n’ume ihe isi ike ịtụkwasị uche n’ihe, ma ọ bụ ihe ịma aka na-eche anyị nile ihu mgbe a nọ ná mgbakọ distrikti. Anyị ga-ahụ ịtụkwasị uche n’ihe ịbụ nke dị mfe karị ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ mee ndokwa. Jụọ onwe gị sị, ‘Gịnị bụ isiokwu nke mgbakọ ahụ?’ Tụgharịa uche na ya! ‘N’ihi gịnị ka m ji eje, gịnịkwa ka m ga na-eme n’ime ụbọchị atọ ahụ? Uhuruchi m hà ga-ejupụta ná ntụrụndụ, ka ọ̀ bụ na mụ edokwawo oge zuru ezu maka izu ike na ntụleghachi nke ihe ndị bụ isi nke mgbakọ ahụ?’
8 Isiokwu Ụlọ Nche nke August 1, 1984, bụ́ “Ị̀ Na-atụgharị Uche ka ọ bụ Nanị Ịmụ Anya Arọ Nrọ?” tụrụ ọtụtụ aro n’ụzọ e si erite uru kasị ukwuu site ná nzukọ, mgbe ahụkwa kwubie, sị: “Ma eleghị anya, ọzụzụ nke uche bụ isi ihe kachasị mkpa.” Mgbe onye ọkà okwu malitere, anyị na-egekarị ntị, ma eleghị anya mgbe okwu ahụ ruru ókè ụfọdụ, anyị na-ahapụ uche anyị ‘ịgbapụnahụ anyị.’ Olee otú anyị pụrụ isi gbochie nke a ime?
9 O kwesịrị ka a tụghachi aro ndị a tụworo n’oge gara aga n’ihi na ha dị irè. Ọ bụrụ na o kwetụrụ omume, gbalịa izuru ike zuru ezu kwa abalị. Nke a adịghị mfe mgbe nile n’ihi na ọ pụrụ ịgụnye ime njem, ọ bụrụkwa na ị nọ n’ebe obibi dị nso ná mgbakọ, i nwere ike ghara ịlaba ụra ngwa ngwa ma ọ bụ zuo ike dị ka i si eme n’ụlọ. Ime ndokwa dị mma ga-enyekarị gị ohere inweta izu ike dị gị mkpa.
10 Idetu ihe ole na ole n’akwụkwọ abụrụwo otu ihe na-enye aka n’ịtụkwasị uche n’ihe. Ọ bụrụ na ị nwaa idetu ihe buru ibu, isi ihe ụfọdụ dị mkpa pụrụ ifu kpam kpam. Dị ka aro, detuo ihe ná nzube nke ịgwa onye ị na-amụrụ Bible ma ọ bụ onye ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ nchịkọta nke usoro ihe omume ahụ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na i bughị otu onye n’uche kpọmkwem, ị ga-enwe otu nzube n’idetu ihe, mgbe mgbakọ ahụ gasịkwara ị pụrụ ịchọ ọnọdụ iji kwupụta isi ihe nke usoro ihe omume ahụ mgbe ị na-agba àmà mberede nye ndị òtù ezinụlọ bụ ndị na-ekweghị ekwe. Site n’idetu ihe na ịgwa ndị ọzọ ihe ị mụtara, ị gaghị echezọ ihe ọmụma ahụ ngwa ngwa. Okwu na-amụba ikike ncheta.
11 Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto Na-asọpụrụ Chineke Site n’Àgwà Ndị Chineke: N’afọ gara aga a natara okwu ndị dị mma ma na-agba ume banyere àgwà anyị site n’aka ndị nwe ụlọ na ndị ọzọ. Otu onye nwe ụlọ sịrị: “Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ mgbe nile inye Ndịàmà ebe obibi n’ihi na ha na-enwe ndidi ma na-ekwenye ekwenye, ha na-ejikwa nlezianya na-eleru ụmụ ha anya.” Onye ọzọ nwe ụlọ sịrị na Ndịàmà yiri ka ha nwere obi ụtọ ma bụrụkwa ndị a haziri ahazi karịa òtù ndị ọzọ.
12 Akụkọ ọzọ kwuru na otu mgbakọ e nwere n’oge na-adịbeghị anya tupu nke anyị rụpụtara mbibi ihe dị ukwuu, tinyere izu ohi. Ma banyere mgbakọ anyị, akụkọ ahụ gara n’ihu, sị: “Ọ dịghị anyị mkpa inwe nchegbu banyere nke ahụ n’ebe Ndịàmà nọ.”
13 Ọ dị anyị ka ya bụrụ na akụkọ nile a natara dị otú ahụ, ma n’ụzọ dị mwute, ọ dịghị otú ahụ. Onye isi oche nke otu mgbakọ sịrị: “Mgbe nnọkọ dị iche iche gasịrị, ọtụtụ n’ime ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu na-agbakọta n’ọnụ ọgụgụ bara ụba n’ebe ndị ọbịa na-anọ na [họtel] ruo n’ime abalị, na-achị ọchị n’olu dara ụda ma na-eti mkpu. Nke a na-enye ndị ọbịa ndị ọzọ nsogbu . . . , bụ́ ndị yiri ka ndị iwe na-ewe. Ụfọdụ ụmụaka na-agbagharị na paseji, na-emechi ibo ụzọ n’ike ka ha na-aga n’ọnụ ụlọ ibe ha ma na-ekwu okwu n’olu na-ada oké ụda n’ime ụlọ ndị ahụ.”
14 Nsogbu ọzọ dịgideworo eri ọtụtụ afọ bụ ìgwè bara ụba nke ụmụnna ịdị na-akparịta ụka n’èzí nke ụlọ mgbakọ mgbe nnọkọ dị iche iche na-aga n’ihu. N’otu mgbakọ n’afọ gara aga, a hụrụ otu ihe odide nke onye na-amụ Bible dere n’ime igbe onyinye. Ọ na-agụ, sị: “Ọ dịbeghị mgbe m nwere ijuanya dị ka m nwere n’ihi ụzụ, ihe omume, na mkparịta ụka dịnụ . . . n’oge okwu ndị ahụ . . . Abụbeghị m Onyeàmà, abụ m nanị onye na-amụ ihe ma na-amụta egwu na nsọpụrụ Chineke.” N’ezie, ọ dịghị onye n’ime anyị ga-achọ ime ka e nwee echiche bụ na anyị enweghị ekele maka ihe ndị Jehova na-enye.
15 Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị mgbe nile, sị: ‘Ònye ka m na-anọchite anya ya, n’ihi gịnịkwa ka m ji eje mgbakọ a?’ Ọdịdị ime mmụọ na nsọpụrụ Chineke anyị na-apụta ìhè n’okwu, àgwà, na n’ekele anyị nwere maka ihe ime mmụọ dị iche iche. (Jes. 3:13; 1 Pita 2:2, 3, 12) A na-achọpụta mgbe mgbe na ụmụnna ndị tachiworo obi n’ọtụtụ afọ nke mgbochi na mmachibido iwu na-aṅa ntị nke ọma ma na-egosi nkwanye ùgwù karị n’oge mgbakọ, na-anọdụ n’oche ha, na-etinyemi uche ha n’okwu na n’ihe ngosi dị iche iche.
16 Uwe na Ejiji Gị Na-ezipụ Ozi: Na 1 Samuel 16:7, a na-echetara anyị na “mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” N’ihi ya, ndị mmadụ na-ejikarị ọdịdị anyị na-ekpe anyị ikpe. A na-elerukwu uwe na ejiji anyị anya, karịsịa mgbe anyị na-eje mgbakọ maka ofufe na ntụziaka n’ịdị ndụ ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto na-aga akwụkwọ ma ọ bụ ọ bụrụ na ọrụ ego gị na-eme ka i soro ndị mmadụ na-agbaso ejiji ndị ụwa na-akpachi anya, ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ ndị Kraịst maka ejiji dị mma n’anya.
17 Ụkpụrụ uwe na ejiji dịgasị iche gburugburu ụwa. A na-atụ anya n’aka ndị Kraịst iyi ákwà ndị dị mma n’anya, ndị a haziri nke ọma. Olee ndị kwesịrị ikpebi nke a? Nne na nna kwesịrị ijide n’aka na ụmụ ha ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu eyighị uwe dị ka ndị ntorobịa ndị ụwa. E nyewo ntụziaka ndị kwesịrị ekwesị iji nyere anyị aka ime mkpebi ndị ziri ezi n’akụkụ a nke chọrọ iji akọ mee ihe. Anyị na-agba ume ntụleghachi nke isiokwu Teta! nke February 8, 1987 (Bekee), bụ́ “Gịnị Ka Uwe Pụtara Nye Gị?” Gịnị ka a hụrụ n’ụfọdụ mgbakọ anyị n’afọ gara aga?
