Ndị Isi Ezinụlọ—Nọgidenụ Na-enwe Usoro Ihe Omume Ime Mmụọ Dị Mma
1 N’agbanyeghị na o biri n’etiti ikpere arụsị na omume rụrụ arụ nke Babilọn ruo ọtụtụ iri afọ, a ma Daniel ama dị ka onye na-efe Jehova “mgbe nile.” (Dan. 6:16, 20) Olee otú o si nwee ike ịnọgide jiri ihe ime mmụọ na-akpọrọ ihe? Ihe ndekọ Bible na-egosi na o nwere usoro a haziri nke ọma nke ime ihe ndị metụtara ezi ofufe. Dị ka ihe atụ, ọ na-anọkarị n’ụlọ elu ya ekpe ekpere ugboro atọ kwa ụbọchị. (Dan. 6:10) Obi abụọ adịghị ya na o nwekwara usoro o guzobeworo maka ime ihe omume ime mmụọ ndị ọzọ, dị ka ịgụ Iwu ahụ. N’ihi ya, mgbe ọnwụnwa nke na-eyi ndụ egwu chere ya ihu, Daniel guzosiri ike n’ofufe ọ na-efe Jehova, a napụtakwara ya n’ụzọ ọrụ ebube.—Dan. 6:4-22.
2 N’otu aka ahụ taa, anyị aghaghị itinyesi mgbalị ike iji ‘jiri ịnọgidesi ike nile na-amụ anya.’ (Efe. 6:18) Ụwa anyị bi n’ime ya dị “n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Mmegide ma ọ bụ ọnwụnwa pụrụ ịbịa na mberede ma tinye okwukwe anyị n’ule. N’oge oké mkpagbu ahụ, Gọg nke Megọg ga-ebuso ndị ohu Chineke agha kpụ ọkụ n’ọnụ, nke ga-eyi ka ọ bụ na e nweghị ụzọ isi gbapụ na ya. Nke a ga-achọ ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu.—Ezik. 38:14-16.
3 “Otu isi ihe dị mkpa bụ ime ka ọgụgụ, ọmụmụ, na nkwurịta okwu Bible di irè nke ezinụlọ bụrụ ụzọ ịdị ndụ.” Nke ahụ bụ ihe e kwuru n’okwu mmeghe nke ihe nkiri e mere ná mgbakọ distrikti nke 1998, nke isiokwu ya bụ “Ezinụlọ—Meenụ Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị Ụzọ Ndụ Unu!” Ọ gara n’ihu, na-asị: “Mgbe ezinụlọ na-agbasochi ihe omume dị otú ahụ anya nakwa n’ụzọ na-eme ka Bible na-akpali akpali, usoro ime ihe a dabeere na Bible pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ezinụlọ. Ọ na-ewulite ihe ọmụma anyị. Ọ na-ewusi okwukwe anyị ike. Ọ na-enyekwa anyị ndị bụ ihe nlereanya—ezi ndị ikom na ndị inyom nke oge gboo kwesịrị ntụkwasị obi—ndị pụrụ ịkpali anyị, na-akwali anyị ịkwado eziokwu.” Ka anyị na-atụle akụkụ dị iche iche nke usoro ihe omume ime mmụọ dị mma, ndị isi ezinụlọ kwesịrị ịchọ otu ụzọ ma ọ bụ abụọ nke isi mee ka usoro ihe omume ime mmụọ ezinụlọ ha ka mma.
4 Na-atụle Okwu Chineke Kwa Ụbọchị: “Mgbe Alaeze Chineke ga-achị n’enweghị onye ga-ama ya aka, e meekwa uche ya n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe, a gaghị enwe ụmụ mmadụ obi tara mmiri—ee e, a gaghị enwe ọbụna ụmụ anụmanụ—ndị ‘ga-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ bibie ihe.’ (Aịsa. 11:9; Mat. 6:9, 10)” E kwuru ihe ndị ahụ n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2001, n’okwu nkọwa nke akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke September 11. Lee ihe na-akasi obi ihe ncheta a bụ! Dị ka onyeisi ezinụlọ, ọ̀ bụ ihe maara gị ahụ́ iso ezinụlọ gị tụlee otu akụkụ Bible na nkọwa ya kwa ụbọchị? Nke a bara uru nke ukwuu. Ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe unu omume ịbịakọta ọnụ n’ụtụtụ, ikekwe unu pụrụ ime otú ahụ n’oge ọzọ n’ụbọchị ahụ. Otu nna kwuru, sị: “Nri anyasị abụrụwo oge dị mma nye anyị ịtụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị.”
5 Ọ bụrụ na unu nwere usoro ihe omume dị mma maka ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị dị ka ezinụlọ, o kwesịrị ka a jaa unu mma. Ma eleghị anya unu pụrụ iritekwu uru site n’ịgụ otu akụkụ Bible n’otu oge ahụ. Ụfọdụ mere ya ka ọ bụrụ ihe ha na-eme mgbe nile ịgụ isiakwụkwọ dum e si na ya nweta ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ. Ndị ọzọ na-agụ ya n’ụdị ha gụsịa otu isiakwụkwọ ha abanye n’ọzọ, na-agụ akwụkwọ ndị ha họọrọ na Bible n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. Ịgụ Bible kwa ụbọchị ga-enyere ezinụlọ gị aka ịzụlite ezi ịtụ egwu imejọ Jehova, ọ ga-emekwa ka ọchịchọ ha nwere ime uche ya sikwuo ike.—Deut. 17:18-20.
6 Usoro ọgụgụ Bible nke ezinụlọ gị na ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ga-abara ha uru ọbụna karị ma ọ bụrụ na unu pụrụ iji minit ole na ole tụlee uru dị n’itinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ. Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 60, na-atụ aro a: “Unu nwere ike ịhọrọ amaokwu ole na ole n’ọgụgụ Bible e dokwara maka izu, tụlee ihe ha pụtara, mgbe ahụkwa jụọ ajụjụ ndị dị ka ndị a: ‘Olee otú nke a ga-esi nye anyị nduzi? Olee otú anyị ga-esi jiri amaokwu ndị a mee ihe n’ozi? Gịnị ka ha na-ekpughe banyere Jehova na ụzọ o si eme ihe, oleekwa otú nke ahụ si eme ka anyị nwee ekele n’ebe ọ nọ karị?’” Nkwurịta okwu dị otú ahụ banyere ihe ime mmụọ ga-enyere ndị nile nọ n’ezinụlọ gị aka ‘ịnọgide na-aghọta ihe uche Jehova bụ.’—Efe. 5:17.
7 Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ: Iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ kwa izu bụ ụzọ dị mma ndị isi ezinụlọ ga-esi gosi ụmụ ha na ihe ime mmụọ na-ebute ụzọ. Otu nwa okorobịa na-echeta, sị: “Mgbe ụfọdụ ike na-agwụ papa anyị nke ukwuu mgbe ọ lọtara ọrụ nke na ọ na-esiri ya ike ịmụrụ anya, ma n’agbanyeghị nke ahụ, a na-enwe ọmụmụ ihe ahụ, nke a nyekwaara anyị aka ịghọta na ọ bụ ihe dị oké mkpa.” Ụmụaka pụkwara ịtụnye ụtụ n’ime ka ndokwa ahụ na-aga nke ọma. Otu ezinụlọ nke nwere ụmụ itoolu na-ebili n’elekere anya ise iji nwee ọmụmụ ihe ezinụlọ ha n’ihi na ọ dịghị oge ọzọ ọ ga-ekwe ha omume.
8 Iji mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ dị irè, onyeisi ezinụlọ aghaghị ịdị ‘na-elezi ozizi ya anya mgbe nile.’ (1 Tim. 4:16) Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 32, na-ekwu, sị: “A pụkwara ikwu na ọmụmụ ihe ezinụlọ nke dị irè na-amalite site n’ịmụta ezinụlọ gị n’onwe ya nke ọma. Olee ọganihu ndị ezinụlọ gị na-enwe n’ụzọ ime mmụọ? . . . Mgbe gị na ụmụ gị nọ n’ozi ubi, ahụ́ ọ̀ na-eru ha ala ịkọwa onwe ha n’ihu ndị ọgbọ ha dị ka Ndịàmà Jehova? Usoro unu nwere maka ọgụgụ Bible ezinụlọ ọ̀ na-amasị ha? Hà na-anakwere ụzọ Jehova n’ezie dị ka ụzọ ndụ ha? Ileru anya nke ọma ga-ekpughe ihe ndị dị mkpa ka i mee dị ka onyeisi ezinụlọ iji guzobe ma wulite àgwà ime mmụọ n’ime onye nke ọ bụla n’ezinụlọ gị.”
9 Nzukọ Ọgbakọ: Ịkwadebe na ịga nzukọ ọgbakọ kwesịrị ịbụ akụkụ dị mkpa n’usoro ihe omume unu kwa izu. (Hib. 10:24, 25) Mgbe ụfọdụ, unu nwere ike ịkwadebe maka nzukọ ụfọdụ dị ka ezinụlọ. Kama ichere ruo mgbe oge na-afọkwaghị, ùnu pụrụ ime ndokwa ịkwadebe ogologo oge tupu oge eruo? Inwe usoro ihe omume a haziri ahazi n’akụkụ a ga-eme ka nkwadebe unu ka mma nakwa ka uru unu na-erite ná nzukọ bukwuo ibu.—Ilu 21:5.
10 Ihe ndị e ji amata usoro ihe ime mmụọ dị irè bụ otú ọ dịruru mma nakwa ịgbasochi ya anya. Gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ gị emee ka o siere gị ike ịkwadebe maka nzukọ nile? Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 31, na-atụ aro a: “Zere ọnyà nke iji oké ọsọ ọsọ mụọ ihe ndị a ga-amụ nanị ka ọ bụrụkwa na i meela ya, ma ọ bụ nke ka njọ, amụghị nke ọ bụla n’ime ha n’ihi na ị pụghị ịmụcha ha nile. Kama nke ahụ, kpebie ókè ị pụrụ ịmụ ma mụọ ha nke ọma. Na-eme ya kwa izu. Ka oge na-aga, gbalịa imekwu ihe iji na-akwadebe nzukọ ndị ọzọ.”
11 Mgbe ezinụlọ dị iche iche bịara nzukọ n’oge, nke a na-enyere ha aka inwe ọnọdụ uche dị mma iji too Jehova ma rite uru site ná ntụziaka ọ na-enye. Nke a ọ̀ bụ ihe ezinụlọ unu na-eme mgbe nile? Ọ na-achọ ime ezi nhazi na ndị nile nọ n’ezinụlọ ịrụkọ ọrụ ọnụ. Ọ bụrụ na unu achọpụta na ezinụlọ unu na-emekarị ihe ọkụ ọkụ ma na-enwe nrụgide ọtụtụ mgbe n’ụbọchị ndị a na-enwe nzukọ, ùnu pụrụ ịhazigharịtụ usoro ihe omume unu? Ọ̀ dị ihe ndị a pụrụ ime tupu ụbọchị ahụ? Ọ bụrụ na otu onye n’ime ezinụlọ nwere ọtụtụ ihe ime, ndị ọzọ hà pụrụ inye aka? Ọ̀ ga-ebelata nrụgide ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ejikere ịga nzukọ minit ole na ole tupu oge eruo? Ime ezi nhazi na-enye aka eme ka e nwee mmụọ nke udo ma n’ime ezinụlọ ma n’ime ọgbakọ.—1 Kọr. 14:33, 40.
12 Ozi Ubi: Iwepụta oge maka ikere òkè n’ozi ubi bụ akụkụ ọzọ nke usoro ihe omume ime mmụọ dị mma. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jayson na-echeta, sị: “N’ezinụlọ anyị, ụtụtụ Saturday nile na-abụ maka ozi ubi. Nke a baara m uru n’ihi na ka m na-agakwu ozi, otú ahụ ka m na-ahụkwu ezi ihe na-esi na ya apụta, otú ahụ ka m na-enwekwa mmasị na ya.” Ọtụtụ ndị a zụlitere n’ezinụlọ Ndịàmà ekwuwokwa na inwe oge e setịpụrụ kpọmkwem kwa izu maka ozi ubi nyeere ha aka inwe ọganihu dị ka ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst.
13 Usoro ihe omume a haziri ahazi pụkwara inye aka mee ka oge ezinụlọ gị na-etinye n’ozi ubi bụrụ nke na-atọ ụtọ karị, na-arụpụtakwa ihe karị. Olee otú a pụrụ isi mezuo nke a? Ụlọ Nche nke July 1, 1999, peeji nke 21, tụrụ aro na-esonụ: “Ùnu na-eji oge unu nọ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ mgbe ụfọdụ enyere ndị òtù ezinụlọ unu aka ịkwadebe maka ozi ubi nke izu ahụ? Ime otú ahụ pụrụ ịba nnọọ uru. (2 Timoti 2:15) Ọ pụrụ inye aka ime ka ozi ha nwee nzube ma mịa mkpụrụ. Site n’oge ruo n’oge, unu pụrụ iwepụta otu oge ọmụmụ ihe dum maka ime nkwadebe dị otú ahụ. Ọtụtụ mgbe karị, unu pụrụ ịtụle akụkụ ndị metụtara ozi ubi ná nkwurịta okwu ndị ka mkpirikpi ná ngwụsị nke ọmụmụ ihe ezinụlọ ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ n’ime izu.” Ezinụlọ gị ọ̀ nwalewo nke a?
14 Nọgidenụ Na-enwe Ọganihu: Site n’ihe ndị a anyị tụlere, ùnu ahụwo akụkụ dị iche iche ezinụlọ unu na-eme nke ọma na ha? Jaanụ ha mma, ma gbalịa inwekwu ọganihu n’akụkụ ndị a. Ọ bụrụ na unu achọpụta ọtụtụ akụkụ ndị chọrọ imeziwanye ihe, họrọnụ otu ma ọ bụ abụọ unu ga-ebu ụzọ rụọ ọrụ na ha. Mgbe ha ghọrọ akụkụ nke usoro ihe omume ime mmụọ unu, rụọnụ ọrụ n’otu ma ọ bụ abụọ ọzọ. Nweenụ echiche ziri ezi. (Fil. 4:4, 5) Inwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma maka ezinụlọ unu na-achọ nnukwute mgbalị ma ihe ọ na-arụpụta ruru ya, n’ihi na Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”—Ọma 50:23.