OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị̀ Na-erite Uru n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị?
Ị̀ na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị? Ọ bụrụ na ị naghị eme ya, ì nwere ike ime ka o soro n’ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị? Ọtụtụ ndị na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ ka ha nwee ike ichebara ihe ha gụrụ na ya echiche ka ha na-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị. (Jọsh. 1:8; Ọma 119:97) Olee otú i nwere ike isi mụtakwuo ihe n’amaokwu Baịbụl e si nweta ihe mmụta dịịrị ụbọchị? Gụọ amaokwu ndị gbara amaokwu ahụ gburugburu ma jiri ya ghọtakwuo ihe a na-akọ banyere ya. Chee banyere akụkọ Baịbụl kwuru gbasara ihe amaokwu ahụ na-akụzi. I mechaa, gị emee ihe ndị ị mụtara. I jiri Okwu Chineke na-eme mkpebi ndị ị na-eme, ọ ga-abara gị uru ma na-eduzi gị.—Ọma 119:105.
Ezinụlọ Betel n’ụwa niile na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’oge ha ji eri nri ụtụtụ. Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, a na-etinyezi ha n’Ihe omume tiivi anyị, n’ebe e dere NNỌKỌ ANYỊ DỊ ICHE ICHE. Olee mgbe ikpeazụ i lere ha? O nwere ike ịbụ na ihe e kwuru n’ụfọdụ n’ime ha bụ nnọọ ihe dị gị mkpa. Dị ka ihe atụ, olee otú akụkọ Lọt nwere ike isi nyere gị aka ma i mewe mkpebi?
LEENỤ VIDIO BỤ́ AHỤLA ỤWA N’ANYA (1 JỌN 2:15), ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ụkpụrụ Baịbụl e kwuru okwu ya n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ?
Olee otú akụkọ Lot si gosi nsogbu dị n’ịhụ ụwa na ihe ndị dị na ya n’anya?—Jen. 13:12; 14:12; 19:3, 12, 13, 24-26
Olee otú anyị nwere ike isi gosi na ọ bụ Jehova ka anyị hụrụ n’anya, ọ bụghị ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị na ya?
Gịnị ka m ga na-eme n’oge ọ bụla n’ụbọchị iji gosi na m ji Okwu Jehova kpọrọ ihe?