Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998
1 Ilu 10:29 na-echetara anyị na “ebe siri ike . . . ka ụzọ Jehova bụ.” Lee nnọọ isiokwu kwesịrị ekwesị mgbakọ nke afọ a nwere—“Ụzọ Ndụ nke Chineke”! Olee nnọọ otú a ga-esi kọwapụta isiokwu a n’usoro ihe omume ụbọchị atọ ahụ dum? Anyị nile ji oké atụmanya na-elepụ anya n’ihu n’ihe nọ na-echere anyị. A ga-ekwupụtakwa isi ihe ndị dị mkpa.
2 Ndị ozi ala ọzọ, ndị ozi nke mba nile, ma ọ bụ ndị ọzọ na-eje ozi ná mba ọzọ pụrụ ịbịa mgbakọ unu. Ikekwe ị ga-ahụ ụfọdụ n’ime ndị ọbịa a. Usoro ihe omume mgbakọ ahụ ga-akọ otú Jehova si na-agọzi ọrụ ahụ n’ókèala dị iche iche.
3 O Kwesịrị Mgbalị Ya Ịga: Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị n’Africa enwewo ihe isi ike n’ihi agha na ọgba aghara na-eme n’akụkụ ụfọdụ na kọntinent ahụ. Ha na-ewere mgbakọ ndị Jehova dị ka ihe ji ha ndụ. Ụfọdụ aghaghị iji ụkwụ mee ogologo njem iji gaa mgbakọ, n’agbanyeghị nke ahụ ha agaghị echetụ n’echiche ịhapụ ịga nke ọ bụla. Otu nwanna nwoke dị afọ 73 na Democratic Republic of Congo (nke bụbu Zaire) jiri ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita 450 iji gaa mgbakọ. Ọ garuru mgbe ụbọchị 16 gasịrị, ụkwụ ya zachaa aza, ma o nwere obi ụtọ ịnọ n’ebe ahụ. Mgbe mgbakọ ahụ mechisịrị, n’inwe oké ọṅụ na n’ịbụ onye e wusiri ike n’ime mmụọ, o ji ụkwụ laa. Nke a abụwo ihe ọ na-eme eri afọ!
4 Na Mozambique otu onye nlekọta distrikti na nwunye ya ji ụkwụ rịa otu ugwu dị elu ma gafere otu ógbè yiri ọzara iji gaa mgbakọ sekit. O were ha hour 45 iji gaa njem ahụ dị kilomita 90. Ndị nile garanụ nwetara agbamume dị ukwuu site n’ihe nlereanya ọma nke di na nwunye a. Ọtụtụ ezinụlọ garanụ emewokwa mgbalị ndị yiri nke ahụ iji gaa. Onye nlekọta distrikti ahụ kọrọ na ụmụnna ụfọdụ, gụnyere otu nke dị afọ 60, ji ụkwụ gaa kilomita 200!
5 Ị̀ kpakọbawo ego moto a chọrọ maka iji jee mgbakọ na mmefu ndị ọzọ ka ndị nile nọ n’ezinụlọ nwee ike ije? Ọzọkwa, ì sorowo onye were gị n’ọrụ mee ndokwa maka inye gị ohere iji gazuo ụbọchị atọ dum nke mgbakọ ahụ? Ndị nne na nna nwere ụmụaka na-aga akwụkwọ bụ́ ndị ga-aga otu n’ime mgbakọ ndị ahụ mgbe a na-emechibeghị akwụkwọ kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa ndị nkụzi na ụmụaka ahụ agaghị anọ n’ụlọ akwụkwọ na Friday n’ihi akụkụ a dị mkpa nke ofufe okpukpe ha. Olee ebe a ga-enwe mgbakọ nke kasị dịrị gị nso? Odeakwụkwọ ọgbakọ unu ga-agwala unu ugbu a ihe nile metụtara ọgbakọ unu.
6 Usoro Ihe Omume Ụbọchị Atọ: N’afọ a a ga-eme ihe omume ná mgbakọ 106 na Nigeria. Tụkwasị n’Igbo, a ga-enwe mgbakọ n’Abụa, Bekee, Edo, Efịk, Gokana, Gun, Hausa, Ijaw, Ishan, Isoko, Kana, Tiv, Urhobo, Ụdị Asụsụ Ogbi nke America, na Yoruba.
7 Ihe omume ga-amalite na Friday n’elekere 9:20 nke ụtụtụ ma mechie na Sunday n’ihe dị ka n’elekere 3:30 nke uhuruchi. Na Saturday na Sunday, ihe omume ga-amalite n’elekere 9:00 nke ụtụtụ.
8 Ka anyị na-aga ma na-ala site ná mgbakọ, anyị kwesịrị ịchọ ohere iji gbaa àmà mberede. Ndị na-ere mmanụ ụgbọala, ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa, ndị nnakọta ụtụ n’ụzọ awara awara, ndị na-arụ ọrụ na họtel, na ndị na-eke nri pụrụ inwe mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Jikere maka nke a site n’iwere trakti, magazin ndị ọhụrụ, broshuọ, ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ ka i wee nwee ike jiri ohere ndị dapụtaranụ gbaara ndị ọ pụrụ ịbụ na a gaghị eji ozi ọma ahụ jekwuru àmà.—2 Tim. 3:17.
9 “Lezienụ Anya Otú Unu Si Anụ”: Ndị gara mgbakọ ga-eji amamihe ṅaa ntị n’okwu ndụmọdụ dị na Luk 8:18. A na-agba mmadụ nile ume iweta Bible na akwụkwọ abụ na akwụkwọ ndetu ihe. Gee ntị nke ọma maka isi ihe dị n’okwu nke ọ bụla, detuokwa ihe ndị dị mkpirikpi. Jụọ onwe gị otú ị pụrụ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe n’onwe gị. N’anyasị ọ bụla nke mgbakọ ahụ, tupu ị lakpuo ụra, gịnị ma ị tụleghachi ihe ndị i deturu ma nyochaa otú ị na-agbasochiru ụzọ ndụ nke Jehova anya.—Ilu 4:10-13.
10 A chọpụtawo na n’oge nnọkọ na-aga n’ihu, ụfọdụ na-ahapụ ụlọ mgbakọ ma nọrọ n’ime ụgbọala ha, ihe omume ahụ sikwa otú a na-efunahụ ha. A hụwo ndị ọzọ ka ha na-agagharị mgbe ha kwesịrị ịnọ n’ụlọ mgbakọ ma na-ege ntị. A hụwo ìgwè ndị na-eto eto ka ha si n’ebe a na-enwe mgbakọ na-apụ n’etiti ehihie. Ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova n’oge gara aga mere mmehie ndị dị oké njọ ná ndụ ha n’ihi na ha egeghị ntị nke ọma n’ihe ncheta Jehova. N’ezie anyị kwesịrị izere ihie ụzọ yiri nke ahụ. (2 Eze 17:13-15) “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” akwadebewo ntụziaka dị anyị nile mkpa. Ọ dị mkpa karịsịa ka anyị ‘ṅabiga ntị ókè karị n’ihe a nụrụ’ n’oge nnọkọ nke ọ bụla nke usoro ihe omume ụbọchị atọ nke mgbakọ ahụ. A ga-ewepụta ihe ga-adọrọ mmasị anyị n’ụzọ pụrụ iche kwa ụbọchị, gụnyere ihe ọmụma ndị ga-enwe mmetụta dị mma n’ezie n’ụzọ ndụ anyị n’ọdịnihu. Site n’anyị ịṅa ntị na iji ihe Jehova na-enye n’ụzọ ime mmụọ ná mgbakọ ndị na-abịanụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu, a ga-eme ka olileanya anyị guzosie ike, ka e wee “ghara ibupụ anyị” n’ụzọ ndụ nke Chineke.—Mat. 24:45; Hib. 2:1.
