Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke 1996
1 Usoro ihe omume mgbakọ distrikti afọ a ga-enyere anyị aka n’ezie ijigide udo Chineke anyị, ọ ga-akọwakwa òkè anyị n’inyere ndị ọzọ aka ịchọta udo dị otú ahụ. Dị ka a mara ọkwa ya n’Ozi Alaeze Anyị nke May 1996, isiokwu ya bụ “Ndị Ozi nke Udo Chineke.” Ì mewo atụmatụ gị ka i wee ghara ịhapụ akụkụ ọ bụla nke usoro ihe omume ahụ?
2 Usoro Ihe Omume Ụbọchị Atọ: Anyị maara na ị ga-erite uru dị ukwuu ná mgbakọ nke afọ a ma jiri ume ọhụrụ laghachi n’ebe obibi gị. (2 Ihe Eme. 7:10) Ọzọkwa n’afọ a anyị ga-enwe usoro ihe omume ụbọchị atọ. Ì meworị ndokwa inweta ohere ịhapụ ọrụ site n’ọrụ ego ka i wee nwee ike ịga maka oge ahụ dum? A ga-enwe ụfọdụ n’ime mgbakọ ndị bu ụzọ tupu e mechie ụlọ akwụkwọ maka oge ezumike. Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka na-aga akwụkwọ, ì jiriwo nkwanye ùgwù gwa ndị nkụzi ha na ha agaghị anọ ya na Friday n’ihi akụkụ a dị mkpa nke ọzụzụ okpukpe ha?
3 Ozi Alaeze Anyị nke May 1996 depụtara ụbọchị na ebe a ga-enwe mgbakọ 104 na Nigeria. Ka ọ dị ugbu a odeakwụkwọ ọgbakọ unu agwawo unu nke e kenyere unu. Ná mgbakọ distrikti Ota 7 na Uli 7, a ga-asụgharị usoro ihe omume ahụ gaa n’Asụsụ Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri.
4 Usoro ihe omume ahụ ga-amalite na Friday n’elekere 9:20 nke ụtụtụ, ọ ga-emechikwa na Sunday n’ihe dị ka elekere 3:30 nke ehihie. Na Saturday na Sunday, usoro ihe omume ahụ ga-amalite n’elekere 9:00 nke ụtụtụ. Ị̀ ga-egosi ụmụnna anyị ndị meworo agadi na ndị ahụ na-adịkwaghị ike obiọma site n’ịhapụ oche ndị dị n’akụkụ ebe ndị ka mma, dịkwa ntụsara ahụ? Cheta na ‘ịhụnanya . . . adịghị achọ ihe nke aka ya.’—1 Kọr. 13:4, 5; Fil. 2:4.
5 À Ga-amụcha Gị? Mgbe o hotasịrị Ilu 27:17, “Ígwè na-amụcha ígwè,” Ụlọ Nche nke August 15, 1993, kwuru, sị: “Anyị dị ka ígwè ọrụ nke e kwesịrị ịdị na-amụcha mgbe nile. Ebe ọ bụ na igosipụta ịhụnanya anyị maka Jehova na ime mkpebi ndị dabeere n’okwukwe anyị pụtara ịdị iche pụọ n’ụwa, ọ dị mkpa anyị ịgbaso ụzọ dị iche mgbe nile, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, pụọ na nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-agbaso.” Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ?
6 Anyị dị iche, anyị aghaghịkwa ịnọgide na-adị iche pụọ n’ụwa. Anyị aghaghị ịnọgide ná mgbalị anyị na-eme iji mezuo nke a ma ọ bụrụ na anyị ga-anụ ọkụ n’obi maka ọrụ ọma. (Taị. 2:14) Ọ bụ n’ihi ya ka isiokwu Ụlọ Nche ahụ e hotara n’elu ji gaa n’ihu sị: “Mgbe anyị nọ n’etiti ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya, anyị na-amụcha ibe anyị—anyị na-akpasu ịhụnanya na ọrụ ọma n’ahụ ibe anyị.” Mgbakọ distrikti bụ otu n’ime ndokwa sitere n’aka Jehova iji nyere anyị aka ịnọ na-adị nkọ n’ụzọ ime mmụọ. O kwesịghị ka anyị hapụ akụkụ ọ bụla nke usoro ihe omume ahụ.
7 Onye Maara Ihe Ga-ege Ntị: Ige ntị bụ nkà nke a ga-azụlite. E kwuwo na mmadụ na-echeta nanị ihe dị ka ọkara nke ihe ọ nụworo—n’agbanyeghị otú o si na-eche na ya gere ntị nke ọma. Ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ọgbọ nke ndọpụ uche, mgbe ụfọdụ anyị pụrụ inwe ihe isi ike ịtụkwasị uche n’ihe ruo ogologo oge. Ànyị pụrụ ịgbalị ịmụbawanye ikike ịṅa ntị anyị, karịsịa mgbe anyị nọ n’ebe e nwere oké ìgwè ndị na-ege onye na-ekwu okwu ntị? Ọ bụrụ na a gwara gị ka i nye nchịkọta nke usoro ihe omume nke ụbọchị ọ bụla mgbe ị laghachisịrị n’ebe obibi site ná mgbakọ, ị̀ ga-enwe ike ime otú ahụ? Olee otú anyị nile pụrụ isi meziwanye ikike anyị ige ntị na ịṅa ntị nke ọma n’akụkụ ọ bụla e mere n’usoro ihe omume mgbakọ ahụ?
8 Mmasị na-ekpo ọkụ dị mkpa, n’ihi na onyinye Chineke nke ikike ncheta apụghị ịrụ ọrụ nke ọma ma e nweghị ya. Dị ka ihe atụ, ka mmadụ na-egosikwu mmasị n’otu isiokwu, otú ahụ ka ọ na-aka mfe icheta isi ihe nke otu okwu ma ọ bụ akụkụ usoro ihe omume. Ma, ọ na-adabekarị na anyị ịṅabiga ntị ókè karị n’ihe anyị nwere ihe ùgwù ịnụ ná mgbakọ distrikti. Mmasị anyị na-ekpo ọkụ na ịṅa ntị n’akụkụ ọ bụla nke usoro ihe omume mgbakọ nwere ihe jikọrọ ya na ọnọdụ ime mmụọ anyị ugbu a tinyekwara olileanya ọdịnihu anyị. O sighị ike ịghọta na anyị agaghị enwe ike ịṅa ntị nke ọma ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ige ntị n’usoro ihe omume ahụ site n’ebe e nyere anyị ụlọ n’Ala Mgbakọ ahụ dị ka ụfọdụ meworo n’oge gara aga. Ya mere, mmadụ nile kwesịrị izukọta n’ụlọ mgbakọ ma gbasochie usoro ihe omume ahụ anya. Ná mgbakọ dị iche iche a na-ezi anyị ụzọ Jehova, na-enyekwa anyị ntụziaka iji rụzuo ọrụ na-azọpụta ndụ. (1 Tim. 4:16) Were onwe gị dị ka ụgbọ nke nọ n’oké osimiri ifufe na-ebugharị. Nkwa nile nke Jehova bụ arịlịka siri ike nke olileanya. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị aṅa ntị n’usoro ihe omume ndị Kraịst ma na-ekwe ka uche ya kpafuo, isi ihe ndị dị mkpa nke ndụmọdụ na ntụziaka nke pụrụ igbochi ya pụọ n’inwe ụgbọ okpukpu ime mmụọ pụrụ ifunahụ ya.—Hib. 2:1; 6:19.
9 N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ụmụnna anyị na-etinye mgbalị dị ukwuu iji gaa nzukọ. Ọ dị ịtụnanya ịhụ ịṅa ntị nke ọma ha ná mgbakọ. Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ adọpụwo uche ndị ọzọ site n’ịgagharị gburugburu ala mgbakọ mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ndị ọzọ na-abata n’azụ oge. Ná mgbakọ ụfọdụ gara aga, o siri ike ịnụ ihe na minit ole na ole ndị mbụ nke usoro ihe omume n’ihi ọtụtụ ngagharị a na-eme na gburugburu ala ahụ na n’azụ ebe a na-anọdụ ala. Ndị a adịghị abụkarị ụmụnna ndị nọ n’ọrụ ma ọ bụ ndị nne na-elekọta mkpa nke obere ụmụaka ha. Ọtụtụ n’ime mkpọtụ ndị ahụ bụ site n’aka ndị bịara nleta nkịtị. N’afọ a Ngalaba Ndị Atendantị ga-eji akọ lebakwuo anya ná nsogbu ahụ, e nwekwara olileanya na mmadụ nile ga-anọdụ ala mgbe onye isi oche kpọrọ anyị òkù ime otú ahụ. A ga-enwe ekele dị ukwuu maka nkwado gị n’akụkụ a.
