ISI NKE IRI NA ISE
Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Anyị Meworo Agadi
1. Ụgwọ dịgasị aṅaa ka anyị ji nne na nna anyị, n’ihi ya kwa olee otú anyị kwesịrị isi lee ha anya ma mesoo ha?
“GEE nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi,” ka onye amamihe nke ogologo oge gara aga dụrụ n’ọdụ. (Ilu 23:22) ‘M gaghị eme nke ahụ ma ọlị!’ ka ị pụrụ ikwu. Kama ileda ndị nne anyị anya—ma ọ bụ ndị nna anyị—ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-enwe ịhụnanya miri emi maka ha. Anyị na-aghọta na anyị ji ha ụgwọ dị ukwuu. Na nke mbụ ya, nne na nna anyị nyere anyị ndụ. Ọ bụ ezie na Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ, anyị agaraghị nnọọ adị adị ma ọ bụghị nne na nna anyị. Ọ dịghị ihe anyị pụrụ inye ndị nne na nna anyị dị oké ọnụ ahịa karịa ndụ n’onwe ya. Mgbe ahụ, cheedị nnọọ banyere ịchụ onwe onye n’àjà, oké nchekasị, mmefu, na nlebara anya ịhụnanya nke inyere nwata aka site na nwa ọhụrụ gaa n’okenye gụnyere. Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe ezi uche dị na ya na Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa”!—Ndị Efesọs 6:2, 3.
ỊMATA MKPA NDỊ NKE MMETỤTA UCHE
2. Olee otú ụmụ toworo eto pụrụ isi ‘na-enyeghachi’ ndị mụrụ ha ihe?
2 Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Ka [ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ] buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.” (1 Timoti 5:4) Ụmụ toworo eto ‘na-enyeghachi ihe’ nke a site n’igosi ekele maka ọtụtụ afọ nke ịhụnanya, ọrụ, na nlekọta nne na nna ha na nne na nna ochie ha tinyere n’ebe ha nọ. Otu ụzọ ụmụaka pụrụ isi mee nke a bụ site n’ịmata na dị ka onye ọ bụla ọzọ, ndị agadi nwere mkpa ịhụnanya na mmesi obi ike—ọtụtụ mgbe ọ na-agụgbu ha agụgbu. Dị ka anyị nile, ọ dị ha mkpa inwe mmetụta nke ịbụ ndị e ji kpọrọ ihe. Ọ dị ha mkpa inwe mmetụta nke na ndụ ha bara uru.
3. Olee otú anyị pụrụ isi sọpụrụ ndị nne na nna na ndị nne na nna ochie?
3 Ya mere anyị pụrụ ịsọpụrụ nne na nna anyị na nne na nna ochie anyị site n’ime ka ha mara na anyị hụrụ ha n’anya. (1 Ndị Kọrint 16:14) Ọ bụrụ na anyị na ndị mụrụ anyị ebighị, anyị kwesịrị icheta na ha ịnata ozi site n’aka anyị pụrụ ịbụrụ ha oké ihe. Akwụkwọ ozi na-enye obi ụtọ, òkù fon, ma ọ bụ nleta pụrụ itinye ihe dị ukwuu n’ọṅụ ha. Miyo, onye bi na Japan, dere mgbe ọ gbara 82 afọ, sị: “Nwa m nwanyị [nke di ya bụ onye ozi na-ejegharị ejegharị] na-agwa m: ‘Mama, biko soro anyị “mee njem.”’ Ọ na-ezitere m ndepụta usoro njegharị na nọmba telifon ha kwa izu. Apụrụ m ịsaghe map m ma sị: ‘Ehee. Ugbu a ha nọ ebe a!’ Ana m ekele Jehova mgbe nile maka ngọzi nke inwe nwa dị otú a.”
INYE AKA NÁ MKPA IHE ONWUNWE
4. Olee otú ọdịnala okpukpe ndị Juu si gbaa ume inwe afọ ịta mmiri n’ebe nne na nna meworo agadi nọ?
4 Mmadụ ịsọpụrụ nne na nna ya ọ̀ pụrụ ịgụnyekwa ilekọta mkpa ihe onwunwe ha? Ee. Ọ na-agụnyekarị ya. N’ụbọchị Jisọs ndị ndú okpukpe ndị Juu kwadoro ọdịnala nke na ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na ego ma ọ bụ ihe onwunwe ya bụ “ihe e nyere Chineke,” o nweere onwe ya pụọ n’ibu ọrụ nke iji ya lekọta ndị mụrụ ya. (Matiu 15:3-6) Lee aha afọ ịta mmiri nke ahụ bụ! Ya bụ na ndị ndú okpukpe ahụ na-agba ndị ahụ ume ịhapụ ịsọpụrụ nne na nna ha kama na-emeso ha n’ụzọ nlelị site n’iji ọchịchọ onwe onye nanị na-ahapụ igbo mkpa ha. Ọ dịghị ihe ga-eme ka anyị chọọ ime nke ahụ!—Deuterọnọmi 27:16.
5. N’agbanyeghị ndokwa ndị gọọmenti mere n’ala ụfọdụ, n’ihi gịnị ka mmadụ ịsọpụrụ nne na nna ya ji agụnye enyemaka ego mgbe ụfọdụ?
5 N’ọtụtụ ala taa, usoro ihe omume enyemaka gọọmenti na-akwado na-ahụ maka ụfọdụ n’ime mkpa ihe onwunwe nke ndị agadi, dị ka nri, uwe, na ebe obibi. Tụkwasị na nke ahụ, ndị agadi n’onwe ha pụrụ inwewo ike ime ndokwa ụfọdụ maka oge agadi ha. Ma ọ bụrụ na ndokwa ndị a agwụsịa ma ọ bụ ghara izu ezu, ụmụ na-asọpụrụ nne na nna ha site n’ime ihe ha pụrụ ime iji gboo mkpa ndị nne na nna. N’ezie, ilekọta ndị nne na nna meworo agadi bụ ihe àmà nke nsọpụrụ Chineke, ya bụ, ofufe mmadụ na-enye Jehova Chineke, Onye Mmalite nke ndokwa ezinụlọ.
ỊHỤNANYA NA IJI ONWE ONYE ACHỤ ÀJÀ
6. Ndokwa ibi obi dịgasị aṅaa ka ụfọdụ meworo iji gboo mkpa ndị mụrụ ha?
6 Ọtụtụ ụmụ toworo eto ejiwo ịhụnanya na iji onwe onye achụ àjà zaghachi ná mkpa dị iche iche nke nne na nna ha ahụ na-adịkwaghị ike. Ụfọdụ akpọbatawo nne na nna ha n’ụlọ ha ma ọ bụ kwaga nso ebe ha bi. Ndị ọzọ ebinyeworo nne na nna ha. Mgbe mgbe, ndokwa dịgasị otú ahụ aghọwo ngọzi nye ma nne na nna ma ụmụaka.
7. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị mma ime ihe ọkụ ọkụ n’ime mkpebi banyere nne na nna meworo agadi?
7 Ma, mgbe ụfọdụ, nkwagharị dị otú ahụ adịghị aga nke ọma. N’ihi gịnị? Ikekwe n’ihi na e mere mkpebi oké ọkụ ọkụ ma ọ bụ dabere nanị ná mmetụta uche. “Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya,” ka Bible ji amamihe dọọ aka ná ntị ya. (Ilu 14:15) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nne gị bụ́ agadi na-enwe ihe isi ike ibi nanị ya, i wee chee na ya ịkwabatakwuru gị pụrụ ịbara ya uru. N’iji amamihe ghọta ijeụkwụ gị, ị pụrụ ịtụle ihe na-esonụ: Gịnị bụ mkpa ya n’ezie? È nwere usoro ozi nkwado onwe onye ma ọ bụ nke ndị gọọmenti bụ́ ndị na-enye ihe ngwọta ọzọ a pụrụ ịnakwere? Ọ̀ chọrọ ịkwabata? Ọ bụrụ na ọ chọrọ, n’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọ ga-esi metụta ndụ ya? Ọ̀ gaje ịhapụ ndị enyi? Olee otú nke a pụrụ isi metụta ya ná mmetụta uche? Ì sorowo ya kwurịta ihe ndị a? Olee otú nkwagharị dị otú ahụ pụrụ isi metụta gị, onye ị na-alụ, ụmụ ndị nke gị? Ọ bụrụ na nne gị chọrọ nlekọta, ònye ga-enye ya? À pụrụ ike ibu ọrụ ahụ eke? Ì sorowo ndị nile okwu ahụ metụtara kpọmkwem tụlee ya?
8. Ole ndị ka ị pụrụ inwe ike iso kwurịta okwu mgbe a na-ekpebi ụzọ isi nyere nne na nna gị meworo agadi aka?
8 Ebe ibu ọrụ inye nlekọta dịịrị ụmụ nile nọ n’ezinụlọ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe inwe nnọkọ nkwurịta okwu ezinụlọ ka mmadụ nile wee kere òkè n’ime mkpebi. Ikwunyere ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst ma ọ bụ ndị enyi cheworo ọnọdụ yiri nke ahụ okwu pụkwara ịbụ ihe enyemaka. “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị,” ka Bible na-adọ aka ná ntị, “ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.”—Ilu 15:22.
NA-EGOSI ỌMỊIKO NA NGHỌTA
Ọ bụ ihe amamihe na-adịghị ya imere nne ma ọ bụ nna mkpebi n’ebughị ụzọ kwunyere onye ahụ okwu
9, 10. (a) N’agbanyeghị ha imewanye agadi, nchebara echiche dị aṅaa ka e kwesịrị ichebara ndị agadi? (b) N’agbanyeghị nzọụkwụ nwa toworo eto pụrụ iwere n’ihi nne na nna ya, gịnị ka o kwesịrị inye ha mgbe nile?
9 Ịsọpụrụ nne na nna anyị bụ́ ndị agadi na-achọ ọmịiko na nghọta. Ka afọ ndị na-agafe na-akpa ike n’ahụ ha, ọ pụrụ isiwanyere ndị agadi ike ịga ije, iri nri, na icheta ihe. Enyemaka pụrụ ịdị ha mkpa. Mgbe mgbe ụmụ na-enye nchebe ma na-anwa inye nduzi. Ma ndị agadi bụ ndị toworo eto nwere ogologo ndụ nke amamihe na ahụmahụ, ogologo ndụ nke ilekọta onwe ha na imere onwe ha mkpebi. Njimara ha na ùgwù onwe ha pụrụ ịdabere n’ọkwá ha dị ka ndị nne na nna na ndị toworo eto. Ndị nne na nna na-eche na ha aghaghị ịhapụrụ ụmụ ha nchịkwa nke ndụ ha pụrụ inwe ịda mbà n’obi ma ọ bụ iwe. Ụfọdụ na-ajụ ma na-eguzogide ihe ha pụrụ ile anya dị ka mgbalị ịnapụ ha nnwere onwe ha.
10 E nweghị ihe ngwọta ọ bụla dị mfe nye nsogbu dịgasị otú ahụ, ma ọ bụ ihe obi ọma ikwere ka nne na nna bụ́ ndị agadi lekọta onwe ha ma mee mkpebi ndị nke ha ruo n’ókè o kwere omume. Ọ bụ ihe amamihe ịghara ime mkpebi banyere ihe kasị mma nye nne na nna gị n’ebughị ụzọ kwunyere ha okwu. Ihe dị ukwuu pụrụ ifunarịwo ha. Kwe ka ha debe ihe ha ka nwere. Ị pụrụ ịchọpụta na ka ị na-etinye mgbalị ka nta n’ịchịkwa ndụ nne na nna gị, otú ahụ ka mmekọrịta gị na ha ga-aka mma. Ha ga-enwe obi ụtọ karị, otú ahụkwa ka ị ga-enwe. Ọbụna ma ọ dị mkpa isi ọnwụ n’ihe ụfọdụ maka ọdịmma ha, ịsọpụrụ nne na nna gị chọrọ ka i nye ha ùgwù na nsọpụrụ ruuru ha. Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.”—Levitikọs 19:32.
ỊNỌGIDE NA-ENWE ÀGWÀ ZIRI EZI
11-13. Ọ bụrụ na mmekọrịta n’etiti nwa toworo eto na nne na nna ya adịbughị mma n’oge gara aga, olee otú ọ pụrụ isikwarị hụ maka ihe ịma aka nke ilekọta ha n’oge ha kataworo ahụ?
11 Mgbe ụfọdụ nsogbu ụmụ toworo eto na-eche ihu n’ịsọpụrụ nne na nna ha meworo agadi gụnyere mmekọrịta ha na ndị mụrụ ha n’oge ndị gara aga. Ikekwe nna gị dị obi ọjọọ ma ghara ịdị na-ahụ n’anya, nne gị dị aka ike ma kpọọ obi nkụ. Ị ka pụrụ inwe nkụda mmụọ, iwe, ma ọ bụ obi ilu n’ihi na ha abụghị ụdị nne na nna ị chọrọ ka ha bụrụ. Ị̀ pụrụ imeri mmetụta dịgasị otú ahụ?a
12 Basse, onye tolitere na Finland, na-akọ, sị: “Nna nkuchi m abụwo onye agha SS na Nazi Germany. Ọ na-ewekarị iwe ọkụ, mgbe ahụ ọ na-adịkwa ize ndụ. O tiri nne m ihe ọtụtụ mgbe n’ihu m. Otu mgbe o wesoro m iwe, o fegharịrị belt ya ma jiri isi ígwè ya kụọ m n’ihu. Ọ kụsiri m ike nke ukwuu nke na m si n’elu àkwà daa.”
13 Ma, e nwekwararịị akụkụ ọzọ nke omume ya. Basse na-ekwukwasị: “N’aka nke ọzọ, ọ na-arụsi ọrụ ike, gharakwa ịdị na-emere onwe ya ebere n’ilekọta ezinụlọ n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ dịghị mgbe o gosiri m ịhụnanya nke nna, ma amaara m na o nwere ọnyá nke mmetụta uche. Nne ya chụpụrụ ya n’ụlọ mgbe ọ bụ obere nwa nwoke. O ji ọgụ na mgba tolite ma banye n’agha n’oge okorobịa. Apụrụ m ịghọta ya ruo ókè ụfọdụ, ataghịkwa m ya ụta. Mgbe m tolitekwuru, achọrọ m inyere ya aka ruo otú m nwere ike ruo ọnwụ ya. Ọ dịghị mfe, ma emere m ihe m pụrụ. Agbalịrị m ịbụ ezi nwa ruo ná ngwụsị, echekwara m na ọ nakweere m dị ka nke ahụ.”
14. Olee akụkụ akwụkwọ nsọ dị irè n’ọnọdụ nile, gụnyere ndị ahụ na-ebilite n’ilekọta nne na nna meworo agadi?
14 N’ọnọdụ ezinụlọ, dị ka n’okwu ndị ọzọ, ndụmọdụ Bible a na-adị irè: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.
NLEKỌTA DỊKWA NDỊ NLEKỌTA MKPA
15. N’ihi gịnị ka ilekọta nne na nna ji abụ ihe na-egbu mmụọ mgbe ụfọdụ?
15 Ilekọta nne ma ọ bụ nna ahụ na-adịkwaghị ike bụ ọrụ siri ike, na-agụnye ọtụtụ ọrụ, ọtụtụ ibu ọrụ, na ogologo hour. Ma akụkụ kasị sie ike na-abụkarị nke mmetụta uche. Ọ na-egbu mmụọ ikiri ka ahụ ike, ike ncheta, na nnwere onwe nne na nna gị na-efunarị ha. Sandy, onye si Puerto Rico, na-akọ, sị: “Nne m bụ onye na-ejikọta ezinụlọ anyị. Ọ bụ oké ihe mgbu ilekọta ya. Nke mbụ ọ malitere ite ụkwụ; o mesịa nwee mkpa iji mkpọrọ, e mesịa ihe ndị ngwụrọ ji aga ije, e mesịa oche nkwagharị. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ nọ nnọọ na-aka njọ ruo mgbe ọ nwụrụ. O butere ọrịa cancer ọkpụkpụ ma chọọ nlekọta mgbe nile—ehihie na abalị. Anyị sara ya ahụ ma nye ya nri ma gụọrọ ya ihe. O siri ike nke ukwuu—karịsịa ná mmetụta uche. Mgbe m chọpụtara na nne m na-anwụ, ebere m ákwá n’ihi na ahụrụ m ya n’anya nke ukwuu.”
16, 17. Okwu ndụmọdụ dị aṅaa pụrụ inyere onye na-enye nlekọta aka inwe nguzozi n’ihe dị iche iche?
16 Ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’ọnọdụ yiri nke ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime iji nagide ya? Ige Jehova ntị site n’ọgụgụ Bible na ikwunyere ya okwu n’ekpere ga-enyere gị aka nke ukwuu. (Ndị Filipaị 4:6, 7) N’ụzọ dị irè, hụ na ị na-eri nri na-edozi ahụ ma gbalịa ịrahụ ụra zuru ezu. Site n’ime nke a, ị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma, ma ná mmetụta uche ma n’anụ ahụ, ilekọta onye ị hụrụ n’anya. Ma eleghị anya ị pụrụ ime ndokwa maka izurutụ ike site n’usoro ihe omume kwa ụbọchị. Ọbụna ma ọ bụrụ na oge ezumike agaghị ekwe omume, ọ ka bụkwa ihe amamihe idokwa maka oge ụfọdụ maka ntụrụndụ. Iji nweta oge ntụrụndụ, ị pụrụ inwe ike idokwa ka onye ọzọ nọnyere nne ma ọ bụ nna gị ahụ na-adịghị.
17 Ka ndị toworo eto na-enye nlekọta tụọ anya ihe ezi uche na-adịghị na ha n’aka onwe ha abụghị ihe na-adịghị emekebe. Ma enwela obi amamikpe maka ihe ị na-apụghị ime. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ pụrụ ịdị gị mkpa itinye onye ị hụrụ n’anya n’aka nlekọta nke ebe a na-elekọta ndị agadi. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enye nlekọta, setịpụ atụmanya ezi uche dị na ha maka onwe gị. Ị ghaghị inwe nguzozi ná mkpa dị iche iche ọ bụghị nanị ndị nke nne na nna gị kamakwa ndị nke ụmụ gị, di ma ọ bụ nwunye gị, na ndị nke onwe gị.
ỌKỊKA NKE UME
18, 19. Nkwa nkwado dị aṅaa ka Jehova kweworo, ahụmahụ dịkwa aṅaa na-egosi na ọ na-edebe nkwa a?
18 Site n’Okwu ya, bụ́ Bible, Jehova ji ịhụnanya enye nduzi nke pụrụ inyere mmadụ aka nke ukwuu n’ilekọta nne na nna na-eme agadi, ma ọ bụghị nke ahụ nanị bụ enyemaka ọ na-enye. “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya,” ka ọbụ abụ ahụ dere n’ike mmụọ nsọ. “Ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha.” Jehova ga-azọpụta, ma ọ bụ chebe, ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike.—Abụ Ọma 145:18, 19.
19 Myrna, na Philippines, mụtara nke a mgbe ọ na-elekọta nne ya, onye ahụ mkpọnwụ mere ka ọ ghara ịbakwa uru. “Ọ dịghị ihe na-egbu mmụọ ka ịhụ onye ị hụrụ n’anya ka ọ na-ata ahụhụ, n’enweghị ike ịgwa gị ebe ọ na-afụ ya ụfụ,” ka Myrna na-ede. “Ọ dị nnọọ ka ịhụ ka mmiri na-eri ya nwayọọ nwayọọ, ọ dịghịkwa ihe m pụrụ ime. Ọtụtụ mgbe m ga-egbu ikpere m n’ala ma gwa Jehova otú ike gwụruru m. Ebere m ákwá ka Devid, onye kpọkuru Jehova ka o debe anya mmiri ya n’ime karama ma cheta ya. [Abụ Ọma 56:8] Dịkwa ka Jehova kwere ná nkwa, o nyere m ume nke m chọrọ. ‘Jehova bụụrụ m ihe ndabere.’”—Abụ Ọma 18:18.
20. Nkwa Bible dịgasị aṅaa na-enyere ndị na-enye nlekọta aka ịdị na-ele anya ihe ọma, ọbụna ma ọ bụrụ na onye ha na-elekọta anwụọ?
20 E kwuwo na ilekọta nne na nna na-eme agadi bụ “akụkọ na-enweghị ngwụsị obi ụtọ.” N’agbanyeghị mgbalị ndị kasị mma n’inye nlekọta, ndị agadi pụrụ ịnwụ, dị ka nne Myrna nwụrụ. Ma ndị tụkwasịrị Jehova obi maara na ọnwụ abụghị ngwụsị nke akụkọ ahụ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Ndị nne na nna ha meworo agadi nwụnahụworo na-enweta nkasi obi n’olileanya mbilite n’ọnwụ ya na nkwa nke ụwa ọhụrụ mara mma nke Chineke na-eke ebe “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:4.
21. Ihe ọma dịgasị aṅaa ka ịsọpụrụ nne na nna meworo agadi na-arụpụta?
21 Ndị ohu Chineke nwere nkwanye ùgwù miri emi maka nne na nna ha, ọ bụ ezie na ndị a nwere ike imewo agadi. (Ilu 23:22-24) Ha na-asọpụrụ ha. N’ime nke ahụ, ha na-enwe ahụmahụ nke ihe ilu ahụ si n’ike mmụọ nsọ na-ekwu: “Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ.” (Ilu 23:25) Nke kasịkwanụ, ndị na-asọpụrụ nne na nna ha meworo agadi na-eme Jehova Chineke obi ụtọ, na-asọpụrụkwa ya.
a Anyị adịghị atụle n’ebe a ọnọdụ ebe ikpe iji ike na ntụkwasị obi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mara nne na nna, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a pụrụ ile anya dị ka mpụ.