Igbe Ajụjụ
◼ Ugbu a anyị nwere akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, ogologo oge hà aṅaa ka e kwesịrị iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi?
Ozi Alaeze Anyị nke October 1993 tụrụ aro na a ga-aga n’ihu n’ịmụrụ onye na-enwe mmasị ọhụrụ ọmụmụ Bible ebe obibi ruo mgbe a mụworo akwụkwọ abụọ. Ugbu a anyị nwere akwụkwọ Ihe Ọmụma, o yiri ihe amamihe dị na ya ime mgbanwe n’ụkpụrụ ime ihe nke a, dị ka a kọwapụtara ya na peji nke 13 na 14 nke mbipụta Ụlọ Nche nke January 15, 1996.
E mere akwụkwọ Ihe Ọmụma iji nyere ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” aka ịmụta ihe dị ha mkpa ịmara iji mee nraranye nye Jehova ma bụrụ ndị e mere baptism. (Ọrụ 13:48) Ya mere, mgbe a mụsịrị akwụkwọ ọhụrụ a, o kwesịghị ịdị mkpa isoro otu onye ahụ a na-amụrụ ihe mụọ akwụkwọ nke abụọ. Ka ndị ị na-amụrụ Bible malitere ịnara eziokwu, ị pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-agba ha ume ime ka ihe ọmụma ha zuo ezu site n’ịga nzukọ nke Ndịàmà Jehova ya na site n’ịgụ Bible na akwụkwọ dị iche iche nke ndị Kraịst.
Ọ bụrụ na ị matara nke ọma ajụjụ ndị ahụ dị na peji nke 175 ruo 218 nke akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, nke a pụrụ inye aka. Ọ bụ ezie na i kwesịghị izoro onye a na-amụrụ Bible aka n’ajụjụ ndị a ma ọ bụ soro ya tụlee ha, ọ pụrụ ịdị mma imesi isi ihe ndị dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ike bụ́ ndị ga-eme ka onye a na-amụrụ ihe kwupụta nghọta kwesịrị ekwesị banyere eziokwu ndị bụ isi nke Bible mgbe ndị okenye na-esoro ndị chọrọ ka e mee ha baptism na-atụle ajụjụ.
E nweghị mkpa nke ịtụkwasị ihe n’ihe ọmụma dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, na-ewebata ihe ndị na-adịghị n’akwụkwọ ahụ ma ọ bụ ịrụ ụka ndị ọzọ iji kwadoo ozizi Bible ma ọ bụ iji gbaghaa nkụzi ụgha. Nke a ga-eme nanị ka ọmụmụ ihe ahụ dịruo ogologo oge ka ukwuu. Kama nke ahụ, a na-enwe olileanya na a pụrụ ịmụcha akwụkwọ ahụ ngwa ngwa, ikekwe n’ime ọnwa isii. Nke a na-emesi ike mkpa ọ dị anyị ibu ụzọ mụọ ihe ọmụmụ ahụ nke ọma ka anyị wee nwee ike izi ya n’ụzọ doro anya na n’ụzọ dị nkenke. E kwesịkwara ịgba onye a na-amụrụ ihe ume ibu ụzọ mụọ ihe, ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a rụtụrụ aka na ha, na ịgbalị ịghọta n’ụzọ doro anya ihe akwụkwọ ahụ na-akụzi n’isi nke ọ bụla.
Ụlọ Nche emesiwo ike mkpa ọ dị ka Ndịàmà Jehova na-eduzi ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ọmụmụ Bible ndị dị irè n’oge ka mkpirikpi. (Lee Aịsaịa 60:22.) Iji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe n’ụzọ dị irè pụrụ iji nyere ndị ọhụrụ aka inweta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi ma tinye ya n’ọrụ.—Jọn 17:3.