Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Septemba p. 19
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jizọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya Iri Asaa Ka Ha Gaa Kwusaa Ozi Ọma
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịṅa Ntị n’Okwu Nọdụ Mma nke Jisọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Septemba p. 19
Ebe Jizọs na-amalite Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ya na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, olee ebe ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ahụ o zipụburu ka ha gaa kwusaa ozi ọma nọ? Hà ahapụla ya?

Anyị ekwesịghị iche na ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs iri asaa ahụ anọghị ya mgbe ọ malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, na ihe ha amasịghị Jizọs ma ọ bụkwanụ na ha hapụrụ ya. Ihe Jizọs chọrọ bụ ka ya na ndịozi ya nọrọ n’oge ahụ.

Ihe ndịozi iri na abụọ na ndị na-eso ụzọ iri asaa ahụ masịchara Jizọs. O bula ụzọ si n’ime ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya họrọ mmadụ iri na abụọ ọ kpọrọ ndịozi ya. (Luk 6:12-16) Ọ nọ na Galili mgbe ‘ọ kpọkọtara ndịozi ya iri na abụọ’ ma ‘zipụ ha ka ha gaa kwusaa gbasara Alaeze Chineke ma gwọọ ọrịa.’ (Luk 9:1-6) Mgbe Jizọs mechara gbadata na Judia, ọ “họpụtakwuru mmadụ iri asaa ma zipụ ha abụọ abụọ.” (Luk 9:51; 10:1) N’ihi ya, Jizọs nwere ndị na-eso ụzọ ya na-ekwusa gbasara ya n’ebe dị iche iche.

Ndị Juu ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ga na-eme Ememme Ngabiga a na-eme kwa afọ. O nwere ike ịbụ ha na ndị ezinụlọ ha ga na-eme ya. (Ọpụ. 12:6-11, 17-20) Mgbe oge ọnwụ Jizọs na-eru nso, ya na ndịozi ya gara Jeruselem. Mana, ọ kpọghị ndị na-eso ụzọ ya niile ka ha si Judia, Galili, nakwa Peria bịa ka ha na ya mee Ememme Ngabiga. O doro anya na Jizọs chọrọ ka ya na ndịozi ya nọrọ n’oge ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Ọ gụsiri m agụụ ike iso unu rie nri Ememme Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.”​—Luk 22:15.

E nwere ezigbo ihe mere Jizọs ji mee otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-anwụ ebe ọ bụ ya bụ “Nwa Atụrụ Chineke onye na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Ebe ọ ga-anọ nwụọ bụ na Jeruselem, ebe a na-anọ achụrụ Chineke àjà kemgbe. Nwa atụrụ e ji eme Ememme Ngabiga na-echetara ndị Izrel na Jehova napụtara ha n’Ijipt. Mana àjà Jizọs ga-achụ ga-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ niile nwere onwe ha ná mmehie na ọnwụ. (1 Kọr. 5:7, 8) Àjà a Jizọs chụrụ mere ka ndịozi ya iri na abụọ ghọọ ndị e ji tọọ ntọala ọgbakọ Ndị Kraịst. (Efe. 2:20-22) Ọ dịkwa mma ịmara na obodo nsọ ahụ bụ́ Jeruselem nwere “nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. E dekwara aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ n’elu nkume ndị ahụ.” (Mkpu. 21:10-14) N’eziokwu, e nwere ọrụ dị ezigbo mkpa ndịozi ndị ahụ ga-arụ n’imezu nzube Chineke. N’ihi ya, o doro anya na Jizọs chọrọ ka ya na ha nọrọ n’oge ọ ga-eme Ememme Ngabiga ikpeazụ ya nakwa ihe ọzọ ọ ga-eme ozugbo o mechara ya, ya bụ, Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs iri asaa ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ esoghị ya rie Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ma, Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ahụ ọ malitere ga-abara ndị na-eso ụzọ ya niile kwesịrị ntụkwasị obi uru. Onye ọ bụla n’ime ha nke mechara ghọọ Onye Kraịst e tere mmanụ ga-eso n’ọgbụgba ndụ nke Alaeze nke Jizọs Kraịst gwara ndịozi ya gbasara ya n’abalị ahụ.​—Luk 22:29, 30.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya