Aro
September bụ ọnwa ọzọ mgbe a ga-enyefe ọha na eze akwụkwọ ndị nwere peji dị 192 n’ọnụ ego e mere ka ha dị ala. Ị pụrụ ime ka ozi gị ka mma site n’ịmara akwụkwọ ndị ahụ dị n’ọgbakọ gị nke ọma. Mụrụ anya ịtụ aro ka ndị ị na-amụrụ Bible na ndị ọzọ na-egosi mmasị n’otu isiokwu kpọmkwem nweta ha. A pụrụ ịhụ ụzọ ndị dị irè nke isi chee ihe n’ihu mmadụ ná mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke June, July, na August. Ị ga-eme nke ọma ịtụleghachi ha iji rụpụta ihe ndị kasị mma n’inyefe akwụkwọ.