Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/99 p. 3-4
  • Mee Ka Ndụ Gị Hiwe Isi n’Ozi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka Ndụ Gị Hiwe Isi n’Ozi Jehova
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwee Usoro Ihe Omume Dị Irè nke Ezinụlọ Gị Ga Na-agbaso
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ezinụlọ, Toonụ Chineke Dị Ka Akụkụ nke Ọgbakọ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ụzọ Ndị Òtù Ezinụlọ Si Emekọ Ihe Ọnụ Iji Kere Òkè Zuru Ezu—n’Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 12/99 p. 3-4

Mee Ka Ndụ Gị Hiwe Isi n’Ozi Jehova

1 Jisọs ji ndị na-ege ya ntị tụnyere ụdị mmadụ abụọ na-ewu ihe. Otu wukwasịrị ụzọ ndụ ya n’elu oké nkume nke nrubeisi nye Kraịst ma nwee ike iguzogide oké ifufe nke mmegide na mkpagbu. Onye nke ọzọ wukwasịrị nke ya n’elu ájá nke nnupụisi n’ihi ọchịchọ onwe onye nanị wee ghara inwe ike iguzosi ike mgbe nrụgide bịara. (Mat. 7:24-27) Ebe anyi na-ebi na mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe a, anyị na-enwe ọtụtụ oké ifufe nke ihe isi ike. Oké mkpagbu ahụ na-eruju n’ike n’ike dị ka mmiri. Ànyị ga-atachi obi ruo ọgwụgwụ ihe nile, na-ejidesi okwukwe anyị ike? (Mat. 24:3, 13, 21) Ọ dabeere n’ókè dị ukwuu n’otú anyị si na-ewulite ndụ anyị ugbu a. Ya mere, ọ dị oké mkpa ịjụ onwe anyị, sị, ‘Àna m eme ka ndụ m dị ka onye Kraịst, hiwe isi n’ụzọ siri ike n’iji nrubeisi na-ejere Chineke ozi?’

2 Gịnị ka anyị ime ka ndụ anyị hiwe isi n’ozi Jehova pụtara? Ọ pụtara ime Jehova onye bụ́ isi ná ndụ anyị. Ọ gụnyere ilekwasị anya n’Alaeze ahụ dị ka isi ihe dị anyị mkpa. Ọ gụnyere irubere Chineke isi n’ihe nile anyị na-eme ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Ọ chọrọ anyị itinye obi anyị dum n’ọmụmụ Bible onwe onye anyị, nke ezinụlọ, na nke ọgbakọ nakwa itinye obi anyị dum n’ozi ubi anyị, na-ebute ihe ndị a ụzọ ná ndụ anyị. (Ekli. 12:13; Mat. 6:33) Omume nrubeisi dị otú ahụ na-eme ka e nwee okwukwe siri ike ka nkume, bụ́ nke na-agaghị ada n’agbanyeghị oké ifufe nke ihe isi ike ọ bụla pụrụ ịdapụta.

3 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ ka ọtụtụ nde mmadụ ji obi ike na-eme ka ndụ ha na olileanya ha maka ọdịnihu hiwe isi n’ijere Chineke ozi, ọbụna dị ka Jisọs mere. (Jọn 4:34) Ha na-agbasochi usoro ihe omume ọchịchị Chineke anya ma na-enweta ngọzi bara ụba n’ihi ya. Otu nne kọwara otú ya na di ya si nwee ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ ha nwoke abụọ ịbụ ndị na-efe Jehova: “Anyị jiri eziokwu mejupụta ndụ anyị—na-ejezu mgbakọ nile, na-eje nzukọ dị iche iche, na-akwadebekwa ihe ndị a ga-eme na ha, na-emekwa ka ozi ubi bụrụ otu akụkụ nke ndụ anyị na-adị mgbe nile.” Di ya kwukwasịrị: “Eziokwu ahụ abụghị otu akụkụ nke ndụ anyị, ọ bụ ndụ anyị. Ihe ndị ọzọ dabeere na ya.” Ùnu edebewo ofufe Jehova n’otu aka ahụ n’ọnọdụ mbụ n’ezinụlọ unu?

4 Mepụta Usoro Ihe Omume Dị Irè A Ga-agbaso Kwa Izu:Nzukọ Jehova na-enyere anyị aka ịgbaso usoro ihe omume ime mmụọ dị mma site n’ịhazi nzukọ ise kwa izu. Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eme ka ndụ ha hiwe isi n’ofufe Jehova na-ahazi ọrụ ego na ihe omume ezinụlọ ha n’ụzọ ga-eme ka ha nwee ike ịgazu nzukọ ndị a dị mkpa. Ha adịghị ekwe ka ihe ndị na-adịchaghị mkpa gbochie ha ịgachi nzukọ anya.—Fil. 1:10; Hib. 10:25.

5 Ndị Kraịst tozuru okè maara na dị ka ọ dị nnọọ mkpa ịdị na-erichi nri anya n’oge dị iche iche kwa ụbọchị, otú ahụ kwa ka ọ dị mkpa inwe usoro ihe omume a kapịrị ọnụ maka ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ, gụnyere ịkwadebe maka nzukọ. (Mat. 4:4) Ị̀ pụrụ iwepụta ma ọ dịghị ihe ọzọ minit 15 ma ọ bụ 20 kwa ụbọchị maka ọmụmụ ihe onwe onye? Ụzọ isi mee ya bụ ịghara ikwe ka ihe ndị ọzọ weghara oge i wepụtara maka ọmụmụ ihe. Mee ka ọ bụrụ ihe bara uru ị na-eme mgbe nile. Nke a pụrụ ịchọ iteta n’oge kwa ụbọchị karịa otú ị na-eme ugbu a. Mmadụ 17,000 bụ́ ndị ótù ezinụlọ Betel n’ụwa nile na-eteta n’oge n’ụtụtụ iji tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị. N’eziokwu, iteta n’oge ga-achọ ka ị lakpuo n’oge n’abalị iji zuo ike nke ọma ma dị ike n’echi ya.

6 Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, bute ụzọ n’ime atụmatụ na n’ịhazi usoro ihe omume ọchịchị Chineke nke ezinụlọ gị. Ezinụlọ ụfọdụ na-agụkọta Bible, Yearbook, ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ ọnụ mgbe ha risịrị nrị abalị ma na-ezu ike. Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị zụliteworo ụmụ ha ịbụ ndị Kraịst siri ike n’ụzọ ime mmụọ na-ekwu na otu ihe mere ka ha nwee ihe ịga nke ọma bụ mwepụta ezinụlọ ha na-ewepụkarị otu uhuruchi kwa izu bụ́ mgbe ha na-eji atụle ihe ime mmụọ nke na-ewuli elu. Otu nna dị otú ahụ kwuru, sị: “[M] na-eche na uto ime mmụọ nke ụmụaka anyị n’ụzọ buru ibu bụ n’ihi ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ chiri anya anyị na-enwe n’abalị Wednesday, nke a malitererịị afọ 30 gara aga.” E mere ụmụ ya atọ baptism mgbe ha ka dị obere, mgbe e mesịkwara, ha atọ banyere n’ozi oge nile. Tụkwasị n’ọmụmụ ihe ezinụlọ, a pụrụ ịmụgharị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a ga-eji eme ihe n’ozi ubi ma ọ bụ ihe omume a ga-eme ná nzukọ, a pụkwara imekọ ihe ndị ọzọ na-ewuli elu ọnụ.

7 N’usoro ihe omume gị kwa izu, ị̀ ‘zụchapụtawo oge’ iji mee nkwusa Alaeze? (Kọl. 4:5) Ihe ka ọtụtụ n’ime anyi nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme, nwee ibu ọrụ ezinụlọ na nke ọgbakọ anyị ga-elekọta. Ọ bụrụ na anyị emeghị ndokwa ndị doro anya maka ikere òkè n’ọrụ nkwusa na izi ihe kwa izu, ọ ga-adị nnọọ mfe ihe ndị ọzọ igbochi ọrụ a dị mkpa. Otu onye nwere ebe a na-azụ ìgwè ehi kwuru, sị: “N’ihe dị ka n’afọ 1944 ka m chọpụtara na nanị ụzọ m pụrụ isi na-eje ozi ọma bụ iwepụtara ya ụbọchị nke ya. Ruokwa taa aka m na-ewepụta otu ụbọchị maka ije ozi n’izu ọ bụla.” Otu onye Kraịst bụ́ okenye chọpụtara na inwe ndokwa doro anya maka ịgba àmà na-eme ka o nwee ike itinye nkezi nke awa 15 n’ọrụ nkwusa ahụ kwa ọnwa. Ọ bụrụ na o nwere ọrụ ego ọ ga-arụ na Saturday, ọ ga-edokwa ya ka ọ bụrụ mgbe ọ gasịrị ozi ubi n’ụtụtụ. Gị na ezinụlọ gị ùnu pụrụ iwepụta otu ụbọchị kwa izu ma ọ dịghị ihe ọzọ maka ozi ubi, na-eme ka nke a bụrụ akụkụ nke ụzọ ndụ ime mmụọ unu?—Fil. 3:16.

8 Nyochaa Ihe Ndị Ị Na-eme ná Ndu:E nwere ihe ndị na-eme ka anyị ihiwe ndụ anyị isi n’ozi Jehova sie ike. Ọnọdụ ndị a na-atụghị anya ha pụrụ ịkpaghasị usoro ihe omume anyị ji nlezianya mee maka ọmụmụ ihe, nzukọ, na ozi. Onye Iro anyị, bụ́ Setan, ga-emekwa ihe nile o nwere ike ime iji ‘gbochie anyị’ ma mebie atụmatụ anyị. (1 Tesa. 2:18; Efe. 6:12, 13) Ekwela ka ihe mgbochi ndị a kụda gị aka, i wee kwụsị. Mee mgbanwe ọ bụla dị mkpa iji rụọ ọrụ ọchịchị Chineke i mere atụmatụ ya. Mkpebisi ike na nnọgidesi ike dị mkpa iji rụzuo ihe kwesịrị ekwesị n’ezie.

9 Anyị agaghị ekwe ka mmetụta nke ụwa na mmetụta ọjọọ nke anụ ahụ anyị na-ezughị okè webata ihe ndị na-abụghị ihe omume ime mmụọ bụ́ ndị pụrụ ịmalite ịdị na-ewerekwu oge anyị ma na-adọrọkwa uche anyị. Mmadụ inyocha onwe ya dị mkpa, jiri ajụjụ ndị dị ka: ‘Ụzọ ndụ m ò jiriwo nwayọọ nwayọọ ghọọ nke na-enweghị ezi nguzozi ma ọ bụ nke kpaghasịrị akpaghasị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya? Àmalitewo m ime ka ndụ m hiwe isi n’ihe ndị na-agabiga agabiga dị n’ụwa a? (1 Jọn 2:15-17) Oge hà aṅaa ka m na-etinye n’ịchụso ihe nke m, ime njem ntụrụndụ, n’egwuregwu, ma ọ bụ ná ntụrụndụ ndị ọzọ—gụnyere ikiri telivishọn ma ọ bụ ịwaghagharị n’Internet—ma e were ya tụnyere oge m na-etinye n’ihe omume ime mmụọ?’

10 Ọ bụrụ na ị chọpụta na ndụ gị ejupụtawo n’ọtụtụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa, gịnị ka ị ga-eme? Dị nnọọ ka Pọl kpere ekpere ka a ‘gbazigharịa’ ụmụnna ya ma ọ bụ ‘mee ka ha dịrị n’usoro kwesịrị ekwesị,’ gịnị ma ị rịọ Jehova maka enyemaka iji mee ka ndụ gị hiweghachi isi n’ozi ya? (2 Kọr. 13:9, 11, nkọwa ala ala peji nke NW.) Mgbe ahụ kpebisie ike ime ihe kwekọrọ ná mkpebi gị ma mee mgbanwe ndị dị mkpa. (1 Kọr. 9:26, 27) Jehova ga-enyere gị aka ka i jiri nrubeisi na-ejere ya ozi ma ghara ịkpapụ gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.—Tụlee Aịsaịa 30:20, 21.

11 Nọgide Na-arụsi Ọrụ Ike n’Ozi Na-enye Ọṅụ nke Chineke: Ọtụtụ nde mmadụ na-achọsị obi ụtọ ike ma na-achọpụta na ka ọnwụ ha na-akpụdewe nso, ihe onwunwe ndị ha chọsiri ike ewetabeghịrị ha obi ụtọ na-adịgide adịgide. Ọ bụrụwo “ịchọ ijide ifufe.” (Ekli. 2:11) N’aka nke ọzọ, mgbe anyị mere ka Jehova bụrụ onye bụ́ isi ná ndụ anyị, ‘na-edebe ya n’ihu anyị mgbe nile,’ anyị na-enwe afọ ojuju dị ukwuu. (Abụ Ọma 16:8, 11) Nke a dị otú a n’ihi na ọ bụ Jehova mere ka anyị dị ndụ. (Mkpu. 4:11) E wezụga ya, bụ́ Onye Ukwu Na-ezube Ihe, ndụ enweghị nzube. Ijere Jehova ozi na-eme ka ndụ anyị jupụta n’ọtụtụ ihe omume bara uru, ndị nwekwara nzube bụ́ ndị na-abara anyị na ndị ọzọ uru n’ụzọ na-adịgide adịgide, ee, n’ụzọ na-adiru mgbe ebighị ebi.

12 Ọ dị mkpa ka anyị ghara ịghọ ndị afọ juru n’onwe anyị ma ghara inwekwa echiche nke ịdị ngwa n’ihe banyere mbibi nke ụwa Setan nke ji ọsọ na-abịa. Otú anyị si ebi ndụ kwa ụbọchị na-emetụta echiche anyị banyere ọdịnihu. Ndị biri ndụ n’oge Noa, bụ́ ndị na-ekweghị na a ga-enwe iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ ‘amaghị,’ na-eme ka ndụ ha na-ebi kwa ụbọchị hiwe isi ná nchụso onwe onye—iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịlụ di ma ọ bụ nwunye—ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara “kpopụ ha nile.” (Mat. 24:37-39) Taa, ndị na-eme ka ndụ ha hiwe isi n’ụwa a ga-ahụ ka olileanya ha maka ọdịnihu kụrụ afọ n’ala ná mbibi kasị ukwuu mmadụ hụtụworo, bụ́ “ụbọchị ahụ nke Onyenwe anyị.”—2 Pita 3:10-12.

13 N’ihi nke a, nọgide na-eme ka ndụ gị hiwe isi n’ebe Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Jehova, nọ nakwa n’ime uche ya. Ọ dịghị atụmatụ achụmnta ego ị pụrụ ime ná ndụ a nke ga-enwe Onye Nkwado a pụrụ ịtụkwasị obi dị ka Jehova. Ọ pụghị ịgha ụgha—ọ ga-emezu ihe ndị o kwere ná nkwa. (Taị. 1:2) Ọ pụghị ịnwụ anwụ—ọ dịghị ihe e debere n’aka Jehova ga-efu efu. (Hab. 1:12; 2 Tim. 1:12) Ndụ nrubeisi na okwukwe nke anyi na-ewulite ugbu a bụ nanị mmalite nke ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi n’ozi na-enye ọṅụ nke Chineke anyị dị ngọzi!—1 Tim. 1:11; 6:19.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Eziokwu ahụ abụghị otu akụkụ nke ndụ anyị, ọ bụ ndụ anyị. Ihe ndị ọzọ dabeere na ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya