Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Nọvemba p. 31
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-amụchi Ihe Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-amụchi Ihe Anya
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?
    Teta!—2012
  • Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Echela na Ị Gaghị Enwe Ohere Ị Ga-eji Mụọrọ Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Nọvemba p. 31
Ebe otu nwanna nwaanyị ji laptọp ya, Baịbụl, na akwụkwọ e ji edetu ihe na-amụ ihe n’onwe ya. O ji chaatị isiokwu ya bụ “Mba Ndị Daniel Buru Amụma na Ha Ga-achị Ụwa” nke dị n’Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara Nke B9 ná “Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.”

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-amụchi Ihe Anya

È NWERE mgbe ọ na-esiri gị ike ịmụ ihe kwa izu? Ka è nwere mgbe ịmụ ihe na-anaghị atọ gị ụtọ? Ọ na-adị anyị niile otú ahụ mgbe ụfọdụ. Mana, chee banyere ihe ụfọdụ anyị na-eme kwa ụbọchị, dị ka ịsa ahụ́. Ịsa ahụ́ na-ewe oge. A na-agbakwara ya mbọ. Mana, anyị sachaa ya, ọ na-eme ka anyị nweta onwe anyị. Ịmụ Baịbụl nwekwara ike ịdị ka ebe anyị ‘ji okwu Chineke saa’ ahụ́, anyị enweta onwe anyị. (Efe. 5:26) Lee aro ụfọdụ nwere ike inyere gị aka:

  • Wepụta oge ị ga-eji na-amụ ihe. Ịmụ Baịbụl so ‘n’ihe ndị ka mkpa’ Onye Kraịst na-ekwesịghị ileghara anya. (Fil. 1:10) Iji mee ka ọ dịrị gị mfe icheta oge i wepụtara ị ga-eji mụọ ihe, ọ ga-adị mma ka i dee ya edee, dowe ya n’ebe ị ga na-ahụ ya. O nwekwara ike ịbara gị uru ma ị pịnye ekwentị gị otú ọ ga-agwa gị ma ọ fọ obere ka oge i ji amụ ihe ruo.

  • Chee gbasara ihe ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe ị na-amụ. Ọ̀ na-adịrị gị mfe ịmụ ihe ruo ogologo oge, ka ọ̀ bụ ịmụ ya obere obere? Ị ma ihe ga-akachara gị mma. Haziekwa otú i si amụ ihe ka ọ daba n’otú ihe si dịrị gị. Ọ bụrụ na ịmụ ihe anaghị agụ gị agụụ ma oge i ji amụ ihe ruo, i nwere ike ikpebi iji naanị nkeji iri mụọ ihe. Iji obere oge há otú ahụ mụọ ihe ga-abara gị uru karịa ịhapụ ya kpamkpam. I bidokwa ịmụ ihe, i nwere ike ịchọ ịmụrụ ya gawa.​—Fil. 2:13.

  • Họrọ isiokwu ndị ị ga-amụ tupu oge i ji amụ ihe eruo. Ọ bụrụ na ọ bụ n’oge ahụ ị chọrọ ịmụ ihe ka i bidoro iche ihe ị ga-amụ, o nwere ike ị gaghị ‘na-eji oge gị eme ihe kacha mkpa.’ (Efe. 5:16) Ọ ga-adị mma ka i dee isiokwu ndị ị ga-achọ ịmụ. Mgbe ọ bụla ajụjụ batara gị n’obi, dee ya edee. Ị mụchaa ihe, i nwere ike idetu ihe ndị ọzọ ị ga-achọ ịmụ.

  • Dịrị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ. Na-agbanwe otú i si amụ ihe. I nwere ike ịgbanwe nkeji ole i ji amụ ihe ma ọ bụkwanụ isiokwu ị na-amụ. Ihe dị mkpa abụghị mgbe ị mụrụ ihe, nkeji ole ị mụrụ ihe, ma ọ bụ ihe ị mụrụ, kama ọ bụ ka ị na-amụchi ya anya.

Ịmụchi ihe anya na-abara anyị uru. Ọ na-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma, mee ka anyị mụta ịna-eme mkpebi dị mma, na-emekwa ka anyị nweta ume.​—Josh. 1:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya