Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/96 p. 1
  • Ụzọ E Si Azụchapụta Oge

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ E Si Azụchapụta Oge
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzụchapụta Oge Maka Ọgụgụ Ihe na Ọmụmụ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Nọrọsienụ Ike na Nche n’Otú Unu Si Eji Oge Eme Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Jiri Oge Gị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Mee Ka Ndụ Gị Hiwe Isi n’Ozi Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 10/96 p. 1

Ụzọ E Si Azụchapụta Oge

1 Inwe ọtụtụ ihe ime n’ozi Jehova na-eme ka anyị jide ọrụ n’aka! (1 Kọr. 15:58) Anyị na-aghọta mkpa inwe ọmụmụ ihe onwe onye na dị ka otu ezinụlọ, ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịkwadebe na ịga nzukọ ọgbakọ, na ikerechi òkè anya n’ozi ubi. Ndị nlekọta nwere ibu ọrụ nke ọzụzụ atụrụ, ha na-ahụkwa maka ọrụ ndị ọzọ dị n’ọgbakọ. Ụfọdụ nwere ibu ọrụ ndị dị arọ n’ezinụlọ ma ọ bụ ọrụ dịgasị iche iche ha ga-arụrụ ndị ọzọ. Iji rụzuo ihe nile nke ọma, ọ dị onye ọ bụla mkpa inwe nguzozi na ezi nhazi onwe onye.

2 Setịpụ Ihe Ndị Kasị Mkpa: Ihe ịga nke ọma ‘n’ịzụchapụrụ onwe anyị oge’ na-adabere ná nghọta na ezi echiche anyị. (Efe. 5:15, 16) Anyị aghaghị ịchọpụta ihe “ndị ka mkpa” ma bute ha ụzọ ná ndepụta anyị nke ihe ndị kasị mkpa. (Fil. 1:10, NW) Otu di na nwunye kọwara ezinụlọ ọchịchị Chineke ha n’ụzọ a: “Anyị ji eziokwu ahụ emejupụta ndụ anyị . . . Eziokwu ahụ abụghị akụkụ ndụ anyị, ọ bụ ndụ anyị. Ihe ọ bụla ọzọ na-aga ya gburugburu.” Mmadụ ibute ofufe na ozi Jehova ụzọ ná ndụ dị mkpa.

3 Mata Ihe Ndị Na-egbu Oge: E nwere hour 168 n’otu izu, ọ dịkwa anyị mkpa iji oge anyị nwere mee ihe n’ụzọ amamihe. Iji nwee oge zuru ezu maka ọrụ ọchịchị Chineke, ọ dị anyị mkpa ịmata ma belata ihe ndị na-egbu oge. Otu nnyocha kpughere na onye toruworo ogo mmadụ na United States na-etinye ihe karịrị hour 30 n’ikiri TV n’otu izu! Nye ndị ọzọ, a na-etinye oge dị ukwuu n’ịgụ akwụkwọ ụwa. Ụfọdụ pụrụ ịchọpụta na ha na-etinye ọ̀tụ̀tụ̀ oge gabigara ókè n’ihe omume ọha mmadụ, ihe omume ntụrụndụ, ma ọ bụ otu ụdị egwuregwu a na-eme n’ime ụlọ. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ileru anya n’usoro ihe omume kwa ụbọchị anyị iji hụ otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị mee ihe n’ụzọ ka mma. Amamihe na-achọ na anyị ga-akpa ókè n’oge anyị na-ekenye ihe omume ndị na-adịghị mkpa.

4 Zụlite Usoro Ime Ihe Dị Mma: N’agbanyeghị ọnọdụ onwe onye anyị, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịzụchapụta oge maka nchụso ihe ime mmụọ. Ụfọdụ achọpụtawo na ịmalitekwu n’oge n’ụbọchị nke ọ bụla na-enyere ha aka ịrụzukwu ihe. Ọ bụrụ na anyị na-eji oge dị ukwuu anọ n’ụgbọala e ji eje ọrụ ma ọ bụ n’ichere ndị ọzọ, anyị pụrụ iji ụfọdụ n’ime oge ahụ mee ihe maka ọgụgụ Bible, ịkwadebe maka nzukọ, ma ọ bụ ige ntị n’ihe ọmụma Society tinyere na kaseti a na-ege ege. Ezinụlọ dị iche iche na-erite uru site n’iwepụta otu oge kpọmkwem mgbe nile iji mụkọọ ihe ọnụ. Ọ bụrụ na onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ na-abịa maka ọmụmụ ihe ezinụlọ n’oge, ọ na-eme ka oge ụfọdụ mapụtara mmadụ nile.

5 Ka ụbọchị nke ọ bụla na-agafe, anyị kwesịrị ịmatakwu nke ọma na “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ.” (1 Kọr. 7:29) Ndụ anyị na-adabere n’otú anyị si jiri oge dị oké ọnụ ahịa fọdụrụnụ na-eme ihe. A ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị azụchapụrụ onwe anyị oge iji wee nwee ike ibute ọdịmma Alaeze ahụ ụzọ!—Mat. 6:33.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya