Nwee Usoro Ihe Omume Dị Irè nke Ezinụlọ Gị Ga Na-agbaso
1 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs gbara ndị gere ya ntị ume, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.” (Mat. 6:33) Otu ụzọ dị mma ezinụlọ ga-esi na-ahazi ihe omume ha ka ha wee na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ bụ site n’inwe usoro ihe omume e dere ede. Jiri minit ole na ole depụta usoro ihe omume nke ihe ezinụlọ gị ga na-eme n’izu, na-edepụta ya n’ebe ahụ e nyere ohere maka ya, bụ́ nke dị na peeji nke 6 nke ihe ntinye a. Ezinụlọ unu pụrụ ikpebi ịkwadebe usoro ihe omume nke ya site n’ịchapụta ihe omume ndị ahụ e derela ede ma mapawa ha n’usoro ihe omume ahụ. Ndị ọzọ pụrụ ịhọrọ iji aka ha dee ya.
2 Usoro ihe omume a dị n’okpuru, bụ́ nke e ji mee ihe atụ, pụrụ inyere gị aka ịma otú ị ga-esi depụta usoro ihe omume gị. Ị ga-ahụ na e depụtara nanị isi ihe anọ ndị bụ́ isi na ya: (1) ịga nzukọ ọgbakọ, (2) ozi ubi ezinụlọ, (3) ọmụmụ ihe ezinụlọ, na (4) ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Ideba ihe ndị a n’usoro ihe omume gị pụrụ inyere gị aka ‘ijide ihe ndị ka mkpa n’aka.’ (Fil. 1:10) Aro ndị ọzọ a tụrụ banyere ụzọ ihe anọ a dị na peeji nke 4-5.
3 Ọ dịghị mkpa na ọ bụ nanị ihe anọ a ka ị ga-ede n’usoro ihe omume ezinụlọ gị. Ọ bụrụ na ezinụlọ gị na-anọkọ ọnụ akwadebe maka nzukọ ụfọdụ nke ọgbakọ, deba ya n’usoro ihe omume ahụ. Ọ bụrụ na unu na-agụ Bible mgbe unu tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma ọ bụ n’oge ọzọ n’ụbọchị, debakwa ya. Ọ bụrụ na unu na-adị atụrụ ndụ dị ka ezinụlọ, ị pụrụ idenye ya n’usoro ihe omume ahụ.
4 Mee ka usoro ihe omume ahụ kwekọọ ná mkpa nakwa n’ọnọdụ nke onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ gị. Site n’oge ruo n’oge, na-eleba anya n’otú o si na-aga, ma na-eme mgbanwe dị ka mkpa si dị.
[Chaatị dị na peeji nke 3]
Ihe Atụ nke Usoro Ihe Omume Ezinụlọ
Ụtụtụ Ehihie Uhuruchi
Sun. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
Okwu Ihu Ọha na
Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche
Mon. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ
Tues. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị Ọmụmụ Akwụkwọ
Ọgbakọ
Wed. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
Thurs. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị Ụlọ Akwụkwọ Ije
Ozi Ọchịchị
Chineke na Nzukọ
Ije Ozi
Fri. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
Sat. Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
Ozi Ubi Ezinụlọ
(Ụbọchị Magazin)
[Chaatị dị na peeji nke 6]
Usoro Ihe Omume Ezinụlọ
Ụtụtụ Ehihie Uhuruchi
Sun.
Mon.
Tues.
Wed.
Thurs.
Fri.
Sat.
..................................................................
Ihe Ihe Ihe Ihe Ihe Ihe Ihe
Mmụta Mmụta Mmụta Mmụta Mmụta Mmụta Mmụta
Dịịrị Dịịrị Dịịrị Dịịrị Dịịrị Dịịrị Dịịrị
Ụbọchị Ụbọchị Ụbọchị Ụbọchị Ụbọchị Ụbọchị Ụbọchị
Okwu Ụlọ Ọmụmụ Ọmụmụ Ozi Ubi Ọgụgụ Ntụrụndụ
Ihu Akwụkwọ Akwụkwọ Ihe Ezinụlọ Bible Ezinụlọ
Ọha na Ije Ozi Ọgbakọ Ezinụlọ Ezinụlọ
Ọmụmụ Ọchịchị
Ihe Ụlọ Chineke
Nche na Nzukọ
Ije Ozi