Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Emọs Onye Amụma
1. Gịnị mere akụkọ banyere Emọs ga-eji gbaa anyị ume?
1 È nweela mgbe i chere na ị gaghị ezili ozi ọma n’ihi na ị gụghị akwụkwọ ma ọ bụkwanụ n’ihi na ị dara ogbenye? Ọ bụrụ na e nweela, akụkọ gbasara Emọs onye amụma nwere ike ịgba gị ume. Emọs na-azụ atụrụ, na-arụkwa ọrụ ugbo n’oge mkpụrụ osisi fig. N’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye, Jehova nyeere ya aka izi ndị mmadụ ozi dị mkpa. (Emọs 1:1; 7:14, 15) Taakwa, ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha so ná ndị na-ejere Jehova ozi. (1 Kọr. 1:27-29) Olee ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta n’aka Emọs onye amụma ndị nwere ike inyere anyị aka n’ozi anyị?
2. Gịnị mere anyị ga-eji nwee obi ike mgbe a na-akpagbu anyị?
2 Nwee Obi Ike Mgbe A Na-emegide Gị: N’oge Emọs na-ezi ndị mmadụ ozi Jehova ziri ya, e nwere onye nchụàjà aha ya bụ Amazaya. Ọ na-efe chi nwa ehi. Mgbe ọ nụrụ amụma Emọs na-ebu, ọ baara ya mba. Ihe ihe ọ gwara ya pụtara bụ: ‘Lawa! Enyela anyị nsogbu. Anyị nwere okpukpe nke anyị.’ (Emọs 7:12, 13) Mgbe Amazaya gara ịgwa Eze Jeroboam ka ọ chụpụ Emọs, ọ ghagidere ya ụgha. (Emọs 7:7-11) Ma, ihe ahụ o mere emeghị ka ụjọ tụwa Emọs. Taa, ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-agakwuru ndị ọchịchị ghaara ha ụgha ka wee mesie Ndịàmà Jehova ike. Ma, Jehova kwere anyị nkwa na ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso anyị ọgụ agaghị aga nke ọma.—Aịza. 54:17.
3. Olee ihe abụọ anyị na-agwa ndị mmadụ n’ozi ọma?
3 Na-ekwu Ihe Chineke Ga-eme Ndị Ọjọọ na Ihe Ọ Ga-emere Ndị Ezi Omume: Emọs buru amụma na Chineke ga-ebibi alaeze ebo iri nke Izrel. Ma, o kwukwara na Chineke ga-akpọghachi ndị na-erubere ya isi n’ala ha, gọziekwa ha. (Emọs 9:13-15) Anyị na-agwa ndị mmadụ na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ. Ma, ọ bụghị ya bụ naanị ihe anyị na-ezi ndị mmadụ n’ozi ọma. (2 Pita 3:7; Mat. 24:14) Ihe ọzọ anyị na-ezi ha bụ na Jehova ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs ma ya bibichaa ndị ajọ omume n’agha Amagedọn.—Ọma 37:34.
4. Olee ihe mere obi ji sie anyị ike na anyị ga-emeli uche Jehova?
4 Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, ọtụtụ ndị na-akpagbu anyị. Nke a nwere ike ime ka ike ozi ọma gwụ anyị ma ọ bụkwanụ mee ka anyị kwụsị ife Jehova. (Jọn 15:19) Ma, obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ime uche ya otú ahụ o si nyere Emọs aka.—2 Kọr. 3:5.