10 Aro ndị dị aṅaa dị irè ga-enyere anyị aka ịṅakwu ntị n’usoro ihe omume mgbakọ na ichetakwu ihe ndị e kwuru? Ihe e kwuworo n’afọ ndị gara aga kwesịrị ka e kwughachi ha: (a) Lekwasị anya n’isi ihe mere e ji gaa n’obodo ukwu maka mgbakọ ahụ. Ọ bụghị ịtụrụ ndụ, kama ọ bụ ige ntị na ịmụta ihe. (Deut. 31:12) Gbalịa inweta ezumike zuru ezu kwa anyasị. Ọ bụrụ na ị bịa mgbakọ ma ike gwụrụ gị nke ukwuu, ịtụkwasị uche n’ihe ga-esi ike. (b) Nye onwe gị oge dị ukwuu iji dọba ụgbọala gị na iji nọdụ ala tupu usoro ihe omume amalite. Iji ọsọ agbaga n’oche na minit ikpeazụ ga-arụpụkarị na akụkụ ụfọdụ nke mmeghe ahụ ga-efunahụ gị. (ch) Mee ndetu ndị dị nkenke nke isi ihe gbara ọkpụrụkpụ. Idetubiga ihe ókè pụrụ ịbụ ihe mgbochi nye ezi ige ntị. Mgbe ị na-ede ihe, jide n’aka na ị hapụghị isi ihe ndị ọzọ n’ihi itinye uche n’ihe ndetu gị. (d) Mgbe a kpọpụtara otu ihe omume mgbakọ, jiri oké mmasị tụọ anya ya. Jụọ onwe gị, ‘Gịnị ka m pụrụ ịmụta n’ihe omume a nke ga-amụba ekele na ịhụnanya m maka Jehova? Olee otú ihe ọmụma ahụ pụrụ isi nyere m aka igosipụta mmadụ ọhụrụ ahụ n’ụzọ zuru ezu karị? Olee otú nke a ga-esi nyere m aka imeziwanye n’ozi m?’
11 Àgwà nke Na-achọ Ozi Anyị Mma: Pọl gbara Taịtọs ume igosi onwe ya “ihe atụ nke ọrụ ọma.” Site n’igosi emebighị emebi n’ozizi ya, Taịtọs ga-enyere ndị ọzọ aka ‘ịchọ ozizi nke Onye nzọpụta anyị, Chineke, mma n’ihe nile.’ (Taịtọs 2:7, 10) Kwa afọ, anyị na-anata ihe ncheta obiọma banyere ihe mere àgwà nsọpụrụ Chineke ji dị oké mkpa mgbe anyị na-eme njem na-aga ma na-ala site ná mgbakọ, tinyekwara mgbe anyị nọ n’ebe e nyere anyị ụlọ na ná mgbakọ ahụ n’onwe ya. N’afọ gara aga anyị nụkwara okwu ụfọdụ na-ekpo obi ọkụ bụ́ ndị anyị ga-achọ iso unu kerịta.
12 Otu onye nwe ụlọ sịrị: “Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ mgbe nile inye Ndịàmà ebe obibi n’ihi na ha na-enwe ndidi ma na-ekwenye ekwenye, ha na-ejikwa nlezianya na-eleru ụmụ ha anya.” Otu onye na-eme ndekọ na họtel sịrị na ọ na-eme ka ọrụ “dị oké mfe mgbe Ndịàmà ahụ na-abata ma na-apụ na họtel ahụ n’ihi na, n’agbanyeghị ichere n’ahịrị, ha na-eme omume dị mma, na-enwe ndidi, ma na-aghọta mgbe nile.” Àgwà nke ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà ya na ha nọ n’otu họtel masịrị otu nwanyị nke ukwuu nke na o kwuru ka e wetara ya akwụkwọ ụfọdụ banyere nzukọ anyị.
13 N’aka nke ọzọ, e nwere ohere maka imeziwanye ihe n’akụkụ ụfọdụ. Anyị ga-achọ ịkọrọ unu ụfọdụ nchọpụta ndị e zitewooro Society. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kọrọ na nlebara anya ka ukwuu dị ụmụ Ndịàmà Jehova mkpa. A hụwo ụfọdụ ka ha na-agbagharị ma na-eme oké ụzụ n’ebe e nyere ha ụlọ, si otú a na-enye ndị ọbịa ndị ọzọ nsogbu. Ọ dị anyị mkpa ịzụ ụmụ anyị ịghọta na àgwà ndị Kraịst abụghị n’oge a kara aka. Ọ dịghị agwụsị mgbe anyị si n’ihe owuwu mgbakọ ahụ pụọ. Ọ ghaghị ịdịgide ruo hour 24 n’ụbọchị. Àgwà anyị n’ebe e nyere anyị ụlọ na n’okporo ámá kwesịrị ịbụ ihe nsọpụrụ dịkwa ka mgbe anyị na ụmụnna anyị na-anọdụ ala mgbe ihe omume na-aga n’ihu, n’ịbụ ndị Jehova ziri ihe.—Aịsa. 54:13; 1 Pita 2:12.
14 Ọ na-ewe mmefu dị ukwuu iji wuo ma lekọta ihe owuwu Ala Mgbakọ na ilekọta okwu ndị ọzọ dị iche. Onyinye afọ ofufo anyị na-ahụ maka mmefu ndị a. Otu nwanna nwanyị nwere ụmụ nọ n’afọ iri na ụma ji ego dị nta bịa mgbakọ. Otú ọ dị, ya na ụmụ ya nyekwara obere onyinye. Ihe onye ọ bụla kpebiri ime n’akụkụ a bụ okwu dịịrị onwe onye, ma anyị maara na unu nwere mmasị n’ihe ncheta ndị dị otú ahụ.—Ọrụ 20:35; 2 Kọr. 9:7.
15 A Na-amata Anyị Site n’Ụzọ Anyị Si Eji Ejiji: Ụzọ anyị si eji ejiji na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere anyị na banyere mmetụta anyị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’afọ iri na ụma na ọtụtụ ndị toworo eto bụ ndị ụdị uwe na-ewu ewu, na-adịghị mma gbara gburugburu n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ha na-arụ ọrụ. Kwa afọ ụdị uwe dị iche iche na-aghọkwu ihe gabigara ókè, ọbụna na-awụ ibubo n’ahụ. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ndị ọgbọ anyị bụ ndị ụwa pụrụ inweta anyị n’ụzọ dị mfe iji ejiji dị ka ha si eji. Ọtụtụ ụdị ekwesịghị ekwesị iyi ná nzukọ maka ofufe. Otu ozi e nwetara mgbe otu n’ime mgbakọ afọ gara aga gasịrị gosiri ekele maka usoro ihe omume ahụ ma gbakwụnye, sị: “O juru m anya ihe mere ọtụtụ ụmụ agbọghọ ji yiri uwe ndị na-agbadaghị agbada, uwe olu ya gbadara agbada, na uwe a gbawara ruo n’apata ụkwụ.” N’ezie anyị nile chọrọ iji ejiji n’ụzọ nke kwesịrị ndị ozi bụ́ ndị Kraịst ma ná mgbakọ na n’oge nnọkọ ntụrụndụ mgbe usoro ihe omume gasịrị. Ọ dị mma anyị ịdị na-atụgharị uche mgbe nile na ndụmọdụ Pọl onyeozi nye ndị Kraịst ịbụ ndị e ji “uwe a haziri nke ọma, ya na ịdị mma n’anya na uche zuru okè” chọọ mma.—1 Tim. 2:9, NW.
16 Ònye ga-ekpebi uwe dị mma n’anya, “a haziri nke ọma”? Ịdị mma n’anya pụtara “awaghị anya ma ọ bụ isi ọnwụ.” Akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwakwa ịdị mma n’anya dị ka “adịghị okomoko.” Ma Society ma ndị okenye agaghịkwa esetịpụ ụkpụrụ nduzi banyere uwe ma ọ bụ ejiji. Ọbụna otú ahụ, ó kwesịghị ido onye Kraịst anya, bụ́ ụdị uwe ndị na-adịghị mma n’anya? (Tụlee Ndị Filipaị 1:10.) Ejiji na uwe anyị ekwesịghị ịdọta mmasị n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Anyị aghaghị ịdị ọgọ n’ọdịdị, ọ bụghị dị ka ndị ụwa ma ọ bụ n’ụzọ na-adịghị mma n’anya. Dị ka ndị ozi nke ozi ọma, anyị ịbụ ndị yiri uwe ma jie ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’oge anyị nọ n’obodo ukwu maka mgbakọ distrikti na-ewetara Jehova nsọpụrụ ma na-ewetara nzukọ ahụ aha ọma. N’ihi ya, ndị mụrụ ụmụ ga-esetịpụ ihe nlereanya, mgbe ahụkwa jide n’aka na ụmụ ha jiri ejiji nke ọma maka ihe omume ahụ. Ndị okenye ga-esetịpụ ezi ihe nlereanya ma dị njikere inye ndụmọdụ obiọma ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.
17 Kamera na Ihe Ndị Na-enweta Ihe na Tepu: A ga-ekwe ka e jiri kamera na ngwá ọrụ ndị ọzọ na-enweta ihe na tepu mee ihe, ọ bụrụhaala na anyị ga-echebara ndị ọzọ na-ege ntị echiche. Ọ bụrụ na anyị na-agagharị na-ese foto mgbe ihe omume na-aga n’ihu, ọ bụghị nanị na anyị ga-adọpụ uche ndị ọzọ bụ́ ndị na-agbalị ige ntị kama ụfọdụ n’usoro ihe omume ahụ ga-efunahụkwa anyị n’onwe anyị. Anyị na-eritekarị uru ná mgbakọ site n’ịṅa ndị ọkà okwu ntị nke ọma na ime ndetu ndị dị nta. Anyị pụrụ inwetara nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị na-adịghị apụta èzí ihe na tepu; otú ọ dị, maka anyị iji ya mee ihe, anyị pụrụ ịchọpụta ozugbo anyị lọtara ụlọ na mgbe e nwetasịrị ọtụtụ hour nke usoro ihe omume ahụ na tepu, anyị agaghị enwe oge ịtụleghachi ọtụtụ n’ime ihe anyị nwetara na tepu. A gaghị akwụnye ụdị ihe ọ bụla na-enweta ihe na tepu n’usoro eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu, ngwá ọrụ ndị ahụ ekwesịghịkwa ịnọchi ụzọ nkebi ma ọ bụ ebe ndị mmadụ si aga, ma ọ bụ ịnọchi ndị ọzọ ihu.
18 Ịnọdụ Ala: Anyị nọgidere na-achọpụta mmeziwanye ihe n’okwu banyere inweta ebe ịnọdụ ala. N’afọ gara aga, ihe ka ọtụtụ n’ime unu gbasoro ntụzi ahụ bụ́: A PỤRỤ INWETARA NANỊ NDỊ EZINỤLỌ GỊ OCHE, TINYERE ONYE Ọ BỤLA NKE PỤRỤ ISO GỊ JEE N’ỤGBỌALA GỊ. Eleghị anya ị hụrụ ya dị ka ihe nrụgide dị ala karị n’ihi na ọtụtụ na-agbaso ntụzi ndị a doro anya. Ọbụna nke ka mkpa, nkwekọ gị masịrị Jehova na ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi,’ bụ́ onye na-enye nri ime mmụọ.—Mat. 24:45.
19 Tiketi Nri: Anyị na-agba ume ka e buru ụzọ zụta tiketi nri tupu mgbakọ ahụ. Gịnị bụ nzube nke a? Ibu ụzọ ree tiketi nri na-eme ka mgbakọ ahụ nweta ego maka ịzụta ihe oriri ndị bụ isi tupu oge eruo. Ọ dị mkpa ịzụta osikapa, ji, garị, ehi, ọkụkọ, àgwà, akwụkwọ nri, na ihe oriri ndị ọzọ tupu oge eruo iji hụ na ha dị maka usoro mgbakọ distrikti ahụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ọnụ ahịa ihe oriri na-arị elu nke ukwuu ka oge ezumike na-abịaru nso na December. Ọ dị mkpa ka onye nlekọta ozi ihe oriri maka mgbakọ dị iche iche zụta ihe oriri n’ebe o buru ibu tupu oge eruo, ego ọ ga-eji mee nke a dịkwa ya mkpa. Ọ na-esiri Society ike inye ego zuru ezu maka nzube a ebe a na-enwe ọtụtụ mgbakọ ná mba nke a ugbu a. Ọ bụ nke ahụ mere anyị ji na-agba unu ume ịzụta tiketi nri site n’aka Kọmitii Mgbakọ tupu oge eruo. Mgbe ahụ a ga-eji ego ndị ahụ mee ihe maka ịzụta ihe oriri ndị a tupu oge eruo. N’ezie unu ga-erite uru n’ọnụ ego dị ala maka ihe oriri ga-adị na kafiteria na refreshmenti ná mgbakọ ndị ahụ, ebe ọ bụ na a pụrụ ịzụta ihe oriri mgbe ha dị ọnụ ala.
20 N’ihi ya, anyị na-agba onye isi oche ndị nlekọta na odeakwụkwọ ọgbakọ ọ bụla ume ime ndokwa maka ịzụta tiketi nri tupu oge eruo. A pụrụ isite n’onye nhazi mgbakọ n’ọgbakọ nke ọ bụla mee nke a. Ozugbo a tụlesịrị isiokwu a na September, ndị nkwusa pụrụ iweta ego maka tiketi ndị ahụ. E kwesịrị idebe ihe ndepụta. Mgbe a zụtara tiketi ndị ahụ site n’aka Kọmitii Mgbakọ, a ga-enyefe ha n’aka ndị nkwusa bụ́ ndị kwụworo ụgwọ maka ha. Ndị nkwusa kwesịrị imeso ha dị ka ego ma jiri nlezianya lekọta ha. A pụrụ iji tiketi nri ndị ahụ mee ihe na kafiteria na refreshmenti ozugbo ndị nkwusa bịarutere ná mgbakọ. A na-agba ndị nkwusa nile ume ịzụta tiketi nri tupu oge eruo, bụ́ ndị a ga-eji mee ihe ma ọ dịkarịa ala ụbọchị abụọ ndị mbụ nke mgbakọ ahụ. Ime otú ahụ ga-enye aka n’ịzụta ihe oriri n’ebe o buru ibu tupu mgbakọ amalite.
21 Onyinye Ihe Oriri: Anyị na-agba ume ka a na-enye onyinye ihe oriri maka mgbakọ distrikti dị iche iche. Nke a pụrụ ịgụnye ụdị dị iche iche nke ihe oriri e ji eme ihe, dị ka ji, osikapa, garị, ogede, àgwà, ose, tomato, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, ehi, ọkụkọ, na ụdị ihe oriri ndị ọzọ ị ga-achọ inye. Nke a bụ ụzọ dị mma isi nye ọrụ Alaeze ahụ nkwado. Ngalaba Ozi Ihe Oriri ji ihe oriri ndị a nile na-eme ihe. Onyinye gị nke ihe oriri ndị dị otú ahụ ga-enyere mgbakọ aka ịkwụ ụgwọ mmefu ya dị iche iche ma nye ndị nọ n’ozi ọsụ ụzọ nri n’efu.
22 Ozugbo a tụlere isiokwu nke a, e kwesịrị ime ndokwa n’ọgbakọ maka inye onyinye nke ihe oriri ndị dị otú ahụ na iwega ha n’Ala Mgbakọ. Otú ọ dị, e kwesịrị iweta ihe oriri ndị pụrụ imebi emebi n’oge kwesịrị ekwesị ka ha ghara imebi tupu mgbakọ nke mbụ. Ọ bụrụ na Kọmitii Mgbakọ enyebeghị unu ntụziaka metụtara nke a banyere mgbe a ga-eweta ihe oriri ndị ahụ, ị pụrụ ịkpọtụrụ ha. A pụrụ iwega ihe oriri ọ bụla ndị nkwusa wetara mgbe ha na-aga mgbakọ ozugbo n’ebe ndebe nri.
23 Anyị na-achọkwa ịgba unu ume ịnọgide na-akwado ndokwa isi nri ná mgbakọ. Ihe a na-eme abụrụwo ịkpọ ọgbakọ ndị na-agaghị abịa mgbakọ nke ahụ òkù isi nri. Mgbe a kpọrọ ọgbakọ unu maka ibu ọrụ a, ndị nkwusa nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịgbalị inye nkwado zuru ezu.
24 Tụkwasị na nri e siri a ga-ewere na kafiteria na refreshmenti, ọ bụrụ na ndị nkwusa achọọ iri nri ha si n’ụlọ weta n’ime ụlọ mgbakọ n’oge ezumike, ha nwere ohere ime otú ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na ụfọdụ chọrọ ịzụrụ na kafiteria ma ọ bụ na refreshmenti ma tinye ihe oriri ahụ n’ime ihe ntinye nri nke ha iji rie ya n’ime ụlọ mgbakọ, a pụrụ inye ohere maka nke ahụ. Ihe dị mkpa bụ na onye ọ bụla kwesịrị ime ka ebe nile dị ọcha mgbe e risịrị nri. Nhazi mgbakọ ga-eme ka e nwee nkata ihe mkpofu zuru ezu maka ndị nkwusa ịtụnye ihe mkpofu ha, e kwesịkwara inwe ihe zuru ezu e ji edebe ihe ọcha. Ọ bụrụ na obere igbe ndị e ji echekwa nri dị mkpa, a na-anakwere ha ma ọ bụrụ na ha ga-abanye n’okpuru oche gị. Otú ọ dị, e kwesịghị ibubata ụdị nnukwu igbe nchekwa nri ndị e ji eme mkpapụ ntụrụndụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ime ụlọ mgbakọ ahụ. E kwesịrị izere iri nri ma ọ bụ iri nri ratụ ratụ mgbe usoro ihe omume na-aga n’ihu. Nke a ga-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka nri ime mmụọ a na-ekesa.
25 N’oge na-adịghị anya nke mbụ ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” ga-amalite. Ì mesịwo nkwadebe gị iji wee gaa, ị̀ dịkwa njikere ugbu a ịnụ ụtọ ụbọchị atọ nke mmekọrịta obi ụtọ na nke ezi ihe ime mmụọ? Ọ bụ ekpere anyị si n’ezi obi ka Jehova gọzie mgbalị ndị unu na-eme ịga mgbakọ nke afọ a.
Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ncheta Maka Mgbakọ Distrikti
Baptism: Ndị chọrọ ka e mee ha baptism kwesịrị ịnọ n’oche ha n’akụkụ ahụ e wepụtara iche tupu usoro ihe omume amalite n’ụtụtụ Saturday. A hụwo na ụfọdụ na-eyi uwe na-enweghị nkwanye ùgwù na ndị na-ekwesịghị ihe omume ahụ. Onye ọ bụla na-eme atụmatụ ka e mee ya baptism kwesịrị iweta ákwà ịsa ahụ dị mma n’anya na ákwà nhicha ahụ. Ndị okenye ọgbakọ na-eso ndị ahụ chọrọ ka e mee ha baptism atụleghachi ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ Ozi Anyị ga-achọ ijide n’aka na onye nke ọ bụla ghọtara isi ihe ndị a. Mgbe okwu baptism na ekpere nke onye ọkà okwu ahụ gasịrị, onye isi oche nnọkọ ahụ ga-enye ndị ahụ na-achọ ka e mee ha baptism ntụziaka dị mkpirikpi ma mgbe ahụ kpọọ abụ a ga-abụ. Mgbe ahịrị nke ikpeazụ gasịrị, ndị atendantị ga-eduzi ndị ahụ chọrọ ka e mee ha baptism gaa n’ebe a ga-emikpu ha ná mmiri. Ebe baptism dị ka ihe àmà nke nrara mmadụ raara onwe ya nye bụ ihe onwe onye dị n’etiti onye ahụ na Jehova, e nweghị ohere ọ bụla maka ihe ahụ a na-akpọ mmekọ baptism nke mmadụ abụọ ma ọ bụ karị a na-eme baptism na-amakụ onwe ha ma ọ bụ jikọọ aka mgbe a na-eme ha baptism. Biko rịba ama na e nweghị iwu Akwụkwọ Nsọ maka ụmụnna nwanyị ikpuchi ma ọ bụ ighebe isi ha oghe mgbe a na-eme ha baptism. A ga-anabatacha ha abụọ.
Kaadị Baajị: Biko yiri kaadị baajị 1996 ná mgbakọ ahụ nakwa mgbe ị na-eje ma ọ bụ na-ala site n’ogige mgbakọ ahụ. Nke a na-enyekarị anyị ohere ịgba ezi àmà mgbe anyị nọ na njem. E kwesịrị inweta kaadị baajị ahụ na ọbọ ha site n’ọgbakọ gị, ebe ọ bụ na a gaghị enwe ha ná mgbakọ. Echerela ruo ụbọchị ole na ole tupu mgbakọ ahụ iji jụọ ase maka kaadị gị na ezinụlọ gị. Cheta iji kaadị Advance Medical Directive/Release gị nke i ji eme ihe ugbu a.
Ụlọ Obibi: Anyị na-arịọ ọzọ maka nkwado nke onye ọ bụla n’ihe banyere ụlọ obibi nke mgbakọ ahụ nyere. Ọ bụrụ na anyị agaa Society n’azụ ma nweta ụlọ obibi mgbakọ nwetawororị, anyị na-emebi ihe dị ukwuu n’ọrụ siri ike nke ụmụnna anyị rụworo, bụ́ ndị na-enweta ha n’ọnụ ego ka mma. Ọ BỤRỤ NA I NWEE NSOGBU N’IHE BANYERE EBE E NYERE GỊ ỤLỌ, biko alala azụ n’ime ka onye nlekọta Ngalaba Ụlọ Obibi ná mgbakọ ahụ mara ka o wee nwee ike inyere gị aka idozi okwu ahụ ozugbo. Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e zigara fọm Room Request maka Mkpa Pụrụ Iche n’oge n’adres mgbakọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịkagbu ụlọ e kenyere gị site ná ndokwa nke mkpa pụrụ iche, i kwesịrị ime ka ma onye nwe ụlọ ma Ngalaba Ụlọ Obibi mgbakọ mara ozugbo ka e wee nwee ike inye onye ọzọ ụlọ ahụ.
Ozi Afọ Ofufo: Ị̀ pụrụ isetịpụ oge ụfọdụ ná mgbakọ ahụ iji nye aka n’otu n’ime ngalaba ọrụ dị iche iche? Ijere ụmụnna anyị ozi, ọ bụrụgodị nanị ruo hour ole na ole, pụrụ inye aka nke ukwuu ma weta ọ̀tụ̀tụ̀ afọ ojuju dị mma. Ọ bụrụ na ị pụrụ inye aka, biko jee ná Ngalaba Ozi Afọ Ofufo ná mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 16 pụkwara inye aka dị mma site n’ịrụ ọrụ n’okpuru nduzi nke nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye ọzọ toworo ogo mmadụ.
Okwu Ịdọ Aka ná ntị: Mụrụ anya banyere ihe ndị pụrụ ịbụ nsogbu iji zere ihe isi ike ndị na-enweghị isi. Ọtụtụ mgbe ndị ohi na ajọ mmadụ ndị ọzọ na-aghọgbu ndị si esi bịa. Jide n’aka na a gbachiri ụgbọala gị agbachi mgbe nile, ahapụkwala ihe ọ bụla n’ebe a ga-ahụ ya anya ịnwa mmadụ ịwaba n’ike. Ọ bụ ebe e nwere nnọkọ buru ibu ka ndị ohi na ndị aka n’akpa na-enweta uru ha kasịnụ. Ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ịhapụ ihe ọ bụla bara uru n’elu oche gị. Ị pụghị ijide n’aka na onye ọ bụla nọ gị gburugburu bụ onye Kraịst. N’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ihe na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa? A natawo akụkọ dị iche iche banyere ụfọdụ ndị si n’èzí ịnwa ịrara ụmụaka pụọ. DEBE ỤMỤAKA GỊ N’EBE Ị GA NA-AHỤ HA MGBE NILE.