Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka
1 Jisọs sịrị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole: ya mere, na-arịọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” Ebe ndị na-ewe ihe ubi nke narị afọ mbụ dị ole na ole ma nwee ókèala buru ibu ha ga-arụzu, Jisọs gaara agwaworị ha ka jiri ozi ọma ahụ jekwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee site n’izipụ ha otu otu. Kama nke ahụ, o ‘zipụrụ ha abụọ abụọ.’ (Luk 10:1, 2) Gịnị mere o ji bụrụ abụọ abụọ?
2 Ndị ahụ na-eso ụzọ ka bụ ndị ọhụrụ na ndị na-enwebeghị ahụmahụ. Site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ ha pụrụ ịmụta ihe na ịgbarịta ibe ha ume. Dị ka Solomọn si tinye ya, “abụọ dị mma karịa otu.” (Ekli. 4:9, 10) Ọbụna mgbe a wụpụsịrị mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., Pọl, Banabas, na ndị ọzọ sonyeere ndị kwere ekwe ibe ha n’ozi. (Ọrụ 15:35) Lee ihe ùgwù ọ na-aghaghị ịbụworo ụfọdụ ndị ịbụ ndị ndị ikom ahụ ruru eru zụrụ n’onwe ha!
3 Usoro Dị Mma nke Inye Ọzụzụ: Dị ka ogbo ya nke narị afọ mbụ, ọgbakọ ndị Kraịst nke oge a bụ nzukọ na-eme nkwusa. Ọ na-enyekwa anyị ọzụzụ. N’otu n’otu, ọchịchọ anyị sitere n’obi kwesịrị ịbụ iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ n’ụzọ dị irè dị ka o kwere mee. Ka ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ka ukwuu wee dị irè karị, e nwere enyemaka.
4 N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na nso nso a, Society mara ọkwa otu usoro ihe omume maka ndị ọsụ ụzọ inyere ndị ọzọ aka n’ozi ubi. Nke a ọ̀ dị mkpa? Ee, ọ dị. E mewo ihe karịrị otu nde ndị nkwusa baptism n’ime afọ atọ gara aga, ọzụzụ dịkwa ọtụtụ n’ime ndị a mkpa iji ghọọ ndị dị irè karị n’ọrụ ime nkwusa. Olee ndị a pụrụ iji gboo mkpa ahụ?
5 Ndị ọsụ ụzọ oge nile pụrụ inye aka. Nzukọ Jehova na-enye ha ndụmọdụ na ọzụzụ buru ibu. Ndị ọsụ ụzọ na-enweta ntụziaka ndị kwekọrọ ná mkpa ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ ahụ na-ewe izu abụọ. Ha na-eritekwa uru ná nzukọ ha na ndị nlekọta sekit na distrikti na-enwe, sitekwa ná nduzi nke ndị okenye. Ọ bụ ezie na ọ bụghị ndị ọsụ ụzọ nile nwere ahụmahụ dị ka Pọl na Banabas, ha enwetawo ọzụzụ ndị bara uru bụ́ ndị obi dị ha ụtọ ikerịta.
6 Olee Ndị Ga-erite Uru? Ọ̀ bụ nanị ndị nkwusa ọhụrụ ma ọ bụ ndị ọhụrụ e mere baptism ka usoro ihe omume a dịịrị? Ọ dịghị ma ọlị! E nwere ndị na-eto eto na ndị okenye mataworo eziokwu eri ọtụtụ afọ ma ha ga-enwe mmasị inweta enyemaka n’akụkụ ụfọdụ nke ozi ahụ. Ụfọdụ na-eme nnọọ nke ọma n’itinye akwụkwọ ma ọ na-esiri ha ike ime nletaghachi ma ọ bụ ịmalite ọmụmụ Bible. Ọ pụrụ ịdịrị ndị ọzọ mfe ịmalite ọmụmụ Bible ma ha na-achọpụta na ndị ha na-eduziri ọmụmụ ihe adịghị enwe ọganihu. Gịnị na-adọla ha azụ? A pụrụ ịrịọ ndị ọsụ ụzọ nwere ahụmahụ ka ha nye aka n’akụkụ ndị a. Ndị ọsụ ụzọ ụfọdụ dị irè n’ịzụlite mmasị, ịmalite ọmụmụ Bible, na iduzi ndị ọhụrụ a na-amụrụ ihe ihu gaa n’ọgbakọ. Ahụmahụ ha ga-enye aka n’usoro ihe omume ọhụrụ a.
7 Ị̀ na-achọpụta na usoro ihe omume gị adịghị enye gị ohere ịkwado nzukọ maka ije ozi ubi nke ọgbakọ na-enwe mgbe nile dị ka ị ga-achọ ịdị na-eme? Onye ọsụ ụzọ nwere ike iso gị rụọ ọrụ mgbe ụfọdụ mgbe a na-enweghị ndị nkwusa ọzọ nọ ya.
8 A Chọrọ Ezi Mmekọ Ihe Ọnụ: Ugboro abụọ n’afọ, ndị okenye ga-eme ndokwa ka ndị nkwusa chọrọ inweta enyemaka onwe onye kere òkè n’usoro ihe omume bụ́ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka. Ọ bụrụ na i kweta inweta enyemaka dị otú ahụ, soro onye nkwusa bụ́ onye ọsụ ụzọ e kenyere inyere gị aka zukọọ, hazie usoro dị irè maka ije ozi, ma rapagidesie ike na ya. Debe àgbà ọ bụla unu yiri. Ka unu na-arụkọ ọrụ ọnụ, rịba ama ụzọ ndị dị irè nke isi chee ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ. Tụlee ihe mere ụzọ njekwu ụfọdụ ji dị irè. Tụlee aro ndị onye nkwusa ahụ bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ ịtụ maka ime ka ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ dị mma karị. Ka ị na-etinye ihe ndị ị mụtara n’ọrụ, ọganihu gị n’ozi ga-apụta ìhè, nye ma gị ma ndị ọzọ. (Lee 1 Timoti 4:15.) Rụkọọnụ ọrụ ọnụ ọtụtụ ugboro dị ka o kwere mee, na-ekere òkè n’akụkụ nile nke ozi ahụ, gụnyere ịgba àmà mberede ma na-elekwasị anya n’akụkụ ọ bụla kpọmkwem ebe enyemaka onwe onye dị gị mkpa.
9 Onye nlekọta ije ozi nwere mmasị n’ọganihu a ga-enwe. Site n’oge ruo n’oge, ọ ga-ajụ onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ iji chọpụta otú i si na-erite uru site n’usoro ihe omume ahụ. Onye nlekọta sekit ga-enyekwara gị aka mgbe ọ bịara ileta ọgbakọ unu.
10 Jehova chọrọ ka ndị ya bụrụ ndị a zụrụ azụ na ndị “e meworo ka [ha] zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Tim. 3:17) Were ndokwa bụ́ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka dị ka ndokwa dị mma iji nyere ndị chọrọnụ aka imeziwanye ikike ha ikwusa okwu ahụ. Ọ bụrụ na i nwere ihe ùgwù ikere òkè na ya, jiri ekele, ịdị umeala n’obi, na ọṅụ mee otú ahụ.