Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 2/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tụlee Okwu Jehova Kwa Ụbọchị!
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Iji Ọṅụ Na-atachi Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Nọgidesie Ike Dị Ka Ị Na-ahụ Onye Ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 2/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka Aịsaịa 30:21 ji kwuo na ị ga-anụ okwu Jehova “n’azụ gị,” ebe amaokwu bu ya ụzọ na-egosi na Jehova nọ n’ihu site n’ikwu, sị, “Anya gị abụọ ga na-ahụ [“Onye Ozizi Kasị Ukwuu,” NW] gị”?

Aịsaịa 30:20, 21 na-agụ, sị: “[Onye Ozizi Kasị Ukwuu] gị agaghị ezobe onwe [ya] ọzọ, kama anya gị abụọ ga na-ahụ [Onye Ozizi Kasị Ukwuu] gị: ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.”

N’ịkọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n’ụzọ nkịtị, onye na-agụ ya na-ahụ Jehova, bụ́ Onye Ozizi Kasị Ukwuu ya, n’ihu ya ma ọ na-anụ olu Ya n’azụ ya. Otú ọ dị, okwu ndị ahụ bụ ihe atụ, e kwesịkwara ịghọta ha dị ka okwu ihe atụ.

Atụmatụ okwu nke amaokwu nke 20 na-echetara mmadụ bụ banyere ohu nke na-ejere onye nwe ya ozi, dị njikere mgbe nile ime ihe nna ya ukwu kwuru. Dị ka ohu nke legidesiri anya ike n’aka onye nwe ya iji ghọta ihe ọ ga-egosi na ọ bụ uche ya, ndị ohu Jehova taa legidesiri nnọọ anya ike ná ntụziaka na-aga n’ihu n’ihu dabeere na Bible nke Jehova na-enye ha site ná nzukọ ya nke elu ala. (Abụ Ọma 123:1, 2) Ee, ha na-agbaso nduzi ya, mụrụ anya ịmata ihe ọ bụla Jehova ga-ekwu site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.”—Matiu 24:45-47.

Mgbe ahụ, olee banyere okwu ahụ ndị ohu ya na-anụ n’azụ ha? Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na okwu ahụ a na-anụ n’azụ bụ okwu Chineke, ndị o kwuru n’oge gara aga, ndị ọ na-ekwu site n’Okwu ya e dere ede, ka “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” na-eme ka a ghọta ha. (Luk 12:42) Ndị ohu Chineke nke oge a na-anụ olu ya site n’iji ịdị uchu na-amụ Bible na site n’itinye ụkpụrụ ndị dị n’ime ya n’ọrụ ná ndụ ha site n’enyemaka nke mbipụta ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwere uche,” bụ́ “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” na-akwadebe. Site n’ịdabere na, na ịmụrụ anya maka nduzi na-abịa n’ezi oge nke Onye Ozizi Kasị Ukwuu ahụ na-enye nakwa site n’ịmụ Okwu Chineke, nke e dere ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị ohu ya na-ahụ ya n’ihu ha ma na-anụ olu ya n’azụ ha n’ụzọ ihe atụ.—Ndị Rom 15:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya