Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
1 Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-agbalịsi ike kwa ụbọchị inye ụmụ ha ezigbo nri. Inye ha ezigbo nri ime mmụọ sitere n’Okwu Chineke dị mkpa ọbụna karị. (Mat. 4:4) Otu ụzọ ị pụrụ isi nyere ụmụ gị aka inwe ezigbo agụụ maka ihe ime mmụọ ma “toruo nzọpụta” bụ site n’ịdị na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị dị ka ezinụlọ. (1 Pita 2:2) Olee oge ezinụlọ pụrụ iji na-eme ya?
2 N’oge Nri: Gị na ezinụlọ gị ime ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ pụrụ inyere ha aka ịdị na-echeta Jehova n’ụbọchị ahụ nile. (Ọma 16:8) Otu nne kpebiri na ya na nwa ya nwoke ga na-eme ihe mmụta dịịrị ụbọchị mgbe nwa ahụ na-eri nri ụtụtụ ma sorokwa ya kpee ekpere tupu ọ gawa akwụkwọ. Nke a mere ka nwa ahụ nwee ike iguzosi ike mgbe o nwetara ule nke ịhụ mba n’anya, mee ka o guzogide ọnwụnwa nke ime omume rụrụ arụ, meekwa ka ọ na-agbara ma ụmụ akwụkwọ ma ndị nkụzi àmà n’atụghị egwu. N’agbanyeghị na ọ bụ nanị Onyeàmà nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ọ dịghị mgbe owu mara ya.
3 Ọ bụrụ na unu agaghị enwe ike ime ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ, unu pụrụ ime ya n’oge ọzọ n’ụbọchị, ikekwe n’oge unu na-eri nri abalị. Ụfọdụ na-ejikwa oge a akọ ahụmahụ ndị ha nwere n’ozi ubi nakwa ihe ndị ha gụtara na Bible. Ọtụtụ ji obi ụtọ echeta na oge nri dị otú ahụ bụ oge kasị nye ha obi ụtọ n’ime oge nile ha na ndị ezinụlọ ha ji nọkọọ.
4 N’oge Abalị: N’ezinụlọ ụfọdụ, oge kasị mma ime ihe mmụta dịịrị ụbọchị bụ tupu ha alakpuo ụra. Nke a pụkwara ịbụ oge dị mma ikpekọ ekpere ọnụ. Ka ụmụ gị na-ahụ ka ị na-ekwu banyere Jehova ma na-ekpegara ya ekpere, ọ na-eme ka ha hụ ya dị ka onye dị adị n’ezie.
5 Ka Jehova gọzie mgbalị ị na-eme ịkụnye eziokwu ahụ n’obi ụmụ gị ka ị na-eji Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị eme ihe nke ọma.