Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 2/1 p. 30
  • Ụtaba Na Ndị Ụkọchukwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụtaba Na Ndị Ụkọchukwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Na-ewute Chineke na M Na-aṅụ Sịga?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụtaba Na-enweghị Anwụrụ—Ọ́ Dịghị Emerụ Ahụ?
    Teta!—1996
  • Ụlọ Ọrụ Ndị Na-emepụta Ụtaba Adaba n’Ọnọdụ Jọgburu Onwe Ya
    Teta!—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 2/1 p. 30

Ụtaba Na Ndị Ụkọchukwu

IHE karịrị 115 afọ gara aga, onye dọkịta ahụ ike bụ́ John Cowan dere otu akwụkwọ a kpọrọ The Use of Tobacco vs. Purity, Chastity and Sound Health. N’ihi ihe a mụtaworo banyere mmetụta ndị na-emerụ ahụ nke ụtaba n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ihe ndị ọ chọpụtara n’ojiji ndị ụkọchukwu ji ya eme ihe bụ ịhụ ihe dị n’ọdịnihu, ha dịkwa mkpa maka onye ọ bụla na-achọ ijere Chineke ozi taa. N’isiakwụkwọ nke 4, nke na-ekwu banyere mmetụta iji ụtaba eme ihe na-enwe n’omume, Dr. Cowan kwuru, sị:

“Ọ bụrụ na iji ụtaba eme ihe dị njọ n’ụzọ anụ ahụ​—⁠dị ka e gosiworo n’ụzọ doro anya​—⁠ọ ghaghị n’ụzọ dị mkpa ịdị njọ n’ụzọ omume; n’ihi na ọ bụ iwu nke metụtara ihe dị n’ahụ na ‘ihe ọ bụla na-emerụ emerụ ma ọ bụ na-enye ahụ nsogbu, si otú a na-emebi usoro nzirita ozi nke ahụ, wee si ná nke a na-emebi ụbụrụ, otú a kwa na-emebi uche.’ Ụzọ mmadụ si eji anụ ahụ ya eme ihe ma ọ bụ na-emetọ ya na-emetụta uche nke mmadụ​—⁠echiche ya, okwu ya, omume ya. Ụtaba, n’aha ya kpọmkwem na n’ihe ndị o metụtara, ruru unyi, ma​—⁠e wepụkwa ahụ ọ na-emerụ​—⁠olee otú echiche na omume dị ọcha, na-enweghị ntụpọ, ziri ezi, pụrụ isi malite ma ọ bụ wulite n’ime uche ahụ. Ka e cheedị n’echiche​—⁠ma ọ bụrụ na a pụrụ iche ihe dị otú ahụ n’echiche​—⁠na Kraịst, mgbe ọ na-ebi ndụ ihe atụ Ya n’elu ala​—⁠na-akụzi ma na-ekwusa ịnọ n’enweghị ntụpọ, ịdị ọcha, ịhụnanya na ime ebere​—⁠sere siga, kpọrọ ụtaba, taakwa ya ataa. Echiche dị otú ahụ ò yighị ihe na-emerụ ihe dị nsọ? Ma n’agbanyeghị nke ahụ ndị na-eje ozi​—⁠ndị na-eso ụzọ, ndị na-eme nkwusa, ndị na-akọwa iwu Ya na ozizi ya dị iche iche​—⁠na-eji ahịhịa ahụ ruru unyi nke bụ nsí na-emerụ ahụ ha, na-emekwa ka mkpụrụ obi ha nwee ntụpọ. Mmadụ ndị dị otú ahụ, ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ha, hà pụrụ ịdị ndụ yiri nke Kraịst​—⁠ndụ omume ọma dị elu? Echeghị m.

“Ọ bụrụ na ị pụrụ, nwaa iche echiche banyere onye na-eji anya ukwu eri ihe, onye ịṅụ mmanya riri ahụ, ma ọ bụ onye na-ese ụtaba, ọ̀ bụ n’ihe banyere ịdị nsọ nke obi? E nwere ihe na-ekwekọghị ekwekọ dị ka ọ dị n’okike, ihe na-adịghị mma n’anya, ihe na-asọ oyi n’ime ka ihe ndị a kwekọọ. Dị ka a na-emerụ agụụ nke anụ ahụ na akụkụ ndị dị n’elu ahụ e ji enwe mmetụta, otú a mmadụ nke ime, ọnọdụ omume ọma, na-abụkwa nke e merụrụ. Mmụọ ahụ nke dị ọcha agaghị, ọ pụghị ibi n’ime ahụ nke ruru unyi. E nwere nkwekọ dị n’okike nke dị n’etiti ihe anụ ahụ na nke ime mmụọ, nke na ọdịdị nke otu na-egosi ihe ga-abụ àgwà nke ọzọ. Onye profesọ nke okpukpe na ohu nke ụtaba . . . Ọ pụrụ iji eziokwu na izi ezi nile nke obi kweta na iji ụtaba eme ihe bụ omume na-emerụ ahụ, dịrịkwa njọ n’ụzọ omume; n’agbanyeghị nke ahụ ọ pụrụ inwe mmetụta na-akwali akwali n’ime onwe ya, bụ́ iwu nke ihe dị ya n’ahụ, nke mmadụ mepụtara n’onwe ya, nke na-eji agụụ ya a na-adịghị egbo egbo akpali ya ịnọgide n’omume ahụ, iwu nke a kwa nke mmadụ mere pụrụ isi ike karịa echiche na akọ na uche e kenyere ya n’ime, ma e jikọta ha. Iji ụtaba eme ihe ọ̀ bụghị mmebi doro anya nke otu n’ime iwu dị iche iche nke Chineke nke a kụnyere n’ime ahụ anyị nke dị ndụ? Mmebi nke otu n’ime iwu dị iche iche nke Chineke ọ̀ bụghị njehie na mmehie? Ọ bụrụkwa na ọ bụ àgwà riri mmadụ ahụ ịdị ndụ ná mmebi nke otu n’ime iwu dị iche iche nke Chineke, ngafere baa ná mmebi nke iwu ndị ọzọ ọ̀ gaghị adi mfe ma gaa were were? N’ikpeazụkwa, olee otú a pụrụ isi lee mmadụ ọ bụla anya dị ka onye nkụzi nke omume ọma, onye, n’àgwà nke onwe ya, na-atụrụ ihe e kere eke ibe ya aro ibi ndụ nke ịnọgide na-ejehie njehie megide iwu dị iche iche nke ịdị adị ya?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya