Ndị Ntorobịa—Jirinụ Agụmakwụkwọ Unu Na-eme Ihe
1 Olee otú ọ na-adị gị ịlaghachi n’ụlọ akwụkwọ mgbe ị nọsịrị ogologo ezumike? Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike irite uru site n’afọ agụmakwụkwọ ọzọ? Ị̀ ga-eji ohere ụlọ akwụkwọ na-enye gị soro ụmụ klas gị na ndị nkụzi gị kerịta eziokwu ahụ? Anyị nwere obi ike na ị chọrọ ime ike gị nile n’ụlọ akwụkwọ.
2 Bụrụ Ezi Nwa Akwụkwọ: Ọ bụrụ na ị na-akwadebe nke ọma mgbe ị na-aga ọmụmụ ihe ma na-aṅa ntị nke ọma, ị ga-enweta abamuru na-adịte aka. Na-adị uchu n’ime ihe omume a na-eme n’ụlọ, ma ekwela ka ọrụ ụlọ akwụkwọ gị gbochie ihe omume ọchịchị Chineke.—Fil. 1:10.
3 Malite afọ agụmakwụkwọ ọhụrụ site n’ịgụ broshuọ ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ. Mgbe ahụ, gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị kwesịrị inye onye nkụzi gị ọ bụla otu. Mee ka ha mara na a ga-aza ajụjụ ọ bụla ha pụrụ inwe. Nke a ga-enyere ha aka ịghọta ụkpụrụ na nkwenkwe gị karị ma soro gị rụkọọ ọrụ ka ị na-etinye ihe ndị a kụziwooro gị n’ọrụ. Ọ ga-emekwa ka ndị nkụzi gị jide n’aka na gị na ndị mụrụ gị chọrọ iso ha rụkọọ ọrụ ka ha na-enyere gị aka inweta mmụta bara uru.
4 Bụrụ Ezi Onyeàmà: Gịnị ma i were ụlọ akwụkwọ dị ka ókèala gị maka ịgba àmà mberede? N’afọ agụmakwụkwọ na-abịanụ, ị ga-enwe ohere ndị pụrụ iche ịgba àmà. I nwere ihe ọmụma ime mmụọ magburu onwe ya nke pụrụ ‘ịzọpụta gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị,’ mgbe i sooro ndị ọzọ kerịta ya. (1 Tim. 4:16) Site n’ịnọgide na-akpa àgwà ọma nke ndị Kraịst na site n’ịgba àmà mgbe ọ bụla o kwesịrị ekwesị ime otú ahụ, ị ga-abara onwe gị na ndị ọzọ uru.
5 Otu nwanna nwoke na-eto eto gbaara ụmụ akwụkwọ ibe ya nọ n’ụlọ akwụkwọ ya àmà mberede. Otu onye Katọlik, otu onye na-ekweghị na Chineke bụ́ onye na-emebu ndị kwere na Chineke akaje, na otu onye ntorobịa bụ́ onye na-adịghị esepụ aka n’ise siga na onye na-aṅụ oké mmanya so ná ndị gere ntị. Ná ngụkọta, nwanna nwoke a na-eto eto nyeere mmadụ 15 n’ime ndị ọgbọ ya aka ime nraranye na baptism!
6 Ya mere ndị ntorobịa, tinyenụ onwe unu n’ịmụ ihe na ịrụ ọrụ n’ókèala ịgba àmà unu pụrụ iche. Mgbe ahụ unu ga-enweta abamuru kasịnụ site n’ịga akwụkwọ.