Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke September 6 ruo December 20,1999. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Jehova ekwewo ka ụmụ mmadụ na-achị onwe ha iji nwapụta na ụzọ O si achị ziri ezi mgbe nile, bụrụkwa nke ezi ikpe. (Deut. 32:4; Job 34:10-12; Jer. 10:23) [w97 2/15 p. 5 para. 3]
2. Bible na-egosi na Chineke na-akatọ ime mkpesa nile. [w97 12/1 p. 30 para. 3-4]
3. Ndị nne na nna na-edebe mmekọrịta ha na ụmụ ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị site n’ịghọta ụkpụrụ Chineke ndị metụtara ịbụisi na ezi usoro. (Jen. 2:24; 1 Kọr. 11:3; 14:33, 40) [fy p. 164 para. 6]
4. Mak 6:31-34 na-egosi na a kpaliri Jisọs inwe ọmịiko maka ìgwè mmadụ ahụ nanị n’ihi ọrịa na ịda ogbenye ha. [w97 12/15 p. 29 para. 1]
5. Ọ bụrụ na onye Kraịst so n’òtù atụrụ ọzọ ahụ enweghị ike ịga Ememe Ncheta onwụ Jisọs, o kwesịrị ime ya otu ọnwa mgbe ọ gasịrị n’ikwekọ n’ụkpụrụ ahụ e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 9:10, 11. (Jọn 10:16) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w93 2/1 p. 31 para. 9.]
6. Ọ bụ ezie na ndị nne na nna ochie bụ́ ndị Kraịst adịghị eweghara ibu ọrụ nke nne na nna ịkụbanye eziokwu Bible n’ime ụmụ ha, ndị nne na nna ochie pụrụ inye nkwado n’ịtụnye ụtụ n’uto ime mmụọ nke nwatakịrị. (Deut. 6:7; 2 Tim. 1:5; 3:14, 15) [fy p. 168 para. 15]
7. Ilu 6:30 na-egosi na a pụrụ ịgọpụrụ izu ohi ma ọ bụ lee ya anya dị ka ihe ziri ezi n’ọnọdụ ụfọdụ. [g97 11/8 p. 27 para. 2]
8. Na 1530, William Tyndale bụ onye mbụ ji aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe n’otu nsụgharị Bekee nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. [w97 9/15 p. 28 para. 3]
9. Taa, obodo mgbaba ihe atụ ahụ bụ ndokwa Chineke maka ichebe anyị pụọ n’ọnwụ n’ihi ịda iwu ya banyere ịdị nsọ nke ọbara. (Ọnụ Ọgụ. 35:11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 11/15 p. 17 para. 8.]
10. Deuterọnọmi bụ nkọwa nke ihe ụfọdụ dị n’Iwu ahụ, o nwekwara ịdọ aka ná ntị megide ofufe ụgha nakwa agbamume nye ndị Chineke ikwesị ntụkwasị obi n’ozi ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84 8/15 p. 27 para. 2.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Gịnị ka ógbè achịcha abụọ ahụ koro eko nke onyeisi nchụàjà na-achụ n’àjà n’oge Ememe Pentikọst na-ese onyinyo ya? (Lev. 23:15-17) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 3/1 p. 13 para. 21.]
12. Olee mgbe Jubile ndị Kraịst malitere, ụdị nnwere onwe dịkwa aṅaa ka o wetara n’oge ahụ? (Lev. 25:10) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 5/15 p. 24 para. 14.]
13. Ihe ndekọ dị n’akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ na-emesi ihe atọ dị aṅaa ike? [w84-IB 4/15 p. 28 para. 1]
14. N’ụzọ dị aṅaa ka Mosis si bụrụ ezi ihe nlereanya n’igosi na o nweghị mmụọ nke ekworo? (Ọnụ Ọgụ. 11:29) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 9/15 p. 18 para. 11.]
15. Olee otú ihe banyere Kora, Detan, na Abaịram si egosi na ihụ ihe anya adịghị edugacha n’ikwere n’ihe? [w97 3/15 p. 4 para. 2]
16. Akụkụ abụọ dị aṅaa nke ịsọpụrụ ndị nne na nna meworo agadi ka e mere ka ha pụta ìhè na Matiu 15:3-6 nakwa na 1 Timoti 5:4? [fy p. 173-175 para. 2-5]
17. Ihe mmụta dị aṅaa dị mkpa ka e mere ka ọ pụta ìhè n’Ọnụ Ọgụgụ 26:64, 65? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee g95 8/8 p. 10-11 para. 5-8.]
18. Olee otú ihe nlereanya Fineas si enyere anyị aka ịghọta ihe mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova pụtara? (Ọnụ Ọgụ. 25:11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95-IB 3/1 p. 16 para. 12-13.]
19. Olee otú onye nọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ pụrụ isi ‘si n’ókèala’ obodo mgbaba ahụ pụọ? (Ọnụ Ọgụ. 35:26) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 11/15 p. 20 para. 20.]
20. N’ụzọ dị aṅaa ka Codex Sinaiticus si bụrụ ngọzi nye nsụgharị Bible? [w97 10/15 p. 11 para. 2]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Jehova ekwerewo ka ihe ọjọọ dịrị iji guzobe ruo mgbe nile eziokwu gbara ọkpụrụkpụ nke na nanị ya bụ _________________________ nakwa na _________________________ nye iwu ya dị mkpa maka udo na obi ụtọ na-aga n’ihu nke ihe nile o kere eke. (Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 3:5, 6; Ekli. 8:9) [w97 2/15 p. 5 para. 4]
22. Akwụkwọ Levitikọs na-eme ka eziokwu bụ́ na Chineke anyị chọrọ _________________________ n’aka _________________________ ya rapara n’uche anyị. [w84 2/15 p. 30 para. 9]
23. N’ikwekọ n’Abụ Ọma 144:15b, ezi obi ụtọ bụ ọnọdụ nke obi, nke dabeere n’ezi _________________________ na iso Jehova nwee _________________________ dị mma. [w97 3/15 p. 23 para. 7]
24. A bịara mara Bible sitere ná nsụgharị Bible Hibru gaa na Grik ọha na-asụ, bụ́ nke a sụgharịsịrị n’ihe dị ka 150 T.O.A., dị ka _________________________ ; a bịara mara nsụgharị Bible nke Jerome mere gaa na Latin dị ka _________________________, _________________________, bụ́ nke e mesịrị n’ihe dị ka n’afọ 400 O.A. [w97 8/15 p. 9 para. 1; p. 10 para. 4]
25. Site n’ịkpọtụ uche n’ihe ndekọ banyere Belam na Kora dị ka e dekọrọ ha n’akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ, Jud dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha nọrọ na nche megide ọnyà nke _________________________ na _________________________. [w84 4/15 p. 29 para. 2, 4]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Otu ugboro n’afọ, (n’Ememe Ụlọ Ntu; n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie; n’Ememe Ngabiga), mba Israel dum, gụnyere ndị ọbịa bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe, aghaghị (ịkwụsị ọrụ nile; ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri; inye onyinye mkpụrụ mbụ) ma buo ọnụ. (Lev. 16:29-31) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 7/1 p. 10 para. 12.]
27. Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ nke Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ bụ imepụta nsụgharị bụ́ nke (nkịtị ruo n’ókè o kwere omume; na-akọwa asụsụ ndị mbụ; kwekọrọ n’otu nghọta nkwenkwe) ka onye na-agụ ya wee nwee ike inwetakwu ọdịdị nke asụsụ ndị mbụ na usoro dị iche iche nke njikọ echiche. [w97 10/15 p. 11 para. 5]
28. Dị ka Ndị Hibru 13:19 si kwuo, ekpere ndị kwere ekwe ibe anyị na-ekpe n’esepụghị aka pụrụ inwe mmetụta (n’ihe Chineke kwere ka ọ dịrị; na mgbe Chineke ga-eme ihe; n’ụzọ Chineke ga-esi gbanwegharịa ihe). [w97 4/15 p. 6 para. 1]
29. A chọrọ ‘eriri mma ogho anụnụ n’ọnụ ọnụ nke ụsọ uwe’ ụmụ Israel dị ka (ihe ịchọ mma dị nsọ; ihe àmà nke obi umeala; ihe ha na-ahụ anya na-echetara ha ka ha dị iche pụọ n’ụwa dị ka ndị Jehova). (Ọnụ Ọgụ. 15:38, 39) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84 4/15 p. 20 para. 16.]
30. Akwụkwọ Deuterọnọmi kwuru banyere ihe mere n’ime (ọnwa abụọ; otu afọ; afọ abụọ), e desịkwara ya na (1513; 1473; 1467) T.O.A. [w84 8/15 p. 27 para. 2]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ọnụ Ọgụ. 16:41, 49; Mat. 19:9; Luk 2:36-38; Kọl. 3:5; 3:14
31. Ndị ohu Chineke lụrụ di ma ọ bụ nwụnye aghaghị izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ́ ndị pụrụ ime ka e nwee ọchịchọ ndị na-adịghị ọcha na ndị na-ekwekọghị n’okike. [fy p. 158 para. 13]
32. Ịkwa iko bụ nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ kwadoro maka ịgba alụkwaghịm, na-enye ohere maka nlụgharị. [fy p. 158-159 para. 15]
33. Ịrụsi ọrụ ọchịchị Chineke ike, ọbụna mgbe mmadụ meworo agadi, pụrụ inyere mmadụ aka idi ọnwụ nke onye òtù ọlụlụ ya. [fy p. 170-171 para. 21]
34. Ịkatọ ụzọ Jehova si ekpe ikpe site n’aka ndị ohu ya ọ họpụtara pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị njọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 6/15 p. 21 para. 13.]
35. Ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị na-ekekọ di na nwunye ma na-eme ka ha chọọ ime ihe kasị mma maka ibe ha na maka ụmụ ha. [fy p. 187 para. 11]