Alala Azụ!
1. Olee otú anyị si egosi na anyị ‘anaghị ala azụ ime ezi ihe’?
1 Ọ bụrụ na anyị so na-ekwusachi ozi ọma Alaeze Chineke anya, anyị na-egosi na anyị ‘anaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị bi n’ókèala anyị nọ [ma ọ bụ, anyị ‘anaghị ala azụ imere ha ihe ọma’].’ (Ilu 3:27) Ọ dịghị ozi ka mma a ga-ezi ụmụ mmadụ karịa ịgwa ha na ihe ga-akara ha mma n’oge ọchịchị Chineke. Ọ bụ ezie na o nwere ike ịbụ na ị na-agwa ọtụtụ mmadụ banyere Alaeze ahụ anyị na-atụ anya ya site n’ịgba àmà ebe ọ bụla ị nọ ma ọ bụ site n’inye ndị mmadụ akwụkwọ, gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịmalite iduziri mmadụ ọmụmụ Bible, ma ọ bụrụ na ọ dịghị nke ị na-eduzi ugbu a?
2. Olee ihe nwere ike ime ka anyị na-ala azụ ịmalite iduziri mmadụ ọmụmụ Bible?
2 Mgbe ụfọdụ, otu n’ime ihe ndị na-akasị egbochi anyị iduzi ọmụmụ Bible bụ otú anyị si ele ya anya. Ụfọdụ na-ala azụ iduzi ọmụmụ Bible n’ihi na ha na-eche na ha erughị eru ma ọ bụ n’ihi na ha anaghị enwe ohere. Aro ndị na-esonụ nwere ike inyere gị aka ịghara ịla azụ n’ọrụ iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible.—Mat. 28:19; Ọrụ 20:20.
3. Olee ihe mere anyị ji ruo eruo ịkụzi Bible?
3 Enweghị Obi Ike: O nwere ike ịbụ na ị gụghị oké akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ dị ihe ọzọ na-eme ka obi ghara isi gị ike na ị ga-eduziliri mmadụ ọmụmụ Bible. Ndị Kraịst narị afọ mbụ, bụ́ ndị kụziiri ndị mmadụ ihe nke ọma, bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” Olee ihe mere ka ha nwee ike ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ? “Ha na Jizọs nọburị.” (Ọrụ 4:13) Ha mụtara ihe n’aka Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs, bụ́ onye anyị ka nwere ike ịgụ banyere ozizi ya na otú o si kụzie ihe n’Akwụkwọ Nsọ. Ya bụrụgodị na ị gụghị oké akwụkwọ, ihe a na-akụziri gị banyere Chineke karịrị ihe ọ bụla ị ga-amụta n’ụlọ akwụkwọ.—Aịsa. 50:4; 2 Kọr. 3:5.
4. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Emọs?
4 N’oge ochie, Jehova ji ndị amụma ya dọọ ndị ọchịchị na-akpa àgwà ọjọọ na ndị ọzọ nọ n’ọkwá dị elu aka ná ntị mgbe ụfọdụ. Ụfọdụ n’ime ha, dị ka Emọs, esighị n’ezinụlọ a ma ama. Emọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye amụma m bụ, ọ dịghịkwa nwa onye amụma m bụ; kama onye nche ehi ka m bụ, ya na onye na-edozi mkpụrụ osisi sycomore.” (Emọs 7:14) N’agbanyeghị nke ahụ, Emọs alaghị azụ izi onye nchụàjà ahụ na-efe nwa ehi bụ́ Amazaịa ozi ikpe ọmụma Jehova. (Emọs 7:16, 17) Anyị aghaghị iburu n’uche mgbe nile na ọ bụ ọrụ Chineke ka anyị na-arụ, ọ ga-emekwa ka anyị ruo nnọọ eruo ịrụ ọrụ o nyere anyị ịrụ ugbu a.—2 Tim. 3:17.
5. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji gbalịa ịmalite iduziri mmadụ ọmụmụ Bible ma ọ bụrụgodị na anyị anaghị enwe ohere?
5 Enweghị Ohere: Ọ bụrụgodị na ị naghị enwe ohere, o nwere ike ịbụ na ị dịla mbụ wepụta oge ị ga na-eji eje ozi kwa ọnwa. Iduzi ọmụmụ Bible nwere ike iso n’ihe ndị kasị enye ọṅụ n’ozi anyị. Ọ bụ ihe ùgwù ịhụ ka Okwu Jehova na-akpa ike ná ndụ mmadụ. (Hib. 4:12) Obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị chụrụ ihe ụfọdụ n’àjà iji nyere mmadụ aka ‘ịbịaru ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Tim. 2:4) Ọbụna ndị mmụọ ozi na-aṅụrị ọṅụ mgbe mmadụ chegharịrị ma hapụ ndụ ọjọọ ọ na-ebibu ma nwewe ọganihu n’ofufe Chineke.—Luk 15:10.
6. Olee ọrụ pụrụ iche e nyere anyị ịrụ bụ́ nke na-emezu uche Chineke?
6 “Uche [Chineke bụ] ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Lee nnọọ ka o si bụụrụ anyị ihe ùgwù ịrụ ọrụ kwekọrọ n’uche Chineke, ghara ịla azụ iduzi ọmụmụ Bible!