Nọrọsienụ Ike na Nche n’Otú Unu Si Eji Oge Eme Ihe
1. Ihe isi ike dị aṅaa ka ndị mmadụ n’ebe nile na-eche ihu taa?
1 N’ọgbọ a nke e nwere ngwá ọrụ ndị na-ebelata oge na ndị ọrụ, ọtụtụ ndị na-ahụ na o yiri ka ha na-enwe ọtụtụ ihe ime na ntakịrị oge iji mee ha. Ọ̀ na-esiri gị ike ịnọgide na-agbaso usoro ihe omume ime mmụọ? Ọ̀ na-adị gị ka i nwekwuo oge maka ozi ọma? Olee otú anyị pụrụ isi jiri oge anyị mee ihe n’ụzọ kachasị mma?—Ọma 90:12; Fil. 1:9-11.
2, 3. Nsogbu ndị dị aṅaa ka nkà na ụzụ nzirịta ozi na-eweta, oleekwa otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi nyochaa onwe ya?
2 Chọpụta Ihe Ndị Na-eri Oge: Site n’oge ruo n’oge, anyị nile kwesịrị ịtụle otú anyị na-esi eji oge anyị eme ihe. Bible na-agba ume, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Efe. 5:15, 16) Tụlee nsogbu ndị ọganihu e nwere na nkà na ụzụ nzirịta ozi na-eweta. Ọ bụ ezie na a na-eji kọmputa na ngwá electronic ndị ọzọ eme ihe ndị bara uru, ha pụrụ ịghọ ọnyà ma ọ bụrụ na anyị aghara ịnọsi ike na nche n’otú anyị na-esi eji oge anyị eme ihe.—1 Kọr. 7:29, 31.
3 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji na-agụ ma na-azaghachi ozi E-mail ndị na-akpasu iwe? M̀ na-akpọkarị mmadụ na fon ma ọ bụ na-eji telifon ezigara mmadụ ozi e dere ede banyere ihe ndị na-adịchaghị mkpa? (1 Tim. 5:13) M̀ na-achọgharị ihe n’Intanet n’enweghị nzube ọ bụla ma ọ bụ na-apịgharị telivishọn. Oge dị ukwuu m na-etinye n’igwu egwuregwu electronic ma ọ bụ n’egwuregwu ndị ọzọ, ndị dị ka igwu ludo na ịgba bọl, ọ̀ malitewo iwere oge ụfọdụ site n’oge ndị m na-eji amụ Okwu Chineke? M̀ na-eji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ngwụsị izu dum aga oriri agbamakwụkwọ ma ọ bụ ememe ndị ọzọ?’ Ịchụso ihe ndị dị otú ahụ pụrụ iji aghụghọ mebie ọnọdụ ime mmụọ anyị.—Ilu 12:11.
4. Mgbanwe dị aṅaa ka otu onye ntorobịa mere, n’ihi gịnịkwa?
4 Iji Oge Eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya: Ngwá electronic na ihe ntụrụndụ ndị ọzọ yiri ka hà na-ewere oge anyị ma na-adọrọ uche anyị. Otu onye ntorobịa nke bamiri nnọọ abami n’egwuregwu kọmputa kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na m eburuwo ụzọ gwuo egwuregwu kọmputa tupu m gawa ozi ubi ma ọ bụ nzukọ Ndị Kraịst, ọ na-esiri m nnọọ ike itinye uche n’ihe. Ọ fọdụrụ nke nta ka ọ bụrụ na m na-echekarị otú m ga-esi merie n’otu egwuregwu kọmputa na-enye m nsogbu ma m laruo. Ọmụmụ ihe onwe onye m na ọgụgụ Bible m na-agụ mgbe nile lara nnọọ azụ. Ọṅụ m na-enweta site n’ijere Chineke ozi malitere ịdalata.” N’ịghọta na ọ dị ya mkpa ime mgbanwe, o wepụrụ egwuregwu nile dị na kọmputa ya. “Nke ahụ siri nnọọ ike,” ka ọ na-echeta. “Etinyere m onwe m n’egwuregwu kọmputa karịa ka m chere. Ma enwekwara m mmetụta nke ịbụ onye meririnụ n’ihi na amaara m na m mere ya maka ọdịmma m.”—Mat. 5:29, 30.
5. Olee otú anyị pụrụ isi zụpụta oge maka nchụso ihe ime mmụọ, oleekwa otú anyị si erite uru site n’ime otú ahụ?
5 Ọ pụrụ ịdị mkpa iwere nzọụkwụ ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ dị ebe ndị i kwesịrị ime mgbanwe. Ị̀ pụrụ ịzụpụta ọkara awa kwa ụbọchị site n’ihe omume ndị na-adịchaghị mkpa? Nke ahụ bụ ihe ọ pụrụ iwe iji gụzuo Bible n’otu afọ. Lee ihe na-akwụghachi ụgwọ n’ụzọ ime mmụọ nke ahụ ga-abụ! (Ọma 19:7-11; 119:97-100) Setịpụ oge a kapịrị ọnụ maka ọgụgụ Bible, ịkwadebe nzukọ na ozi ubi. (1 Kọr. 15:58) Ime nke a ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị na-eri oge, ọ ga-enyekwara gị aka ‘ịnọgide na-aghọta ihe uche Jehova bụ.’—Efe. 5:17.