Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 16
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 16
Abụ nke 21 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 14 ¶8-13 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Kọrịnt 1-7 (Nkeji 10)
Nke 1: 2 Ndị Kọrịnt 1:15–2:11 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara—td 38A (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ka Mmadụ Ga-eme Ka O Nwee Ike Ịgbaba n’Aha Jehova?—Zef. 3:12 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee?—Nkebi nke Abụọ. Okwu. O si na traktị bụ́ Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? peeji nke 4 ruo nke 6. Jiri nkeji ole na ole gbaa onye malitere ozi oge niile mgbe ọ na-eto eto ajụjụ ọnụ. Olee ihe mere o ji hapụ ihe ọ chọburu ime malite ije ozi oge niile? Olee otú Jehova sirila gọzie mbọ niile ọ na-agba n’ozi ya?
Nkeji 10: Ihe Ị Ga-eme ma Naanị Gị Na-aga Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. (1) Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na e nweghị onye anyị na ya na-arụ n’ozi ọma? (2) Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ma naanị anyị gaa nletaghachi ka anyị ghara ịba ná nsogbu? (3) Olee ihe anyị nwere ike ime ka ndị nkwusa ndị ọzọ soro anyị na-aga ozi ọma ma ọ bụrụ na e nweghị onye ọzọ na-apụta ozi ọma n’ụbọchị ndị anyị ji aga ozi ọma? (4) Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ịga ozi ọma naanị anyị n’ebe ihe na-agaghị eme anyị. Olee uru ọ bara?
Nkeji 10: “Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?” Ajụjụ na azịza. Kwuo otú e si dee broshọ a na ihe ndị dị na ya.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke Mach 2013 peeji nke 3.
Abụ nke 107 na Ekpere