Ì Ji Ọrụ n’Aka Gabiga Ókè?
1 Pọl gbara ume ka anyị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile.” (1 Kọr. 15:58) A na-agba anyị ume ịnọgide na-enwe usoro ọmụmụ ihe onwe onye kwa ụbọchị, na-ekere òkè n’ụzọ chiri anya n’ozi, na-ejechi nzukọ anya, ma na-ahụ maka ọrụ ọgbakọ n’ụzọ dị uchu. Tụkwasị na nke ahụ, anyị aghaghị inyere ndị ọzọ chọrọ enyemaka anyị aka. N’inwe ọtụtụ ihe otú a ime, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ iyi ka ihe o rikpuru anyị, na-eche na anyị aghaghị ịchọ ụzọ isi belata ibu ọrụ anyị.
2 E nwere ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ọ bụrụ ma ihe amamihe dị na ya ma ihe ziri ezi iwepụ ihe omume ụfọdụ ma ọ bụ belata ọ̀tụ̀tụ̀ ha. Ụfọdụ ndị chere na a na-atụ anya n’aka ha ime ihe nile ndị ọzọ chọrọ ka ha mee. Enweghị ezi nguzo n’ọnọdụ a pụrụ ịkpata nrụgide nke pụrụ nnọọ iweta oké nsogbu.
3 Nwee Ezi Nguzo: Mkpịsị ugodi nke ezi nguzo bụ itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ bụ́ “ijide n’aka ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10, NW) Nke ahụ pụtara nnọọ na anyị ga-atụkwasị uche n’ihe ndị bara uru n’ezie, ọ bụrụkwa na oge na ọnọdụ enye ohere, ịhụ maka ihe ndị na-adịghị oké mkpa. O doro anya na ọrụ ezinụlọ gbara ọkpụrụkpụ n’ime ihe ndị ahụ dị oké mkpa. A ghaghị ịhụ maka ibu ọrụ ụfọdụ na-emetụtaghị ihe ime mmụọ. Otú ọ dị, Jisọs kụziri na ihe ndị anyị na-ebute ụzọ aghaghị ịdabere n’ụkpụrụ bụ na anyị na-ebu ụzọ achọ Alaeze ahụ. Anyị aghaghị ibu ụzọ mee ihe ndị ga-enye anyị ohere imezu nraranye anyị nye Jehova.—Mat. 5:3; 6:33.
4 N’iburu nke a n’uche, anyị ga-ejide n’aka na anyị wepụrụ nchụso onwe onye ndị na-adịghị mkpa, ihe omume ntụrụndụ gabigara ókè, na nkwa ndị na-adịghị mkpa anyị kwere ndị ọzọ, n’usoro ihe omume anyị chiri anya. N’ime atụmatụ ọrụ anyị maka izu nke ọ bụla, anyị ga-ewepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye zuru ezu, òkè kwesịrị ekwesị n’ozi, ịga nzukọ, na ihe ọ bụla ọzọ ya na ofufe anyị nwere njikọ chiri anya. A pụrụ ikewa oge fọdụrụnụ maka nchụso ndị ọzọ, na-adabere n’otú ha si atụnye ụtụ n’iru ihe mgbaru ọsọ anyị bụ isi, nke bụ ịbụ ndị Kraịst nwere ezi nguzo ndị na-ebute Alaeze ahụ ụzọ.
5 Ọbụna mgbe ahụ, anyị ka pụrụ iche na ibu anyị dị oké arọ. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ dị anyị mkpa ịza òkù Jisọs na-akpọ: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” (Mat. 11:28) Ọzọ, legara Jehova anya, “kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu,” na-enyekwa onye dara mbà ike. Ọ na-ekwe nkwa na ọ dịghị mgbe ya ga-ahapụ onye ezi omume ka e wezụga ya. (Abụ Ọma 55:22; 68:19; Aịsa. 40:29) Anyị pụrụ inwe mmesi obi ike na a ga-aza ekpere anyị, na-eme ka o kwe anyị omume ịnọgide ná ndụ jupụtara n’ọrụ ọchịchị Chineke.
6 Ebe ọ bụ na obi siri anyị ike ịnọgide na-ejide ọrụ n’aka n’ịchụso ọdịmma bara uru nke Alaeze, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’ịmara na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.—1 Kọr. 15:58.