Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/98 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 9/98 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na September: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla nwere peji dị 192 n’ọnụ ego e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦20 ma e wezụga Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, na Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị. A pụrụ ịrịọ maka nsepụ ego maka ndị a dị ka e depụtara n’akwụkwọ ozi anyị. October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. November: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. December: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.

◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peji nke 21-23 nke Ụlọ Nche, April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.

◼ Ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị izite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi nile maka Ụlọ Nche na Teta!, tinyere ụtụ nke ha site n’ọgbakọ.

◼ Society adịghị ahụ maka ọda ndị nkwusa n’otu n’otu maka akwụkwọ. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara Society ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị n’inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ nke a na-emere ọda pụrụ iche.

◼ E mewo mgbanwe ndị a na-esonụ ‘n’Ebe A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti nke 1998,’ bụ́ nke pụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 1998. Biko onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ ọ bụla a gbanwere ebe ma ọ bụ ụbọchị ha ga-enwe mgbakọ kwesịrị ime ndokwa ka a maa ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ mgbe a natasịrị mbipụta nke a nke Ozi Alaeze Anyị.

November 6-8, 1998

Agbor 1 (Bekee) ME-11A; ME-15: J ruo Z; ME-18: Elovie, Emu Obodoeti, Emu Uno, na Umia.

November 20-22, 1998

Ibadan 3 (Yoruba) ọgbakọ ndị dị na Y-10 a na-ekenyereghị Ibadan 1; Y-12, 33.

December 4-6, 1998

Daluwon 6 (Yoruba) Y-8, 29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya