Tụlee Okwu Jehova Kwa Ụbọchị!
1 Ụbọchị nke ọ bụla na-ewetara okwukwe gị ihe ịma aka ndị ọhụrụ. Ikekwe onye ụwa ị maara na-arụgidesi gị ike ka gị na ya yie oge mkpapụ. Onye nkụzi gị chọrọ ka ị chụsoo ọrụ ego, ma ọ bụ na onye were gị n’ọrụ chọrọ ka ị nọkarịa awa ole ị na-anọ n’ọrụ. Ahụ ike gị nwere ike na-adakpọ adakpọ. Ọ bụ ezie na ị pụrụ iche ọnwụnwa ndị dị otú ahụ ihu mgbe ọ bụla, ọ bụghị nanị gị ka ha na-emetụta. Jehova dị njikere inye gị amamihe dị gị mkpa iji nagide ha. Ịtụle akụkụ Bible na nkọwa ha dị n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ bụ otu n’ime ụzọ ndị ị pụrụ isi na-amụchi Okwu Jehova anya. Ị̀ na-eji ndokwa a eme ihe?
2 E Nwere Enyemaka: Aịsaịa 30:20 (NW) na-akọwa Jehova dị ka “Onye Nkụzi Ukwu” ndị Chineke pụru ilegara anya maka enyemaka. Ọ na-enye gị nnọọ ihe ndị dị gị mkpa iji merie ihe ndị na-ama okwukwe gị aka. N’ụzọ dị aṅaa? Amaokwu nke na-eso ya na-akọwa, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” Taa Jehova na-ezipụ “okwu” ya site n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ná mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ kwesịri ka a tụkwasị ya obi.” (Mat. 24:45) E nwere nnukwu ihe ọmụma dị n’isiokwu Ụlọ Nche ndị gara aga nanị, bụ́ ndị na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ ndụ nile nke ndị Kraịst. Ịtụleghachi ndị e hotara n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ na-enyere gị aka inwe ihe ọmụma dị ukwuu bụ́ nke bara oké uru n’ime ihe banyere ụdị ọnwụnwa nile.—Aịsa. 48:17.
3 Wepụta Oge Maka Ya: Ọ bụ ezie na ọ dịghị enwe ohere n’oge ụtụtụ, otu nne gbalịsiri ike isoro nwa ya nwoke gụọ ma tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ha mgbe ọ na-eri nri ụtụtụ. Okwu ndị a na ekpere bụ okwu ndị ikpeazụ nwa ya nwoke na-anụ kwa ụtụtụ tupu ọ gawa akwụkwọ. Ha wusiri ya ike iguzogide ndị na-abịakwute ya maka mmekọahụ, iguzosi ike mgbe e nwere ihe omume ndị metụtara ịhụ mba n’anya, na iji obi ike gbaara ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi àmà. Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị ya bụ Onyeàmà n’ụlọ akwụkwọ ya, ọ dịtụghị mgbe o chere na nanị ya nọ.
4 Legara Jehova na Okwu ya anya maka nduzi. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-abụrụ gị onye dị adị n’ezie, dị ka enyi ị tụkwasịri obi. Gakwuru ya kwa ụbọchị! Soro ọtụtụ nde mmadụ ndị ọzọ bụ́ ndị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị n’ụwa dum, mee ka anya gị bụrụ “anya na-ahụ Onye Nkụzi Ukwu gị.”