18 Mgbe otu Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke” gasịrị, anyị natara akụkọ a: “Ụmụnna ndị ikom na ndị inyom enwewo ọganihu buru ibu n’uwe, ejiji, na àgwà ha ná mgbakọ n’afọ a. . . . Otú ọ dị, a ka nwekwara ọnọdụ na àgwà ndị inwekwu ọganihu dị mkpa na ha.” Mgbe mgbakọ ọzọ gasịrị, a kọrọ na uwe ndị na-adịghị mma n’anya pụtara nnọọ ìhè. Akụkọ ahụ rụtụrụ aka na uwe ụfọdụ ndị kpasuru ndị ọzọ iwe. Ụfọdụ ndị nọ n’èzí bịaranụ rịbakwara uwe ndị ahụ na-adịghị mma n’anya ama. Ákwà ụfọdụ na-egosi ahụ ha nke ukwuu ma tagidekwa n’ahụ gabiga ókè.
19 Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị yi ákwà ndị dị mma n’anya ma na-egosi nsọpụrụ mgbe ha nọ n’ala mgbakọ ahụ. Ọ bụrụ na ndị okenye ahụta na ụfọdụ nwere àgwà nke iyi uwe na-adịghị mma n’anya n’oge ha nọ nkịtị, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị inye ndụmọdụ obi ọma na nke siri ike na ejiji dị otú ahụ ekwesịghị ekwesị tupu mgbakọ ahụ eruo, karịsịa dị ka ndị na-aga mgbakọ ndị Kraịst. Biko soro ndị ị na-amụrụ Bible bụ́ ndị ga-eje mgbakọ ahụ tụleghachi ntụziaka dị iche iche n’àgwà na uwe ndị a kọwapụtara n’elu.
20 Kamera na Ihe Ndị Na-enweta Ihe na Tepu: O kwesịrị ekwesị inye ihe ncheta obi ọma banyere kamera na ihe ndị na-enweta ihe na tepu. Biko cheta, ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ iji kamera, kaseti vidio, ma ọ bụ ụdị ọ bụla nke ngwá ọrụ na-enweta ihe na tepu mee ihe, gosi nchebara echiche maka ndị nọ gị gburugburu. Ịgaghari n’oge nnọkọ ma ọ bụ ọbụna inweta ihe na tepu site n’oche gị pụrụ ịdị na-adọpụ ndị ọzọ uche. A gaghị akwụnye ụdị ihe ọ bụla na-enweta ihe na tepu n’usoro eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu, ngwá ọrụ ndị ahụ ekwesịghịkwa ịnọchi ụzọ nkebi ma ọ bụ ebe ndị mmadụ si aga. Ma ì kpebiri ise foto ma ọ bụ inweta akụkụ ụfọdụ nke usoro ihe omume ahụ na kaseti vidio ma ọ bụ na kaseti ụda olu bụ okwu dịịrị onwe onye. Foto na ihe ndị e nwetara na tepu pụrụ iweghachi ihe ncheta ndị dị mma mgbe e kiriri ha mgbe e mesịworo. E kwesịrị iji nlezianya jiri ngwá ọrụ ndị dị otú ahụ mee ihe, n’ụzọ na-adịghị adọpụ ndị ọzọ uche ma ọ bụ na-egbochi gị irite uru kasị ukwuu site n’usoro ihe omume ahụ. Mgbe ị lọtara ụlọ, à ga-enwe oge iji tụleghachi ihe ndị ahụ e nwetara na tepu? Ị pụrụ ịchọpụta na idetu ihe ga-ezu.
21 Ịnọdụ Ala: Ná Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke” nke 1994, ị̀ rịbara ama ọganihu dị n’ihe banyere inweta oche? E nwewo ọganihu ụfọdụ, ma anyị ka nwere mkpa iburu ihe ncheta nke a n’obi: A PỤRỤ INWETARA NANỊ NDỊ EZINỤLỌ GỊ OCHE, TINYERE ONYE Ọ BỤLA NKE PỤRỤ ISO GỊ JEE N’ỤGBỌ ALA GỊ.
22 Igbe Onyinye: Ọ pụrụ ịbụ na ị rịbara ama ná mgbakọ distrikti nke afọ gara aga na e nwere igbe onyinye ndị ọhụrụ bụ́ ndị Society wetara maka Ala Mgbakọ nke ọ bụla. Nzaghachi e nyere ịma ọkwa ndị ahụ na-agba anyị ume igosi nkwado anyị nye Society site n’inye onyinye ná mgbakọ ndị ahụ dị mma nke ukwuu, anyị na-ekelekwa unu nile maka nkwado ego unu nye nzukọ Jehova.
23 Tiketi Nri: Anyị na-agba ume ka e buru ụzọ zụta tiketi nri tupu mgbakọ ahụ. Gịnị bụ nzube nke a? Ibu ụzọ ree tiketi nri na-eme ka mgbakọ ahụ nweta ego maka ịzụta ihe oriri ndị bụ isi tupu oge eruo. Ọ dị mkpa ịzụta osikapa, ji, garị, ehi, ọkụkọ, àgwà, akwụkwọ nri, na ihe oriri ndị ọzọ tupu oge eruo iji jide ha n’aka maka usoro mgbakọ distrikti ahụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ọnụ ahịa ihe oriri na-arị elu nke ukwuu ka oge ezumike na-abịaru nso na December. Ọ dị mkpa ka onye nlekọta Ozi Ihe Oriri maka mgbakọ dị iche iche zụta ihe oriri n’ebe o buru ibu n’October na November. Ego a ga-eji mee nke a dị ya mkpa. Ọ na-esiri Society ike inye ego zuru ezu maka nke a ebe a na-enwe ọtụtụ mgbakọ ná mba nke a ugbu a. Ọ bụ nke ahụ mere anyị ji na-agba unu ume ịzụta tiketi nri site n’aka Kọmitii Mgbakọ tupu oge eruo. Mgbe ahụ a ga-eji ego ndị ahụ mee ihe maka ịzụta ihe oriri ndị ahụ tupu oge eruo. N’ezie unu ga-erite uru n’ọnụ ego dị ala maka ihe oriri ga-adị na kafiteria na refreshmenti ná mgbakọ ndị ahụ, ebe ọ bụ na a pụrụ ịzụta ihe oriri mgbe ha dị ọnụ ala.
24 N’ihi ya, anyị na-agba onye isi oche ndị nlekọta na odeakwụkwọ ọgbakọ ọ bụla ume ime ndokwa maka ịzụta tiketi nri tupu oge eruo. A pụrụ isite n’onye nhazi mgbakọ n’ọgbakọ nke ọ bụla mee nke a. Ozugbo a tụlesịrị isiokwu a n’October, ndị nkwusa pụrụ iweta ego maka tiketi ndị ahụ. E kwesịrị idebe ihe ndepụta. Mgbe a zụtara tiketi ndị ahụ site n’aka Kọmitii Mgbakọ, a ga-enyefe ha n’aka ndị nkwusa kwụworo ụgwọ maka ha. Ndị nkwusa kwesịrị imeso ha dị ka ego ma jiri nlezianya lekọta ha. A pụrụ iji tiketi nri ndị ahụ mee ihe na kafiteria na refreshmenti ozugbo ndị nkwusa bịarutere ná mgbakọ. A na-agba ndị nkwusa nile ume ịzụta tiketi nri tupu oge eruo, bụ́ ndị a ga-eji mee ihe ma ọ dịkarịa ala ụbọchị abụọ ndị mbụ nke mgbakọ ahụ. Ime otú ahụ ga-enye aka n’ịzụta ihe oriri n’ebe o buru ibu tupu mgbakọ amalite.
25 Onyinye Ihe Oriri: Anyị na-agba ume ka a na-enye onyinye ihe oriri maka mgbakọ distrikti dị iche iche. Nke a pụrụ ịgụnye ụdị dị iche iche nke ihe oriri e ji eme ihe, dị ka ji, osikapa, garị, unere, àgwà, ose, tomato, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, ehi, ọkụkọ, na ụdị ihe oriri ndị ọzọ ị ga-achọ inye. Nke a bụ ụzọ dị mma isi nye ọrụ Alaeze ahụ nkwado. Ngalaba Ozi Ihe Oriri ji ihe oriri ndị a nile na-eme ihe. Onyinye gị nke ihe oriri ndị dị otú ahụ ga-enyere mgbakọ aka ịkwụ ụgwọ mmefu ya dị iche iche ma nye ndị nọ n’ozi ọsụ ụzọ nri n’efu.
26 Ozugbo a tụlere isiokwu nke a, e kwesịrị ime ndokwa n’ọgbakọ maka inye onyinye nke ihe oriri ndị dị otú ahụ na iwega ha n’Ala Mgbakọ. Otú ọ dị, e kwesịrị iweta ihe oriri ndị pụrụ imebi emebi n’oge kwesịrị ekwesị ka ha ghara imebi tupu mgbakọ nke mbụ. Ọ bụrụ na Kọmitii Mgbakọ enyebeghị unu ntụziaka metụtara nke a banyere mgbe a ga-eweta ihe oriri ndị ahụ, ị pụrụ ịkpọtụrụ ha. A pụrụ iwega ozugbo n’ebe ndebe nri ihe oriri ọ bụla ndị nkwusa wetara mgbe ha na-eme njem ịga mgbakọ. Mgbe ndị Israel oge ochie bịara ugbo atọ n’afọ maka ememe ndị a na-eme n’ụlọikwuu, ma ọ bụ n’ụlọ nsọ, Deuterọnọmi 16:16 na-ekwu na e nyere ha iwu, sị: “A gaghị ahụkwa ha n’ihu Jehova n’aka efu.” Ha ga-eche echiche ọ bụghị nanị banyere onwe ha na ezinụlọ ha, kama banyere onyinye ha ga-enye nzukọ Jehova. N’otu aka ahụ taa, anyị kwesịkwara ime atụmatụ nkwado ihe onwunwe anyị ga-enye nzukọ Jehova.
27 Tụkwasị na nri e siri a ga-ewere na kafiteria na refreshmenti, ọ bụrụ na ndị nkwusa achọọ iri nri ha si n’ụlọ weta n’ime ụlọ ndo n’oge ezumike, ha nwere ohere ime otú ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na ụfọdụ chọrọ ịzụrụ na kafiteria ma ọ bụ na refreshmenti ma tinye ihe oriri ahụ n’ime ihe ntinye nri nke ha iji rie ya n’ime ụlọ ndo, a pụrụ inye ohere maka nke ahụ. Ihe dị mkpa bụ na onye ọ bụla kwesịrị ime ka ebe nile dị ọcha mgbe e risịrị nri. Nhazi mgbakọ ga-eme ka e nwee nkata ihe mkpofu zuru ezu maka ndị nkwusa itinye ihe mkpofu ha, na ihe ndị ọzọ, e kwesịkwara inwe ihe zuru ezu e ji edebe ihe ọcha. Ọ bụrụ na obere igbe ndị e ji echekwa nri dị mkpa, a na-anakwere ha ma ọ bụrụ na ha ga-abanye n’okpuru oche gị. Otú ọ dị, e kwesịghị ibubata ụdị nnukwu igbe nchekwa nri ndị e ji eme mkpapụ ntụrụndụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ime ụlọ ndo ahụ. E kwesịrị izere iri nri ma ọ bụ iri nri ratụ ratụ mgbe usoro ihe omume na-aga n’ihu. Nke a ga-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka nri ime mmụọ a na-ekesa.
28 Na November 3, 1995, nke mbụ ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” ga-amalite. Ì mesịwo nkwadebe gị, ị̀ dịkwa njikere ugbu a ịnụ ụtọ ụbọchị atọ nke mmekọrịta ihe obi ụtọ na nke ihe ọma dị iche iche nke ime mmụọ? Ọ bụ ekpere anyị si n’ezi obi ka Jehova gọzie mgbalị ndị unu na-eme iso ụmụnna unu ndị nwoke na ndị nwanyị gaa mgbakọ na-abịanụ, ka anyị na-elekwasị anya n’otú e si abụ ndị ji ọṅụ enye Jehova otuto.
[Igbe dị na opage 6]
Ihe Ncheta Maka Mgbakọ Distrikti
Baptism: Ndị chọrọ ka e mee ha baptism kwesịrị ịnọ n’oche ha n’akụkụ ahụ e wepụtara iche tupu usoro ihe omume n’ụtụtụ Saturday. A hụwo na ụfọdụ na-eyi uwe na-enweghị nkwanye ùgwù na ndị na-ekwesịghị ihe omume ahụ. Onye ọ bụla na-eme atụmatụ ka e mee ya baptism kwesịrị iweta ákwà ịsa ahụ dị mma n’anya na ákwà nhicha ahụ. Mgbe okwu baptism na ekpere nke onye ọkà okwu ahụ gasịrị, onye isi oche nnọkọ ahụ ga-enye ndị ahụ na-achọ ka e mee ha baptism ntụziaka dị mkpirikpi ma mgbe ahụ kpọọ abụ a ga-abụ. Mgbe ahịrị nke ikpeazụ gasịrị, ndị atendantị ga-eduzi ndị ahụ chọrọ ka e mee ha baptism gaa n’ebe a ga-emikpu ha ná mmiri. Ebe baptism dị ka ihe àmà nke nrara mmadụ raara onwe ya nye bụ ihe onwe onye dị n’etiti onye ahụ na Jehova, e nweghị ohere ọ bụla maka ihe ahụ a na-akpọ mmekọ baptism nke mmadụ abụọ ma ọ bụ karị a na-eme baptism na-amakụ onwe ha ma ọ bụ jikọọ aka mgbe a na-eme ha baptism.
Ụlọ Obibi: Anyị na-arịọ ọzọ maka nkwado nke onye ọ bụla n’ihe banyere ụlọ obibi nke mgbakọ ahụ nyere. Ọ bụrụ na anyị agaa Society n’azụ ma nweta ụlọ obibi mgbakọ nwetawororị, anyị na-emebi ihe dị ukwuu n’ọrụ siri ike nke ụmụnna anyị rụworo, bụ́ ndị na-enweta ha n’ọnụ ego ka mma. Ọ BỤRỤ NA I NWEE NSOGBU N’IHE BANYERE EBE E NYERE GỊ ỤLỌ, biko alala azụ n’ime ka onye nlekọta Ngalaba Ụlọ Obibi ná mgbakọ ahụ mara ka o wee nwee ike inyere gị aka idozi okwu ahụ ozugbo. Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e zigara fọm Room Request maka Mkpa Pụrụ Iche n’oge n’adres mgbakọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịkagbu ụlọ e kenyere gị site ná ndokwa nke mkpa pụrụ iche, i kwesịrị ime ka ma onye nwe ụlọ ma Ngalaba Ụlọ Obibi mgbakọ mara ozugbo ka e wee nwee ike inye onye ọzọ ụlọ ahụ.
Kaadị Baajị: Biko yiri kaadị baajị 1995 ná mgbakọ ahụ nakwa mgbe ị na-eje ma ọ bụ na-ala site n’ogige mgbakọ ahụ. Nke a na-enyekarị anyị ohere ịgba ezi àmà mgbe anyị nọ na njem. E kwesịrị inweta kaadị baajị ahụ na ọbọ ha site n’ọgbakọ gị, ebe ọ bụ na a gaghị enwe ha ná mgbakọ. Cheta iji kaadị Advance Medical Directive/Release gị nke i ji eme ihe ugbu a. Ndị òtù ezinụlọ Betel na ndị ozi ọsụ ụzọ kwesịkwara ijide kaadị nkọwa ha.
Ozi Afọ Ofufo: Ị̀ pụrụ isetịpụ oge ụfọdụ ná mgbakọ ahụ iji nye aka n’otu n’ime ngalaba ọrụ dị iche iche? Ijere ụmụnna anyị ozi, ọ bụrụgodị nanị ruo hour ole na ole, pụrụ inye aka nke ukwuu ma weta ọ̀tụ̀tụ̀ afọ ojuju dị mma. Ọ bụrụ na ị pụrụ inye aka, biko jee ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ọrụ Afọ Ofufo ná mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 16 pụkwara inye aka dị mma site n’ịrụ ọrụ n’okpuru nduzi nke nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye ọzọ toruworo ogo mmadụ.
Okwu Ịdọ Aka ná Ntị: Site n’ịmụrụ anya banyere ihe ndị pụrụ ịbụ nsogbu, anyị pụrụ ichebe onwe anyị pụọ n’ihe isi ike a pụrụ izere ezere. Ọtụtụ mgbe ndị ohi na ajọ mmadụ ndị ọzọ na-aghọgbu ndị si esi bịa. Jide n’aka na a gbachiri ụgbọ ala gị agbachi mgbe nile, ahapụkwala ihe ọ bụla n’ebe a ga-ahụ ya anya ịnwa mmadụ ịwaba n’ike. Ọ bụ ebe e nwere nnọkọ buru ibu ka ndị ohi na ndị aka n’akpa na-enweta uru ha kasịnụ. Ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ịhapụ ihe ọ bụla bara uru n’elu oche gị. Ị pụghị ijide n’aka na onye ọ bụla nọ gị gburugburu bụ onye Kraịst. N’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ihe na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa? A natawo akụkọ dị iche iche banyere ụfọdụ ndị si n’èzí ịnwa ịrara ụmụaka pụọ. DEBE ỤMỤAKA GỊ N’EBE Ị GA NA-AHỤ HA MGBE NILE.