Nweta Ihe Kasị Mma n’Ụlọ Akwụkwọ
1 Nke a bụ oge n’afọ mgbe ọtụtụ ndị ntorobịa na-ajụ, sị: “M̀ kwesịrị ịlaghachiworị n’ụlọ akwụkwọ?” Ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ụfọdụ ihe ịma aka na nchegbu ndị ịlaghachi n’ụlọ akwụkwọ na-eweta, e nwekwara ọtụtụ uru ndị na-eto eto na-arụsi ọrụ ike iji nweta ihe kasị mma n’agụmakwụkwọ ha ga-erite.
2 Agụmakwụkwọ bụ isi dị mma pụrụ ịtụnye ụtụ n’ọganihu ime mmụọ mmadụ. Ihe mmadụ mere n’oge ntorobịa ya nwere mmetụta dị ukwuu n’ihe ọ pụrụ imezu dị ka onye toworo ogo mmadụ. Ọbụna n’ihe banyere agụmakwụkwọ, “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” (Gal. 6:7) Ndị ntorobịa ndị ji ịdị uchu na-amụ ihe omume ụlọ akwụkwọ ha pụrụ inweta nkà ndị pụrụ ime ka ha bakwuoro Jehova uru.
3 Iji nlezianya chebara ọdịnihu echiche dị mkpa ma ọ bụrụ na mmadụ ga-eme nhọrọ ndị ziri ezi banyere ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịhọrọ ndị kasị na-enye ọzụzụ bara uru iji ruo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ dị iche iche ná ndụ. Site n’ịzụlite nkà ha, ndị ntorobịa ga-anọ n’ọnọdụ dị mma inwe ike ịkwado onwe ha n’ọrụ ọsụ ụzọ. Agụmakwụkwọ ha bụ isi kwesịrị inyere ha aka ito Jehova n’agbanyeghị ebe ha na-eje ozi.
4 Ndị na-eto eto, gbalịanụ inweta ihe kasị mma n’afọ agụmakwụkwọ unu. N’ime nke ahụ, lekwasịnụ anya n’ibi ndụ na-eju afọ n’ozi dị nsọ, kama ịchụso ọrụ ụwa. Gbalịanụ iji ndụ unu na-eme uche Jehova. N’ụzọ dị otú a, unu ga-eme ka ụzọ unu gaa nke ọma, bụ́ nke ga-enye Jehova otuto.—Abụ Ọma 1:3.