11 Ejiji nke Na-asọpụrụ Jehova: N’oge ndị a dị oké egwu, ọ dị anyị mkpa ịṅabiga ntị ókè karị ka mmụọ nke ụwa a wee ghara irikpu anyị. (1 Kọr. 2:12) Uwe na ejiji anyị kwesịrị ịdị mma, o kwesịkwara igosipụta ùgwù nke Chineke anyị na-efe. (1 Tim. 2:9, 10) A chọghị uwe dara oké ọnụ iji soro ná ndị ‘na-achọ ozizi nke Onye nzọpụta anyị Chineke mma.’ (Taịtọs 2:10) Rịba ama ndụmọdụ magburu onwe ya, nke bakwara uru, sitere n’Akwụkwọ Nsọ, nke dị na peji nke 17 na 18 ná mbipụta Ụlọ Nche nke June 15, 1997, paragraf nke 14-18. Eledala àmà dị ike anyị pụrụ ịgba site n’iji ejiji n’ụzọ na-ewetara Jehova nsọpụrụ anya mgbe ọ bụla.
12 Otu Onyeàmà dị afọ 16 kọrọ na mgbe ya na nwanne ya nwoke gara n’otu ụlọ nri n’otu uhuruchi mgbe e mechisịrị nnọkọ, ha chọpụtara na ụfọdụ n’ime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ n’ebe ahụ agbanweela yiri uwe na-ekwesịghị ekwesị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị bịara n’ụlọ nri ahụ meghachiri omume n’ụzọ dị mma mgbe ha hụrụ Ndịàmà jiri ejiji nke ọma ma yiri kaadị baaji ha. Nke a meghere ụzọ maka ịgbara ụfọdụ n’ime ndị ahụ bịara n’ụlọ nri ahụ àmà.
13 Àgwà nke Na-eto Jehova: Anyị maara na àgwà ndị Kraịst anyị pụrụ inwe mmetụta n’otú ndị ọzọ si na-ele ezi ofufe anya. Ya mere, anyị kwesịrị ịdị na-ebi obi mgbe nile n’ụzọ kwesịrị ozi ọma ahụ, nke na-ewetakwara Jehova otuto.—Fil. 1:27.
14 N’afọ gara aga, e nwere mgbakọ distrikti nke mbụ ya n’ebe ugwu Angola. N’ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ, e zigara ndị uwe ojii abụọ nọ n’ógbè ahụ n’ebe ahụ iji hụ na e nwere udo. Ha nọchara ụbọchị ahụ dum. Mgbe e mechiri n’ụbọchị ahụ, ha kwupụtara ịja mma ha maka ihe ha nụworo na maka àgwà ịdị n’usoro ha hụrụ. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Gịnị mere e ji zite anyị n’ebe a? Anyị maara na Ndịàmà Jehova na-adị n’udo ná nnọkọ ha.”
15 Otu onye so n’otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’otu mba Africa gbalagara Europe mgbe e gbusịrị ndị ọzọ nile so n’òtù ya. O nwetara ọtụtụ nsogbu n’onwe ya ma nwee oké nkụda obi. O mesịrị nakwere ọmụmụ Bible. Mgbe ọ na-aga mgbakọ distrikti mbụ ya, o nwere mmasị na ndị si n’ebe dị iche iche na-ezukọta ọnụ n’udo na n’ịdị n’otu. O kwenyesiri ike na ya achọtawo eziokwu ahụ, o kpebikwara ná mgbakọ ahụ igbubisị njikọ nile nke ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ka e mesịrị, e mere ya baptism, ugbu a kwa ya na ụmụ ya na-ejere Jehova ozi.
