Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onye Nlekọta Ije Ozi
1 Onye nlekọta ije ozi nwere nnukwu mmasị n’ihe nile metụtara ọganihu nke ọrụ izisa ozi ọma n’ókèala e kenyere ọgbakọ. Ya mere, ọ na-arụ ọrụ dị mkpa n’inyere anyị aka ịrụzu ọrụ anyị n’ikwusa ozi ọma ahụ. Dị ka onye na-ezisa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi, ọ na-ebute ụzọ n’ịhazi ihe nile metụtara ozi. Dị ka onye nkụzi ruru eru, ọ na-enyere ndị nkwusa aka n’otu n’otu ịdịkwu irè n’ozi.—Efe. 4:11, 12.
2 Onye okenye a na-elekọta kpọmkwem ọrụ ndị ohu na-eje ozi e kenyere ịhụ maka akwụkwọ, magazin, na ókèala. Ọ bụ ọrụ ya ijide n’aka na e nwere akwụkwọ, magazin, na fọm ije ozi zuru ezu kwa ọnwa maka anyị iji na-eme ihe. Otu ugboro n’afọ ọ na-atụleghachi faịlụ ókèala maka adres ebe obibi nile a gwara anyị ka anyị ghara ịga, ọ na-ekenyekwa ụmụnna ruru eru ije leta ebe obibi ndị a.
3 Onye nlekọta ije ozi na-ahụ maka ilekọta ụzọ dị iche iche e si eme nkwusa, tinyere ịgba àmà n’ebe achụmnta ego, n’okporo ámá, na iji telifon agba àmà. Ọ na-amụ anya ịhazi ndokwa ndị dị irè izukọ maka ozi n’izu dum, tinyere ụbọchị ezumike. Ọ na-egosi ezi mmasị n’ọrụ ọmụmụ Bible. Ọ na-achọ ụzọ isi nyere ndị ghọrọ ndị nkwusa na-adịghị ejechi ozi anya ma ọ bụ na-adịghị ejekwa ozi aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọ na-enwe ezi nchegbu banyere ọrụ ndị ọsụ ụzọ, ọ na-elekọtakwa otú usoro ihe omume Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka si na-aga.
4 Dị ka onye òtù Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ, onye nlekọta ije ozi na-atụ aro maka mgbanwe ọ bụla dị mkpa n’ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ dị iche iche. Mgbe ọ na-eleta ìgwè unu, jide n’aka na ị nọ ya ma soro ya kere òkè n’ozi ubi.
5 Ndị nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị irube isi site n’ọchịchọ obi ná nduzi onye nlekọta ije ozi na-enye. Nke a ga-enyere anyị aka ịdịkwu irè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na inweta ọṅụ ka ukwuu n’ozi anyị.