Agbachila Nkịtị
1. Gịnị ka anyị kwesịrị ịkata obi mee, ọ̀ bụkwa maka gịnị?
1 Ọ̀ dịtụla mgbe ị gbachiri nkịtị n’ụlọ akwụkwọ unu, ghara izi ụmụ akwụkwọ ibe gị ozi ọma, n’ihi na i chere na ha ga-akwa gị emo? Ọ bụrụ na ị chọrọ izi ụmụ akwụkwọ ibe gị ozi ọma, ị ga-ebu ụzọ kata obi, nke ka nke, ma ị bụrụ onye ihere. Gịnị ga-enyere gị aka?
2. Ọ bụrụ na ị chọrọ izi ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ unu, olee otú ị ga-esi egosi na ị dị akọ?
2 Dịrị Akọ: Ọ bụ eziokwu na e nwere ike ịsị na ụlọ akwụkwọ unu bụ ebe pụrụ iche i kwesịrị ịna-ezi ozi ọma, cheta na ọ bụghị onye ọ bụla ị hụrụ ka ị ga-aga ziwe ozi ọma otú ahụ ị na-eme ma ị gaa ozi ọma. Jiri ọgụgụ isi gị mara mgbe i kwesịrị izi mmadụ ozi ọma. (Ekli. 3:1, 7) Ihe a na-akụziri unu na klas ma ọ bụ ihe omume onye nkụzi unu gwara unu mee n’ụlọ nwere ike ịbụ ihe ị ga-eji malite izi mmadụ ozi ọma. Nwa akwụkwọ ibe gị nwekwara ike ịjụ gị ihe mere ị naghị eso eme nke a ma ọ bụ nke ọzọ. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-agakwuru ndị nkụzi ha ná mmalite afọ, nye ha akwụkwọ ndị kwuru ihe ndị anyị kweere ma gwa ha na ha bụ Ndịàmà Jehova. E nwekwara ndị nke na-edewe akwụkwọ anyị n’elu lọka ha, ka ụmụ akwụkwọ ibe ha nwee ike ịjụ ha ajụjụ gbasara akwụkwọ ahụ.
3. Olee otú ị ga-esi ejikere izi ụmụ akwụkwọ ibe gị ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ unu?
3 Jikere Ejikere: Ọ bụrụ na i jikeere ejike izi ndị mmadụ ozi ọma, obi ga-aka gị ịgwa ha okwu. (1 Pita 3:15) N’ihi ya, chee echiche ụdị ajụjụ e nwere ike ịjụ gị, gbaakwa mbọ mata otú ị ga-esi zaa ya. (Ilu 15:28) Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị mee, na-eji Baịbụl gị na akwụkwọ anyị ụfọdụ aga ụlọ akwụkwọ. O nwere ike bụrụ akwụkwọ Reasoning, akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, nakwa ndị ọzọ na-ekwu gbasara ihe e kere eke. Akwụkwọ ndị a nwere ike ịbara gị uru mgbe ị na-ezi mmadụ ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ unu. Gwa papa gị na mama gị ka ịmụgharị otú e si ezi ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ soro n’ihe unu ga na-amụ n’ofufe ezinụlọ unu.
4. Gịnị mere i ji kwesị ịna-ezi ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ unu?
4 Tụọ Anya na Ha Ga-ege Gị Ntị: Echela na ụmụ akwụkwọ unu ga-akwa gị emo mgbe ọ bụla i ziwere ha ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịja gị mma maka otú i si kata obi na-ezi ha ozi ọma, ha nwekwara ike gee gị ntị. Ọ bụrụgodị na o nweghị onye n’ime ha kwere ege gị ntị, obi ajọla gị njọ. Obi ga-adị Jehova ụtọ na ị gbara mbọ. (Hib. 13:15, 16) Na-arịọ ya n’ekpere ka o nyere gị aka ka ị “nọgide na-ekwu okwu [ya] n’atụghị egwu ọ bụla.” (Ọrụ 4:29; 2 Tim. 1:7, 8) Ị manụ na e nwee onye gere gị ntị, obi ga-adị gịnwa ezigbo ụtọ. Onye ahụ nwedịrị ike mechaa bụrụ Onyeàmà Jehova.