Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị ndị ozi ahụ, ọ bụghịkwa ndị ọzọ na-eso ụzọ, bụ́ ndị a ga-ewebata n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ka Jisọs so guzobe Ememe Ncheta ahụ?
O yiri ka ajụjụ nke a ọ̀ dabeere n’echiche ahụ hiere ụzọ nke bụ na Jisọs sooro ndị ozi ya zukọọ ná mgbede ahụ maka iguzobe Nri Anyasị Onyenwe anyị ya na ọgbakọ ndị Kraịst ahụ nke ndị e tere mmanụ, ndị nọworị anọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Kama nke ahụ, na Nisan 14, 33 O.A., a kaguzobeghị ọgbakọ ndị Kraịst ahụ, Jisọs sokwara ndị ozi ya zukọọ maka oriri Ngabiga ahụ ndị Juu na-eme kwa afọ.
N’eziokwu, Jisọs nwere ndị na-eso ụzọ karịrị 12 ahụ a maara dị ka ndị ozi. N’afọ bu ụzọ tupu ọnwụ ya, o zipụrụ 70 ndị na-eso ụzọ na njem nkwusa ozi ọma. Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, “o mere ka ndị karịrị [narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna anyị hụ ya anya n’otu mgbe.” E nwekwara ihe dị ka ‘otu narị na iri abụọ’ ndị na-eso ụzọ, bụ́ ndị zukọtara n’ụbọchị Pentikọst. (1 Ndị Kọrint 15:6; Ọrụ 1:15, 16, 23; Luk 10:1-24) Ma, ka anyị tụlee ìgwè ndị ahụ ha na Jisọs nọ mgbe o guzobere ememe ahụ a na-eme kwa afọ nke a maara dị ka Nri Anyasị Onyenwe Anyị.
Luk 22:7, 8 na-eme ka anyị mara oge o mere, na-asị: “Ma ụbọchị achịcha ekoghị eko bịara, nke a na-aghaghị ịchụ àjà ngabiga. O wee zipụ Pita na Jọn, sị, Gaanụ, doziere anyị oriri ngabiga, ka anyị wee rie.” Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu ikwu, sị: “Unu ga-asịkwa nna nwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sị gị, Olee ebe ụlọ ọbịa dị, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri ngabiga?” Ya mere, n’uhuruchi ahụ, Jisọs na mmadụ 12 ahụ nọ maka ememe ndị Juu na-eme. Ọ gwara ha, sị: “Agụụ gụsiri m ike iso unu rie oriri ngabiga nke a mgbe mụ akahụghị ahụhụ.”—Luk 22:11, 15.
Site ná mmalite ya n’Ijipt, Ememe Ngabiga ahụ bụ ememe ezinụlọ. Mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ngabiga ahụ, Chineke gwara Mosis na ezinụlọ nke ọ bụla gaje igbu otu atụrụ. Ọ bụrụ na ezinụlọ ahụ dị nta nke ukwuu nke na ọ gaghị erichali atụrụ ahụ dum, a pụrụ ịkpọ ezinụlọ ndị agbata obi ka ha bịa kere òkè ná nri ahụ. Otú a, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na maka Ememe Ngabiga nke afọ 33 O.A., ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-eso ezinụlọ nke aka ha zukọọ maka nri nke a dị ka ha na-emebu.
Ma ‘agụụ gụsiri Jisọs ike’ iso ndị na-eso ụzọ ya ndị dị ya nso karịsịa, ndị ya na ha soworo gakọọ njem n’akụkụ dị ukwuu nke ije ozi ya, kere òkè n’Ememe Ngabiga nke ikpeazụ a dị irè, bụ́kwa anyasị ikpeazụ tupu ọnwụ ya. Mgbe e risiri nri Ememe Ngabiga ahụ, Jisọs gwara ha banyere ememe ọhụrụ nke ndị nile na-eso ụzọ ya ga na-eme n’ọdịnihu. Mmanya nke ihe ahụ nke ka gaje ịbụ ememe ndị Kraịst n’ọdịnihu ga-anọchi anya ọbara nke “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ nke gaje ịnọchi anya ọgbụgba ndụ Iwu ahụ.—Luk 22:20.
Otú ọ dị, n’anyasị nke Nisan 14, 33 O.A., ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ amalitebeghị ịdị irè, n’ihi na a chụbeghị àjà nke a ga-eji mee ka ọ dịrị irè—bụ́ Jisọs. Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ka dị irè. A kpọgidebeghị ya n’elu osisi. Ọzọkwa, ọ gajeghị ipụta ìhè na ọgbụgba ndụ ochie ahụ nke e sooro Israel anụ ahụ banye na ya abụwo nke e ji ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke e sooro Israel ime mmụọ banye na ya wee dochie anya ya ruokwa ụbọchị Pentikọst.—Ndị Galetia 6:16; Ndị Kọlọsi 2:14.
Ya mere, ma ndị ozi 11 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ma onye ọ bụla ọzọ n’ime ndị ọzọ ahụ na-eso ụzọ adịbeghị nke banyere n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’anyasị ahụ. Jisọs adịghịkwa egosi na ya akwadoghị ndị ọzọ ahụ na-eso ụzọ bụ ndị Juu site n’ikwe ka ha soro ndị ezinụlọ ha zukọọ maka ime Ememe Ngabiga ahụ.