Ì Jikerela Ibido Akwụkwọ?
1. Olee ohere ị ga-enwe ma unu bido akwụkwọ?
1 Ma nke a ọ̀ bụ nke mbụ ị na-aga ideba aha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ̀ bụ na ụlọ akwụkwọ unu na-aga imepe, unu bụ́ Ndị Kraịst na-eto eto ga-enwe ọnwụnwa na nsogbu ndị ọhụrụ ga-abịara unu. Ma, i nwekwara ọtụtụ ohere ị ga-eji “gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ì kwadebela nke ọma ma jikere ịgbara ndị ọzọ àmà n’ụlọ akwụkwọ unu?
2. Olee ihe ndị ị ga-eme ga-egosi na i jikerela ibido akwụkwọ?
2 Jehova, papa gị na mama gị, na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche akụzierela gị ọtụtụ ihe ndị ga-enyere gị aka ime nke ọma ná ndụ. (Ilu 1:8; 6:20; 23:23-25; Efe. 6:1-4; 2 Tim. 3:16, 17) O doro anya na ị matala ụdị nsogbu ndị i nwere ike inwe n’ụlọ akwụkwọ unu. Ihe ga-enyere gị aka ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ unu bụ icheta ihe ndị a kụziiri gị ma n’ụlọ ma n’ọgbakọ, na icheta ụdị nsogbu ndị ị ga-enwe n’ụlọ akwụkwọ. (Ilu 22:3) Wepụta ohere gụọ ndụmọdụ na aro ndị si n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị e dere n’akwụkwọ “Ndị Na-eto eto Na-ajụ,” nke mbụ na nke abụọ ya. Gụọkwa isiokwu ndị ọzọ gbasara ndị na-eto eto e bipụtara na Teta!
3. Olee ụzọ ndị ị ga-esi agba àmà n’ụlọ akwụkwọ unu?
3 E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi agba àmà n’ụlọ akwụkwọ unu. Mgbe ndị ọzọ na-ahụ otú i si eji ejiji dị mma, àgwà ọma ị na-akpa, ùgwù ị na-akwanyere ụmụ akwụkwọ ibe gị na ndị nkụzi unu, nakwa otú i si eme nke ọma n’akwụkwọ, ma chọpụta na a zụrụ gị nke ọma, ụfọdụ nwere ike jụọ gị, sị, “Olee ihe mere i ji dị iche?” (Mal. 3:18; Jọn 15:19; 1 Tim. 2:9, 10) I nwere ike ijizi ohere ahụ zie onye ahụ ozi ọma ma kọwaara ya ihe ndị i kweere. N’ụlọ akwụkwọ unu, e nwere ike inwe mgbe a ga-agwa gị ka ị gụọ ukwe e ji eto mba nakwa ka i soro mee ememme ụfọdụ. Ọ bụrụ na a jụọ gị ihe mere ị naghị eme ihe ndị ahụ, ị̀ ga-asị, “Anyị anaghị eme ya; abụ m Onyeàmà Jehova,” ka ị̀ ga-eji ohere ahụ zie onye ahụ ozi ọma banyere Nna gị hụrụ gị n’anya, bụ́ Jehova? Ị ga-enwe ike ịgbara ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị nkụzi na ndị ọzọ ezigbo àmà ma ọ bụrụ na ị kwadebere nke ọma ma rịọ Jehova ka o nyere gị aka.—1 Pita 3:15.
4. Olee ihe mere obi ji sie gị ike na ihe ga-agara gị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ unu?
4 Ọ bụ eziokwu na ụjọ ibido akwụkwọ nwere ike na-atụ gị, ka obi sie gị ike na e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ka ị ghara inwe nsogbu n’ụlọ akwụkwọ, ha dịkwa njikere inyere gị aka. Obi dịkwa anyị ụtọ otú ọ dị gị na ị ga-enwe ọtụtụ ohere ị ga-eji zie ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ unu ozi ọma. N’ihi ya, jikere ibido akwụkwọ, ụjọ atụkwala gị!