Echela na Ị Gaghị Enwe Ohere Ị Ga-eji Mụọrọ Mmadụ Baịbụl
1. Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịgwa mmadụ ka ha na ya mụwa Baịbụl?
1 Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịgwa mmadụ ka ha na ya mụwa Baịbụl. Ihe kpatara ya bụ na ha anaghị enwe ohere. Mmadụ inyere onye ọ na-amụrụ Baịbụl aka na-ewe oge hiri nne. Onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl ga-ewepụta oge kwadebe ihe ha ga-amụ. Ọ ga-ewepụtakwa oge ha ga-eji mụọ ihe. Enweekwa ihe ndị na-eme ka ọ na-esiri onye ahụ ike ịna-eme ihe a na-akụziri ya, ọ ga-ewepụtakwa oge nyere ya aka ịma otú ọ ga-esi na-eme ihe ọ na-amụta. Pọl onyeozi kwuru na ya nyere mkpụrụ obi ya n’ihi ndị Tesalonaịka ka ya nwee ike inyere ha aka ịmara Jehova. (1 Tesa. 2:7, 8) Olee otú anyị ga-esi na-amụrụ mmadụ Baịbụl ọ bụrụgodị na anyị anaghị enwe ohere?
2. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, olee ihe anyị ga-eji oge anyị na-eme?
2 Ife Jehova Na-ewe Oge Hiri Nne: Nke bụ́ eziokwu bụ na ife Jehova na-ewe oge hiri nne. Dị ka ihe atụ, anyị na-ewepụtakarị oge anyị na-eji aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Anyị na-ewepụtakwa oge anyị na-eji agụ Baịbụl, na oge anyị na-eji ekpe ekpere. Ọ bụrụ na mmadụ nwere di ma ọ bụ nwunye ma ọ naghị enwe ohere, obi na-adị ya ụtọ iwepụta oge ha abụọ ga-eji na-anọ. Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye nwere ike ime otú a, í cheghị na obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ ‘ịna-azụtara’ onwe anyị oge anyị ga-eji na-efe Jehova? Anyị kwesịrị ịna-eme otú a n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya. (Efe. 5:15-17; 1 Jọn 5:3) Jizọs kwuru na otu n’ime ụzọ ndị dị mkpa anyị si efe Chineke bụ ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụrụ na anyị eburu ya n’obi, ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl ga-adịrị anyị mfe.
3. Olee otú anyị ga-esi na-amụrụ mmadụ Baịbụl ọ bụrụgodị na o nwere ihe na-eme ka ịga ozi ọma na-esiri anyị ike?
3 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ịkpa afọ anyị, ọrịa, ma ọ bụ ọrụ ndị anyị nwere n’ọgbakọ anaghị ekwe anyị gaa mụọrọ mmadụ Baịbụl? Ụfọdụ ndị nkwusa na-anaghị anọkarị n’ụlọ na-eji fon ma ọ bụ Ịntanet amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ndị nke ọrịa na-anaghị ekwe apụ apụ na-agwa ndị ha na-amụrụ Baịbụl ka ha na-abịa n’ụlọ ha. Ụfọdụ na-agwakwa onye nkwusa ka ọ gaa mụọrọ onye ha na-amụrụ Baịbụl ihe ma ọ bụrụ na ha agaghị anọ ya.
4. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-ewepụta ohere na-aga amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?
4 Pọl wepụtara oge gaa kụziere ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl. Nke a mekwara ya obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) O kelere Jehova mgbe o chetara ndị niile ọ kụziiri eziokwu na Tesalonaịka. (1 Tesa. 1:2) Obi ga-adịkwa anyịnwa ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-ewepụta ohere na-aga amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.