16 Olee otú àgwà anyị ná mgbakọ nke afọ a ga-esi metụta ndị pụrụ ịdị na-abịa mgbakọ nke mbụ ha? Hà ga-ahụ na e nwere mmụọ imekọ ihe ọnụ mgbe anyị na-arụkọta ọrụ ọnụ dị ka ndị ọrụ afọ ofufo? Hà ga-enwe mmasị n’ịdị ọcha nke gburugburu ebe anyị nọ na ha ịhụ na tupu anyị ahapụ ebe ahụ, na anyị na ụmụ anyị na-atụtụkọta ihe mkpofu ọ bụla pụrụ ịtụkọbaworị n’akụkụ oche anyị? Hà ga-ahụ ezi àgwà anyị ka anyị na-aga ma na-ala site n’ebe e nyere anyị ụlọ na n’ebe ahụ a na-enwe mgbakọ? Hà ga-ahụ na dị ka ndị nne na nna, na anyị na-eleru ụmụ anyị anya mgbe nile? Ka anyị jide n’aka na anyị nyere ndị nile na-ahụ anyị mmetụta kasị mma dị ka o kwere omume.
17 Inweta Ego Maka Mmefu Mgbakọ: Society anọwo mgbe nile na-enwe ụkpụrụ bụ́ “oche bụ n’efu, a dịghị anakọta ụtụ” ná mgbakọ. Mgbe ahụ, olee otú a ga-esi nweta ego maka mmefu mgbakọ? Site n’onyinye mmesapụ aka nke ndị bịaranụ. Anyị ji n’aka na unu ga-egosipụta mmụọ mmesapụ aka yiri nke ahụ ndị ohu Chineke gosipụtara n’oge gara aga n’iṅomi Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. (2 Kọr. 8:7) A na-elezi anya nke ọma iji hụ na e chebere onyinye nile, dekọọ ha, ma jiri ha mee ihe e zubere iji ha mee. E kwesịrị idenye aha “Watch Tower” dị ka onye a ga-akwụ ụgwọ n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e ji nye onyinye.
18 Ịnọdụ Ala: Ntụzi ndị e nyeworo kemgbe ọtụtụ afọ ga-anọgide na-adị irè, ya bụ, A PỤRỤ ỊCHỌTA OCHE NANỊ MAKA NDỊ EZINỤLỌ GỊ NA NDỊ I BU N’ỤGBỌALA GỊ. Ọ bụwo ihe dị mma ịhụ na e mewo nke ọma karị n’okwu a, nke a amụbawokwa mmụọ ịhụnanya a na-egosipụta ná mgbakọ. N’ebe ka n’ọnụ ọgụgụ, a pụrụ iru n’oche ụfọdụ n’ụzọ dị mfe karịa ndị ọzọ. Biko gosi ichebara ndị ọzọ echiche ma hapụ oche ndị na-eme ka ahụ ruo mmadụ ala karị maka ndị agadi na ndị ọzọ ọnọdụ ha chọrọ ha. Cheta na ‘ịhụnanya adịghị achọ ihe nke aka ya.’—1 Kọr. 13:4, 5; Fil. 2:4.
19 Kamera, Camcorder, na Ígwè Tepụ: A pụrụ iji kamera na ngwá ọrụ e ji enweta ihe na tepụ mee ihe ná mgbakọ. Otú ọ dị, gị iji ha eme ihe ekwesịghị ịdọpụ uche ndị ọzọ. Ịdị na-agagharị na-ese foto mgbe nnọkọ na-aga n’ihu ga-enye ndị ọzọ nsogbu bụ́ ndị na-agbalị itinye uche n’ihe omume ahụ. A gaghị akwụnye ụdị ihe ọ bụla e ji enweta ihe na tepụ n’usoro eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu, ngwá ọrụ a ekwesịghịkwa ịnọchi ụzọ nkebi, ụzọ ndị mmadụ si aga, ma ọ bụ ịnọchi ndị ọzọ ihu.
20 Ebe Ịnara Ọgwụ: Ngalaba Ebe Ịnara Ọgwụ bụ maka ọnọdụ mberede nanị. Biko weta aspirin, ihe na-enye aka ịgbari nri, bandeeji, pin, na ihe ndị yiri ha nke gị, ebe a na-agaghị ekesa ihe ndị dị otú ahụ ná mgbakọ. Onye ọ bụla a maara pụrụ inwe ihe ọdịdọ, oké ụkọ shuga n’ọbara, nsogbu obi, na ihe ndị ọzọ, kwesịrị iji ọgwụ dị mkpa bịa. Onye òtù ezinụlọ ha ma ọ bụ onye òtù ọgbakọ nke ghọtara ọnọdụ ha, nke nwekwara ike ime ihe n’ọnọdụ mberede kwesịrị isoro ha nọrọ, adịghị ama ama o mee. E nwewo nsogbu ná mgbakọ mgbe a hapụrụ ndị nwere nsogbu ahụ ike na-adịte aka ịnọ nanị ha, ha daakwa ọrịa. Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nwere mkpa ahụ ike pụrụ iche enweghị ndị òtù ezinụlọ pụrụ inyere ha aka, ọ ga-adị mkpa ịgwa ndị okenye banyere ọnọdụ ahụ, ha kwesịkwara ime ndokwa ndị dị mkpa iji nye aka. Ọ gaghị ekwe omume ime ndokwa ná mgbakọ ahụ ka e nweta ọnụ ụlọ pụrụ iche maka ndị nwere nrịanrịa ọ bụ gburugburu ebe obibi na-akpata ma ọ bụ ndị nwere ihe ahụ ha na-adịghị anabata.
21 Ihe Oriri ná Mgbakọ Ahụ: Onye ọ bụla bịaranụ kwesịrị iji ihe oriri nke ya bịa kama ịhapụ ihe owuwu ahụ n’oge ezumike ehihie na-adị mkpirikpi ije zụrụ ihe n’èzí. Nri mgbadume dị mfe, nke na-edozi ahụ, nke dịkwa mfe ibugharị ga-ezu ma eleghị anya. Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1997, paragraf nke 18, na-enyetụ echiche nke ihe ndị a ga-eweta. E nyeghị ohere iji arịa ndị e ji enyo mee na ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya bịa n’ihe owuwu mgbakọ. Igbe nchekwa nri ma ọ bụ akpa aghaghị ịdị nnọọ ntakịrị iji banye n’okpuru oche gị. A hụwo ụfọdụ ndị na-ege ntị ka ha na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Nke a na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ihe omume ahụ.
22 Lee otú obi si dị anyị ụtọ na Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998 ga-amalite n’oge na-adịghị anya! Ì mechaala ndokwa iji gaa? Gaa nke ọma ma laghachi bụrụ onye nwere ume ọhụrụ, na-ekpebisi ike ịga n’ihu n’ozi dị oké ọnụ ahịa nke Jehova na ịnọgide na-agbaso ụzọ ndụ nke Chineke maka ngọzi ebighị ebi gị.
Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ncheta Maka Mgbakọ
▪ Baptism: Ndị a gaje ime baptism kwesịrị ịnọ n’akụkụ ahụ e wepụtara iche tupu ihe omume amalite n’ụtụtụ Saturday. Onye ọ bụla na-eme atụmatụ ka e mee ya baptism kwesịrị iweta ákwà ịsa ahụ kwesịrị ekwesị na ákwà nhicha ahụ. N’oge gara aga ụfọdụ eyiriwo uwe na-ekwesịghị ekwesị na nke meworo ka ihe omume ahụ ghara ịdị mkpa. Ndị okenye so ndị ahụ a gaje ime baptism na-atụleghachi ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ Ozi Anyị kwesịrị ijide n’aka na onye ọ bụla ghọtara isi ihe ndị a. Baptism ná ngosipụta nke nrara mmadụ raara onwe ya nye bụ okwu siri ike, nke dịịrị onye ahụ na Jehova. N’ihi ya, o kwesịghị ekwesị ka ndị a ga-eme baptism makụọ onwe ha ma ọ bụ jikọọ aka mgbe a na-eme ha baptism.
▪ Kaadị Baaji: Biko yiri kaadị baaji 1998 n’oge nile mgbe ị nọ n’obodo mgbakọ ahụ na mgbe ị na-eje ma ọ bụ na-ala site n’ebe ahụ. Nke a na-emepụtakarịrị anyị ohere ịgba ezi àmà. I kwesịrị inweta kaadị baaji ahụ na ọbọ ha site n’ọgbakọ gị, ebe ọ bụ na a gaghị enwe ha ná mgbakọ. Echerela ruo ụbọchị ole na ole tupu mgbakọ ahụ iji jụọ ase maka kaadị gị na ezinụlọ gị. Cheta iwere kaadị Advance Medical Directive/Release gị nke ọhụrụ.
▪ Ụlọ Obibi: Anyị na-arịọ ọzọ maka nkwado nke onye ọ bụla n’ihe banyere ụlọ obibi ndị mgbakọ ahụ nyere. Ọ bụrụ na anyị agaa ndokwa Society n’azụ ma nweta ụlọ obibi mgbakọ nwetawororịị, anyị na-emebi ihe dị ukwuu n’ọrụ siri ike nke ụmụnna anyị na-arụ, bụ́ ndị na-achọ inweta ha n’ọnụ ego ka mma. Ọ BỤRỤ NA I NWEE NSOGBU N’IHE BANYERE EBE E NYERE GỊ ỤLỌ, biko alala azụ n’ime ka onye nlekọta Ngalaba Ụlọ Obibi ná mgbakọ ahụ mara ka o wee nwee ike inyere gị aka idozi okwu ahụ ozugbo. Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e zigara fọm Special Needs Room Request n’adres mgbakọ kwesịrị ekwesị n’egbughị oge. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịhapụ ụlọ e kenyere gị ná ndokwa nke mkpa pụrụ iche, i kwesịrị ime ka ma onye nwe ụlọ ma Ngalaba Ụlọ Obibi mgbakọ mara ozugbo ka e wee nwee ike ikenye onye ọzọ ụlọ ahụ.
▪ Ozi Afọ Ofufo: Ị̀ pụrụ iwepụta oge ụfọdụ ná mgbakọ ahụ iji nye aka n’otu n’ime ngalaba ndị ahụ? Ijere ụmụnna gị ozi, ọ bụrụgodị nanị ruo hour ole na ole, ga-enye aka nke ukwuu ma na-eweta nnukwu afọ ojuju onwe onye. Ọ bụrụ na ị pụrụ inye aka, biko jee ná Ngalaba Ozi Afọ Ofufo ná mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 16 pụkwara inye aka nke ọma site n’ịrụ ọrụ n’okpuru nduzi nke nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye okenye ọzọ.
▪ Okwu Ịdọ Aka ná Ntị: Jide n’aka na ị gbachiri ụgbọala gị mgbe nile, ahapụkwala ihe ọ bụla n’ebe a ga-ahụ ya anya ịnwa mmadụ ịwaba n’ike. Ndị ohi na ndị aka n’akpa na-elekwasị anya n’ebe e nwere nnọkọ buru ibu. Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ịhapụ ihe ọ bụla bara uru n’elu oche gị. Ị pụghị ijide n’aka na onye ọ bụla nọ gị nso bụ onye Kraịst. N’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ihe na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa? A natawo akụkọ banyere mgbalị nke ụfọdụ ndị si n’èzí mere ịrara ụmụaka pụọ. DEBE ỤMỤAKA GỊ N’EBE Ị GA NA-AHỤ HA MGBE NILE.
Telivishọn na vidio ndị dị n’ọtụtụ họtel na-egosikarị ihe omume ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ekwela ka ụmụaka gbanye telivishọn dị n’ọnụ ụlọ ahụ ma e nweghị onye na-elekọta ha.