Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ bụrụ na onye Kraịst na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-eme njem, n’ihi ya kwa o nweghị ike ịnọ ya n’oge ememe Ncheta, o kwesịrị ime ya otu ọnwa mgbe nke a gasịrị?
N’Israel oge ochie a na-eme Ememe Ngabiga kwa afọ n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa nke mbụ, nke a na-akpọ Nisan (ma ọ bụ, Abib). Anyị na-ahụ ndokwa pụrụ iche n’Ọnụ Ọgụgụ 9:10, 11: “Gwa ụmụ Israel okwu, sị, Nwoke ọ bụla n’etiti unu ma ọ bụ n’etiti ọgbọ unu nile, mgbe ọ ga-arụ arụ site na mmadụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụ mgbe ọ nọ n’ije dị anya, ọ ga-emekwara Jehova ememe ngabiga: n’ọnwa nke abụọ [nke a na-akpọ Iyyar, ma ọ bụ Ziv] n’ụbọchị nke iri na-anọ n’etiti ehihie na anyasị ka ha ga-eme ya; tinyere achịcha ekoghị eko na ihe dị iche iche na-elu ilu ka ha ga-eri ya.”
Rịba ama na nke a eguzobeghị ụbọchị abụọ dị iche nke a pụrụ ịhọrọ otu n’ime ha maka Ememe Ngabiga ahụ (Nisan 14 ma ọ bụ Ziv 14), nke onye Israel ọ bụla ma ọ bụ ezinụlọ nweere onwe ya ịhọrọ, na-adabere na nke kaara ya mfe. Ndokwa nke nri Ememe Ngabiga n’ọnwa nke abụọ bụ nke a kpaara ókè. Ọ bụ ọnọdụ pụrụ iche maka onye Israel nọ n’ọnọdụ adịghị ọcha na Nisan 14 ma ọ bụ nọ n’ebe dị oké anya site n’ebe a na-anọ eme ememe ahụ n’oge nile.
Nanị ihe ndekọ e nwere nke oge e jiri nke a mee ihe n’ụzọ sara mbara bụ n’oge ahụ mgbe Eze Hezekaịa ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tụteghachiri ime Ememe Achịcha Ekoghị Eko. E nweghị oge iji jikere maka ọnwa nke mbụ (ndị nchụàjà adịghị njikere, ndị mmadụ agbakọtaghịkwa), n’ihi ya e mere ya n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa nke abụọ.—2 Ihe Emere 29:17; 30:1-5.
E wepụkwa n’ọnọdụ dị otú ahụ pụrụ iche, ndị Juu mere Ememe Ngabiga ahụ n’ụbọchị ahụ Chineke tụpụtara. (Ọpụpụ 12:17-20, 41, 42; Levitikọs 23:5) Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya mere ememe ahụ dị ka Iwu ahụ chọrọ n’aka ha, n’ewereghị ụbọchị ahụ dị ka nke na-abachaghị n’ihe. Luk na-akọ, sị: “Ụbọchị achịcha ekoghị eko bịara, nke a na-aghaghị ịchụ àjà ngabiga. [Jisọs] wee zipụ Pita na Jọn, sị, Gaanụ, doziere anyị oriri ngabiga, ka anyị wee rie.”—Luk 22:7, 8.
N’oge ahụ Jisọs guzobere ememe kwa afọ nke ndị Kraịst maara dị ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. A pụghị ikwubiga okwu oké banyere uru ọ bara ndị Kraịst ịbịa ya. Nke a bụ ihe omume nke kasị mkpa n’afọ nye Ndịàmà Jehova. Okwu Jisọs na-egosi ihe mere nke a; ọ sịrị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Otú a, onye ọ bụla n’ime Ndịàmà Jehova kwesịrị ime atụmatụ ọtụtụ ọnwa n’ihu iji hụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ e yiri a ga-eme n’ụbọchị ememe ahụ. A ga-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyi na Tuesday, April 6, 1993, mgbe anyanwụ dasịrị n’ógbè dị iche iche.
N’ọnọdụ ụfọdụ a na-adịghị ahụkebe ọnọdụ ụfọdụ a na-atụghị anya ya, dị ka nsogbu nke ọrịa ma ọ bụ ime njem, pụrụ igbochi onye Kraịst ije dị ka o mere atụmatụ ime. Gịnị ka a pụrụ ime n’ọnọdụ dị otú ahụ?
N’oge ememe ahụ a na-ebugharị achịcha ekoghị eko na mmanya na-acha uhie uhie, ndị ahụ e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ ma họrọ maka ndụ n’ime eluigwe na-eri ma ṅụọ site na ha. (Matiu 26:26-29; Luk 22:28-30) Ọ bụrụ na onye na-eri ma na-aṅụ kwa afọ abụrụ onye dina n’àkwà ọrịa n’ụlọ ma ọ bụ n’ụlọ ọgwụ n’afọ a, ndị okenye nke ọgbakọ ebe ahụ ga-eme ndokwa otu onye n’ime ha iwegara onye ahụ na-arịa ọrịa ụfọdụ n’ime achịcha na mmanya ahụ, ikwu okwu n’akụkụ Bible kwesịrị ekwesị n’isiokwu ahụ, nakwa inye ihe nnọchianya ndị ahụ. Ọ bụrụ na onye Kraịst e tere mmanụ nọ n’ebe na-abụghị ọgbakọ ụlọ ya, o kwesịrị ime ndokwa ije n’ọgbakọ dị n’ebe ọ ga-anọ n’ụbọchị ahụ.
N’ihi nke a, ọ ga-abụ nanị n’okpuru n’ọnọdụ pụrụ nnọọ iche ka onye Kraịst e tere mmanụ ga-eme ememe Nrị Anyasị nke Onyenwe Anyị 30 ụbọchị mgbe e mesịrị (otu ọnwa), n’ikwekọ n’iwu ahụ dị n’Ọnụ Ọgụgụ 9:10, 11 na ihe nlereanya ahụ dị na 2 Ihe Emere 30:1-3, 15.
Ndị ahụ so n’òtù “atụrụ ọzọ” nke Jisọs, ndị nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala, abụghị ndị e nyere iwu iri achịcha na ịṅụ mmanya ahụ. (Jọn 10:16) Ọ dị mkpa ije ememe ahụ a na-eme kwa afọ, ma ha adịghị ekere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ. Ya mere ọ bụrụ na otu onye n’ime ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-eme njem, otú a ghara ịnọ n’ọgbakọ ọ bụla n’uhuruchi ahụ, ọ pụrụ ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ kwesịrị ekwesị n’onwe ya (tinyere ihe ndekọ nke Jisọs iguzobe ememe ahụ) ma kpee ekpere maka ngọzi nke Jehova ịdịkwasị ihe omume ahụ gburugburu ụwa. Ma n’ọnọdụ nke a ọ dịghị mkpa ime ndokwa ọzọ maka nzukọ ma ọ bụ okwu Bible pụrụ iche otu ọnwa mgbe nke a gasịrị.