Agụmakwụkwọ Ụwa na Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Gị
1 Inweta agụmakwụkwọ bụ́ isi mgbe ị bụ onye na-eto eto pụrụ ime ka i nwee nkà mmụta dị mkpa maka ịgụ na ide ihe nke ọma nakwa inweta ihe ọmụma zuru ezu banyere nkà mmụta ọdịdị mbara ala, akụkọ ihe mere eme, mgbakọ na mwepụ, na sayensị. Ka ị na-eme nke ahụ, ị pụrụ ịmụta otú e si eche echiche nke ọma, atụle ihe, edozi nsogbu, na otú e si echepụta ihe ndị ga-aba uru. Agụmakwụkwọ dị otú ahụ ga-abara gị uru ná ndụ gị nile. Olee otú agụmakwụkwọ ụwa i nwetara pụrụ isi metụta ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị ná ndụ ma nyere gị aka inweta “nzube ihe na izuzu”?—Ilu 3:21, 22.
2 Ghọọ Onye Bara Uru n’Ozi Chineke: Mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ, gee ntị na klas ma mee ihe omume ndị e nyere gị ime n’ụlọ nke ọma. Ọ bụrụ na ị mụta ka e si agụ na ka e si amụ ihe nke ọma, ị pụrụ inyocha Okwu Chineke n’ụzọ dị mfe karị ma sie ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ọrụ 17:11) Ihe ọmụma zuru ezu ga-enyere gị aka isoro ndị nwere nzụlite, mmasị, na nkwenkwe dịgasị iche mekọrịta ihe ka ị na-ezute ha n’ozi. Agụmakwụkwọ ị na-enweta n’ụlọ akwụkwọ ga-aba uru ka ị na-ebu ibu ọrụ ndị Kraịst gị ná nzukọ Chineke.—Tụlee 2 Timoti 2:21; 4:11.
3 Mụta Ịkwado Onwe Gị: Ọ bụrụ na i tinye mgbalị, ị pụkwara ịmụta nkà ndị dị mkpa iji na-akpata ihe ndị e ji ebi ndụ mgbe ị gụchara akwụkwọ. (Tụlee 1 Timoti 5:8.) Jiri nlezianya họrọ ihe ndị ị ga-agụ. Kama ịgụ ihe na-agaghị enyechara gị aka inweta ọrụ, tụlee ịmụ ọrụ ma ọ bụ nkà ga-enyere gị aka inweta ọrụ kwesịrị ekwesị n’ebe ọ bụla. (Ilu 22:29) Ọzụzụ dị otú ahụ ga-eme ka o kwe gị omume ịkwado onwe gị ma ọ bụrụ na i kpebie ije ozi n’ebe mkpa ka ukwuu.—Tụlee Ọrụ 18:1-4.
4 Inweta agụmakwụkwọ bụ́ isi nke dị mma mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ pụrụ inyere gị aka ịmụba ozi gị. Rụsie ọrụ ike iji nweta nkà ndị dị mkpa iji kwado onwe gị ka ị na-aga n’ihu n’ozi Jehova. N’ụzọ dị otú a agụmakwụkwọ gị ga-enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị.